N'Anambra: Ndị Ọrụ ASWAMA Enweta Ụgbọala Na Akụrụngwa Ọhụrụ

Nov 21, 2019 - 04:09
Jan 24, 2021 - 05:25
 0
N'Anambra: Ndị Ọrụ ASWAMA Enweta Ụgbọala Na Akụrụngwa Ọhụrụ

Izunna Okafor, Awka

Igbo sị na ọ na-abụ onye e nyèrè mara chukwaa, ọzọ pụta, e chèta ya. Ọ bụ n'ịgbasò nke a ka gọọmenti steeti Anambra jiri zụta ma bunye ndị ụlọ ahụ na-ahụ maka mkpocha na nzàcha nakwa ọnọdụ adịmọcha n'ime steeti ahụ, bụ ụlọ ọrụ a maara dịka 'Anambra State Waste Management Agency, (ASWAMA)' ụgbọala ọhụrụ na akụrụngwa e ji arụ ọrụ, dị isii n'ọnụ ọgụgụ, iji kwàlitekwuo ma nyere ha aka n'ọrụ ha.

Mmemme ibunye ya bụ ụlọ ọrụ akụrụngwa ahụ bụ nke e mere nso-nso a, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'obi gọọmenti dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

N'okwu ya oge ọ na-enyefè ihe bdị ahụ n'aka ndị isi ụlọ ọrụ ahụ, osote aka na-achị steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkem Okeke mere ka a mara na ebumnobi gọọmenti jiri bunyekwuo ụlọ ọrụ ahụ akụrụngwa ọhụrụ ahụ bụ iji kwàlite ọrụ ha nakwa iji kwalitekwuo usoro ikpofù ahịhịa na adịmọcha na gburugburu nke steeti ahụ n'izugbe.

Ka ọ na-eto ha banyere ezi ọrụ ha na steeti ahụ, ọ nọkwàzịrị n'oge ahụ kpọkuo ma dụọ ụmụafọ steeti Anambra ka ha were adịmọcha kpọrọ ihe ma zèéré ikpofù unyi maọbụ ahịhịa aghara-aghara nà n'ebe adịghị mma, n'ihi na nke ahụ na-emetọ ma na-emebìsi gburugburù, tinyekwuoro na ọ ewèta mgbasàwanye nke ọrịa na efe èfè ajọ ọnọdụ ahụike, nakwa ajọ ọdachi ndị ọzọ.

Na nzaghàchi oge ọ na-anabàta akụrụngwa ndị ahụ, onyeisi ụlọ ọrụ ASWAMA, bụ Maazị Amaechi Akaọra kwupụtàrà na nke ahụ ga-akwàlitekwu ma nyekwara ụlọ ọrụ ahụ aka n'ọrụ mkpocha nà nzacha ya n'ebe ọ pụrụ ichè, n'ihi na o meela ka ọnụ ọgụgụ akụrụngwa na ụgbọala ha ji arụ ọrụ bawanyekwuo.

O jikwàzịrị ohère ahụ rịọ Ndị Anambra ka ha nye aka na ya bụ mbọ a na-agba ịkwàdo ọrụ adịmọcha na steeti ahụ, site n'ịdị na-atụ ụtụ mkpocha na nzàcha ha ogè na otu o kwèsìrì, ya na ịdị na-erubere iwu na-echekwa gburugburu isi oge niile, n'ihi na onye ọbụla nupùrù isi wee nye nke ahụ ka a ga-anwụchikọ ma taa yq ahụhụ dịka ọ dị n'usoro iwu.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.