Ndị Ojiegbe Agbagbuola Ndị Uweojii Abụọ n'Anambra, Gbaa Ụgbọala Ha Ọkụ

Dec 20, 2021 - 23:31
 0
Ndị Ojiegbe Agbagbuola Ndị Uweojii Abụọ n'Anambra, Gbaa Ụgbọala Ha Ọkụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Anyammiri na mkpuakwa dara na nsonso a dịka ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ nọrọ na nsonso a wee wakpò ma gbagbuo mmadụ abụọ ndị uweojii ebe ha nọ n'ihu ọrụ.

Nke a bụ nke mere n'ime steeti Anambra na mpaghara ebe ahụ ndị uweojii jiri ihe wee dochisie okporoụzọ n'ụzọ awara-awara ahụ siri Idemili gaa Owerri, n'akụkụ Ọnịtsha..

Dịka akụkọ siri kọọ, ndị uweojii ruru iri n'ụnụọgụgụ wee nọrọ n'ihu ọrụ oge ahụ ihe ahụ mere. Mgbe ndị ntaakụkọ rutekwara n'ebe ahụ, ha hụkwara na e bupùsiela ihe ahụ e jiri dochisie ụzọ n'ebe ahụ, ịke mezịrị ka ụgbọala na ndị mmadụ na-agara onwe ha.

N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ banyere nke ahụ, otu onye ọnọmgbeomere, bụ Victor Uzor gbara akaebe na ihe ahụ ndị uweojii dochisiri ebe ahụ mezịrị ka a na-enwe nnukwu agbakata akwụrụ n'okọporoụzọ, nke na ọtụtụ ndị mmadụ na-akwụ ebe ahụ ruchaa otu áwà tupu ọ gafèé.

Ọ kọwakwara na agbakata akwụrụ ahụ ndị uweojii ahụ na-ewèta n'ebe ahụ metụtakwazịrị ma kpọchie ụzọ abụọ ahụ ruo na mpaghara Upper Iweka.

Ọ sị na ya onwe ya na ụfọdụ ndị ọzọ na-anyà ụgbọala nọ n'ebe ahụ, oge agbakata akwụrụ ahụ ji ha, wee ruo mgbe a nụrụ ụda egbe, nke mezịrị ka onye ọbụla nọ ebe ahụ, ma ndị uweojii ahụ rie mbọmbọ oso ozigbo. Ọ bụzị oge nke ahụ na-eme ka ndị omekome ahụ gbaturu ndị uweojii abụọ, ma gbakwa ụgbọala ndị uweojii dị ebe ahụ ozigbo, makpurusie ụgbọala ha, fee ka nnụnụ, nke na o nweghịzịkwa onye hụrụ nzọụkwụ ha anya ọzọ.

Ọ kọwara na a dọnyezịkwara ozu ndị uweojii ahụ a gbagburu agbagbu n'ụlọ nchekwa ozu

N'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ b, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Anambra, DSP Ikenga Tochukwu gbara akaebe na ya bụ ihe mèrè n'ezie, ma kọwaa ya dịka nnukwu ọdachi.

Dịka ọ na-akọwapụta na ọ bụ oge o jiri nkeji iri abụọ gata elekere ise nke mgbede ka ya bụ ihe jiri mee; ọ kọwara nke ahụ dịka otu n'ime ụzọ dị icheiche ndị ọrụ nchekwa si atụnye isi ha ma jiri ndụ ha chụọ aja na nchekwa obodo. Ọ kasizịrị ezinụlọ ndị nke ha nwụrụ n'ihe ọdachi ahụ obi, ma kpee ka mkpụrụobi ha zuo ike na ndokwa.

O mekwazịrị ka a mara na a na-agbasi mbọ ike ma na-emekwa nnyòcha, iji chọpụta ma nwụchikọọ ndị aka ha dị n'arụrụala ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484