Oke Idei Mmiri Awakpola Obodo Keffi Na Steeti Nasarawa

Jul 31, 2021 - 20:42
Jul 31, 2021 - 21:03
 0

Izunna Okafor dere akụkọ a

Oke idei mmiri kpara mkpamkpa n'ochie obodo Keffi dị na steeti Nasarawa, na mpaghara 'North Central' nke ala Nigeria, bụkwa nke wetere ọnwụ mmadụ ruru isii n'ọnụọgụgụ ma bibie ọtụtụ ihe gburu ego ruru nde kwuru nde naịra n'ebe ahụ.

Dika akụkọ ihe akaebe si kọọ, óké mmiri ozuzo nke bidoro n'isi ụtụtụ ụbọchị Mọnde, abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Julaị a gbàrà oke idei mmiri ma mekwazie ka idei mmiri tochie àkwàmmiri a maara dịka "Antau Bridge" nke dị nso n'ọnụ ụzọ ebe e si abanye n'ụlọakwụkwọ kọleeji gọọmenti etiti a maara dịka 'Federal Government College, Keffi' dị na steeti ahụ.

Akụkọ e nwetere na-akọwa na ya bụ óké idei mmiri dọwara ma kwatuo aja ngwuru ụlọakwụkwọ ahụ nke kewara ya bụ ụlọakwụkwọ na mmiri ahụ a rụụrụ àkwà mmiri ahụ dị n'akụkụ ebe ahụ.

Otu onye ọnọmgbeomere hụrụ ka ya bụ ihe siri wee gaa, bụ Maazị Ahmadu Isa gbara akaebe nke ahụ ma kwuo na idè mmiri ahụ bukọọrọ ụmụakwụkwọ ise nọ na mmiri ahụ egwu mmiri oge ọ wara; o nweghịzịkwa onye hụrụ ụmụakwụkwọ ahụ anya ọzọ ruo taa, n'ihi na a maghị ebe mmiri ahụ budobere ha, ma ya fọdụzie ịhụ ozu ha anya, ma ọ bụrụ na ha nwụrụ anwụ 

Ọ gara n’ihu kwuo na idei mmiri ahụ burukwara otu agadi nwoke nọ n'ime mmiri ahụ, n'agbanyeghị aka niile a dọrọ ya na ntị megide ịbanye maọbụ nọrọ n'ime mmiri ahụ toro eto.

Keffi, nke bụ obodo ebe a rụrụ mahadum steeti ahụ bụ 'Nasarawa State University' jiri naanị kilomita iri ise na abụọ (52km) wee dị anya n'Abuja bụ isi obodo ala Nigeria.

Akụkọ kọkwara na ọtụtụ narị kwuru narị ndị mmadụ na-eme njem na ndị ọzọ ji ụkwụ aga tọrọ atọ n'okporoụzọ awara awara ahụ siri Keffi gaa Abuja, dịka ide mmiri jupụtara na mpaghara ebe ahụ niile, bụkwa mpaghara ebe a rụrụ ogige maka ndị ji otu ahọ efe ala nna ha na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484