A Nwụchiela Ndị Ntọ Abụọ Na-Eyi Ndị Mmadụ Egwu n'Ijebu-ode na Gburugburu Ya

Dec 22, 2021 - 19:59
 0
A Nwụchiela Ndị Ntọ Abụọ Na-Eyi Ndị Mmadụ Egwu n'Ijebu-ode na Gburugburu Ya

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụbọchị niile nwere ike bụrụ maka onyeohi, mana otu ụbọchị ga-abụrịrị maka onye nwe ụlọ; maka na ahụhụ anaghị ezo n'ahịhịa ebighịebi.

N'ịgbaso nke a, ndị uweojii na steeti Ogun anwụchiela mmadụ abụọ a na-enyo ènyò na ha bụ ndị ntọ na-ewu èwù ma bụrụkwa ndị na-eyi ndị mmadụ egwu n'Ijebu-Ode nà mpaghara gburugburu ya niile.

Mmadụ abụọ ahụ gụnyere Samuel Oke Abiodun (gbara ahọ iri anọ na isii) na Dennis Blessing (gbara ahọ iri abụọ na asatọ, ma bụrụkwa ndị a nwụchikọrọ oge onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP Lanre Bankole nyechaara ndị DPO niile nọ na steeti ahụ ntụziaka ịnwụchikọ ndị ntọ na ndị omekome ndị ọzọ na-akpa ike na ma na-atọkwa mmadụ aghara aghara na mpaghara ebe ahụ nà mpaghara ebe ndị ọzọ na steeti ahụ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ DSP Abimbola Oyeyemi kọwara na oge DPO mpaghara Igbeda, bụ CSP Musiliu Doga nàtàchara ntụziaka ahụ, na o duuru ndị òtù ọtụ ya a pụrụ iche, wee bàgide n'imë nnyòcha pụrụ iche, bụzị nke esitere na ya wee nwụchie Maazị Dennis Blessing n'ụlọ be ya dị n'Ijebu-Ode n'abalị asatọ nke ọịwa Disemba ahọ a.

DSP Oyeyemi kọwàrà na ọ bụ nnwụchi ahụ a nwụchiri nwoke ahụ nà asịsà ọ sara ka e sitere na ya wee nwụchie Maazị Samuel Oke Abiodun n'ebe ya onwe ya na-ezokwa n'Ijebu-ode.
 
Oge a gbara ha ajụjụọnụ, ndị omekome ahụ kpọpụtasịrị ọtụtụ ndị ha tọrọgoro na mpaghara ebe dị icheiche ha na ndị otu ha rụgoro ọrụ. 

Ha mekwakwara ka a mara na ọrụ nke dịịrị ha na-abụkarị ịkwụgharị ka atụrụ enweghị onye nche, iji chọọ ndị a ga-atọrọ maọbụ ebe ha na ndị otu ha ga-eje ọrụ, ma chọpọtakwa ụzọ onye ahụ si ala, ma ga gwazie ndị òtù ha, ka ha kpaa ụbọchị ha ga-aga ichebiri onye ahụ n'ụzọ, ọkachasị n'ụzọ o si abànye ụlọ be ya, ka ha wee tọrọ ya.
 
A napụtakwazịrị ndị ahụ ụgbọala Toyota Camry (nwere akàrà GGE 200 FN) ha ji eme ya bụ mkpamkpa

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP Lanre Bankole kèlèrè ndị ọrụ ya maka nkwụdosike ha nà ezi agbambọ ha n'ịnwụchikọ ndị ahụ, ya na ezi ọrụ ndị ọzọ ha rụgoro.

O nyekwazịrị ntụziaka ka e nyefèé okwu ahụ n'aka ngalaba na-ahụ maka ibu agha megide ntọ n'ime ngalaba 'State Criminal Investigation and Intelligence Department' mak ime nnyocha miri èmì banyere njọ na arụrụala ha.

Ọ gakwara n'ihu nye ndị uweojii ahụ ntụziaka ka ha gbasie mbọ ike iji nwụchikọ ndị òtù arụrụala ahụ ndị nke nọ n'ọsọ ugbua; ọbụladị dịka o nyekwara owuweanya na a ga-akpụpụ ha ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee gwọọ ha ji mmanụ, dịka ihe ha mere siri dị.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484