Onyeisioche Okpuruọchịchị Ebidola Ịchụgharị Ụmụokorobịa Kpara Isi

Dec 23, 2021 - 20:28
Dec 23, 2021 - 21:14
 0
Onyeisioche Okpuruọchịchị Ebidola Ịchụgharị Ụmụokorobịa Kpara Isi

Izunna Okafor dere akụkọ a

.

Ọ bụ nnukwu ihe ịgba ngharị nye ọtụtụ ndị mmadụ, dịka onyeisioche ọhụrụ okpuruọchịchị ime obodo Okene, nke steeti Kogi, bụ Maazị Zubair Amoka jiri m̀kpà wee wụchaa n'okporoụzọ ma bido ịchụgharị ụmụokorobịa kpara isi, nke na onye ọbụla o jidere kpara isi, o were mkpà (scissors) ahụ kpụchasịa ya isi.

Ya bụ onyeisioche okpuruọchịchị ka e kwuru na ọ banyere n'ọkwa ọhụrụ, ma bụrụkwa onye a hụrụ ebe ọ na-akpụchasị isi otu nwata nwokorobịa kpara isi, bụkwa onye mere ụdị isi nke a na-akpọ 'dreadlock'. Foto e sere ya oge ọ na-akpụ nwokorobịa ahụ isi ahụ gòsìkwàrà na ndị uweojii bùgasị égbè kwụrụ wee na-eche ya nche, ma na-egbochikwa naokorobịa ahụ ịgbapụ. Ọ bụkwa n'ala nkịtị ka a dọbara nwokorobịa ahụ wee na-abọchasị ya isi.

N'okwu ya oge ọ na-akpụ ha isi ahụ, a nụrụ ka ya bụ nwoke na-ekwu sị na “Ihe a akarịala, ndị ntorobịa anyị ga-abàrịrị uru. Kedụ ụdị nzuzu dị ihe a?”

Ọ bụzị etu ahụ ka ya bụ onyeisioche siri wee jide ma kpụchasịa nwokorobịa ahụ isi ya niile, wee sị na “ọ dịla ka mmadụ.”

Ọtụtụ ụmụafọ Nigeria ekwupụtala echiche obi ha n'usoro nzikọrịtaozi banyere ihe ahụ onyeisioche ahụ mere, bụ ịkpụchasị ndị ntorobịa isi n'ọhammadụ.

Ụfọdụ tòròya, kọwaa ihe ahụ o mere dịka nke kwesiri ekwesi, n'ihi na ha sịrị na ọtụtụ ụmụokorobịa esitela n'ịkpa isi, ịgbapu ntị na na ibi ụdị ndụ ndị ọzọ yiri ya, wee kpafuo ma laa n'ihi, nke na ha na-ewètezị ala adịghị mma n'obodo ugbua, ma sokwa n'ihe mere na obodo adịghị agawanye n'ihu.

N'aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị ọzọ katọkwàrà etu nwoke ahụ siri chọchaa ihe ọ ga-arụ dịka onyeisioche okpuruọchịchị, ọ bụrụ ịkpụchasị ụmụ mmadụ isi ha jiri ego wee kpàá. Ha jụrụ ma nsogbu Nigeria nwere àgwụchaala, nke na ọ bụ ịkpà isi fọrọ, ya bụ nwoke jiri hapụ ọrụ ndị ọzọ chere ya n'ihu na ihe ndị ọzọ a na-atụ anya n'aka ha iwèta, ọ bụrụ ịchụgharị ụmụokorobịa kpara isi nà ịkpụchasị ha isi.

Ha dụkwazịrị ndị ọchịchị ka ha tinye uchu na oge ha n'ihe ndị kacha bụrụ nsogbu na-echere obodo ha, okpuruọchịchị ha, steeti ha, na ala Nigeria n'izugbe, na ụmụafọ ya aka mgba ugbua, dịka ajọ ọnọdụ nchekwa, agụụ, ajọ ọnọdụ akụnụba, ajọ okporoụzọ, mpụ na arụrụala, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484