Mmadụ Atọ Agbanahịla Ọnwụ, Dịka Nnukwu Ụgbọala Makpuru Ọhịa n'Osun

Jul 30, 2021 - 21:24
Jul 30, 2021 - 21:30
 0
Mmadụ Atọ Agbanahịla Ọnwụ, Dịka Nnukwu Ụgbọala Makpuru Ọhịa n'Osun

Izunna Okafor dere akụkọ a

Mmadụ atọ nọrọ na nsonso a wee gbanahị ọnwụ mberede, dịka otu nnukwu ụgbọala gwongworo hapụzịrị ịgba n'okporoụzọ ma gbabazie n'ọhịa.

Ihe mberede okporoụzọ ahụ bụ nke dapụtara na steeti Osun, na mpaghara Majeroku, bụ nke ji kilomita olenaole wee dị anya n'àkwàmmiri SASA dị na mpaghara ụzọ awara-awara siri Gbongan gaa Ibadan.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ 'Federal Roads Safety Commission (FRSC) na steeti ahụ, bụ Agnes Ogungbemi mèrè ka a mara na ihe mberede ahụ dapụtàrà n'etiti nnukwu ụgbọala gwongworo MACK ọcha (nwere akàrà KTU774XW) nà ụgbọala gwongworo DAF na-acha edo èdò (nwere akara LSD314XX), ma bụrụkwazie nke mere n'ime abalị, ka ọ fọrọ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere atọ nke ime abalị.

O kwuru na a na-enyo ènyò na ọ bụ ịgba oke ọsọ mere ihe mberede okporoụzọ ahụ jiri dapụta, maka na ọ bụ ịgba oke ọsọ mèzịrị na ndị na-anyà ụgbọala ahụ enweghịzị ike ijidenwu maọbụ gbazie ha; ha wee kwòkọọ ọnụ ma makpuo ọhịa.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ndị ọrụ FRSC wụchiri n'ebe ahụ mgbe ha nwètèchàrà ozi banyere ya bụ ihe mberede okporoụzọ n'ụtụtụ, ma nye aka n'ibughasị ihe dị iche iche dachisiri okporoụzọ, ọkachasị osisi juru n'ime ụgbọala gwongworo DAF, bụzị nke ụfọdụ n'ime ha dapụsịrị wee dachisie ụzọ, ma bụrụzie nnukwu ihe ogbochi nyegara ndị ọzọ na-agba n'okporoụzọ ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484