Ndị Uweojii Anambra Ejidela Nwaanyị Na-Atụ Mgbere Mmadụ

Sep 2, 2020 - 21:00
Jan 28, 2021 - 21:01
 0
Ndị Uweojii Anambra Ejidela Nwaanyị Na-Atụ Mgbere Mmadụ

Izunna Okafor

Ụbọchị niile bụ nke onye ohi, mana otu ụbọchị bụ nke onye nwe ụlọ. O wee bụrụ etu ahụ ka aka abụọ siri ghọọ Oriakụ Nkechi Odinye otu aka, maka ịtọ na ịtụ mgbere mmadụ n'ime steeti Anambra.

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka ndị uweojii n'ime steeti Anambra, bụ Maazị Harụna Mọhammed siri kọwaa, nwaanyị ahụ (gbara ahọ iri ise na ise) bụ onye a nwụchiri ụbọchị Mọnde n'Obosi dị n'okpuru ọchịchị Idemili North, site n'aka ngalaba ọrụ uweojii na-ahụ maka ibu agha megide òtù nzuzo, bụ 'Special Anti-Cult Squard (SPACS)' na njikọaka ngalaba isi ụlọọrụ uweojii dị na mpaghara 3-3 Ọnịtsha.

Ọ dị ncheta na ndị uweojii steeti Anambra nọrọ n'abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Ọktoba ahọ gara aga (2019), wee jide ụmụnwaanyị atọ a na-enyo ènyò na ha bụ ndị na-atụ mgbere mmadụ na mpaghara ahịa Nkpọr dị n'okpuru ọchịchị 'Idemili North', maka izu ụmụaka abụọ.

Mana mgbe e mechara nnyocha, a chọpụtara na ọ bụ otu nwaanyị a maara dịka Oriakụ Hauwa Musa siri na steeti Gombe wee tọọrọ ma kpọdàtara ha ụmụaka ahụ na steeti Anambra. 

Mgbe e mechazịrị mgbasa ozi banyere nke ahụ, ndị nne na nna ụmụaka ahụ siri na Gombe wee bịa  kpọrọ ụmụ n'Awka, ebe ụmụnwaanyị atọ ahụ jiri ọnụ ha wee kweta n'ezie na ọ bụ otu nwaanyị a maara dịka Nkechi Odinye na-edunye ha ịga tọrọ ụmụaka mmadụ bịa resi ya n'agbata ọnụego dị narị puku naịra abụọ ruo narị puku naịra anọ(dabere nà onye ahụ ọ bụ nwoke ka ọ bụ nwaanyị, maọbụkwanụ n'ahọ ole onye ahụ dị). 

Ọ bụ kemgbe ahụ ka anya ndị uweojii jiri chọgharịba ya bụ nwaanyị ka a nwụchie ya, o wee na-ezogharị, wee ruzie ụbọchị ahụ aka ndị uweojii kpààrà ya. Ka e jidechara ya wee gaa n'ebe ọ na-edobe ndị mmadụ o zuru ezu maọbụ ndị o goro ego, e nwetara ụmụaka iri na abụọ (nwoke asata na nwaanyị anọ) n'ebe ahụ, bụ ndị o zuru ezu site na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria.

Maazị Mohammed gara n'ihu mee ka a mara na nnyocha ka na-aga n'ihu bànyere nke ahụ, ma mee ka amara na a ga-akpụpụ nwaanyị ahụ ụlọikpe ma e mechaa nnyocha ahụ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP John Abang dọrọ ndị nne na nna aka na ntị ka ha kpachapụ anya etu ha si ahapụ ụmụ ha, ma gwa ha ka kwụsị ịhapụ ha ka ha so onye dị añaa. 

Ọ gwakwazịrị onye ọbụla nwa ya na-efù ka ọ gaa ozigbo n'ogige isi ụlọọrụ ndị uweojii dị na mpaghara 3-3 Ọnịtsha, ka ọ mara na nwa nke ya o so na ndị a napụtara n'aka nwaanyị ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.