Mpụ Na Arụrụala: Ndị Uweojii Anwụchiela Mmadụ 28 na Minna

Jan 30, 2022 - 21:56
 0
Mpụ Na Arụrụala: Ndị Uweojii Anwụchiela Mmadụ 28 na Minna

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọnụ anaghị ezù ike ma ọ bụrụ na ihe ọ na-ata agwụghị. Ọ na-abụkwa a na-etigbu, ọ ká na-arịpụ̀ta, ị mara na ihe a na-etigbu agwụbèghị ebe o si arịpụta.

Ka ọ dị ta, ndị uweojii na steeti Niger anwụchikọọla ndị ntorobịa ruru iri abụọ na asatọ (28) n'ọnụọgụgụ, bụ ndị a na-enyo ènyò na ha bụ ndị na-etinye aka na mpụ, arụrụala nàkwà ihe ndị ọzọ dị icheiche na-ebute ala adịghị mma na steeti ahụ, ọkachasị na mpaghara Minna, bụ isi obodo steeti ahụ.

Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n'ozi isi ụlọọrụ ndị uweojii steeti ahụ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ na nsonso a, bụkwa nke onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n'ime steeti ahụ, bụ DSP Wasiu Abiodun bìnyèrè aka na ya, n'aha onyeisi uweojii steeti ahụ, bụ CP Monday Bala Kuryas.

Ọ kọwàrà na njide ahụ ha jidere ndị ahụ bụ nke ha bụ ndị uweojii mere site na njikọaka ngalaba ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ dị icheiche, nke gụnyere ndị ọrụ agha ala Nigeria, ndị ọrụ DSS, ndị ọrụ 'Nigerian Security and Civil Defence Corps (NSCDC)', nà ndị ọrụ nchekwa ime obodo; ma bụrụkwa nke dabàrà adaba n'ịgawanye n'ihu n'ezi mbọ ahụ ha na-agba imemìlà mpụ na arụrụala na steeti ahụ.

O chètààrà ọhaneze na ndị uweojii ejidebụọla mmadụ iri atọ na abụọ n'ime steeti ahụ na nsonso a, bụ ndị a na-enyo ènyò na aka ha dị na nkwàtụ́ ahụ a kwàtụrụ na nsonso a n'ime steeti ahụ, bụ nke wetere ọnwụ otu onye uweojii na otu onye ọzọ na-azụ ahịa.

Ọ sịkwa na ọ bụ n'ime abalị ka ha jere n'ụlọ n'ụlọ wee nwụkọtasịa ụfọdụ n'ime mmadụ iri abụọ na asatọ ahụ n'obodo Unguwar-Biri dị na mpaghara okpuruọchịchị ime obodo Bosso.

DSP Abiodun gàkwàzịrị n'ihu kpọpụtasịa ụfọdụ ihe e nwetesiri n'aka ndị ahụ, nke gụnyere ọtụtụ ọgwụ a gwọrọ agwọ, nnukwu mmà iteghete, obere mmà asatọ, ókpìrì osisi iteghete, otu okpìrì ígwè, ihe e ji ébè okooko abụọ, otu m̀kpà, ihe e ji añụ anwụrụ shịshà ise, ekwentị iri na atọ, ọtụtụ àkpà ọgwụike (ìgbó juru n'ime ha), ákwà, akpụkpụkwụ, ekwentị iri na atọ, na ụfọdụ ihe ndị ọzọ.

O kwezịrị nkwà na ụlọọrụ ahụ agaghị ada mbà n'agha ahụ ọ na-ebu megide mpụ na arụrụala n'ime steeti ahụ, ma kwukwazie na ha ka na-agbasi mbọ ike iji nwụchikọọ ndị arụrụala, ndị omekoomè na ndị ọzọ na-ewèta mpụ na arụrụala na steeti ahụ.

O mèkwàrà ka a mara na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ngwangwa e mechara nnyòcha banyere arụrụala na akụmàkụ ha.

Na ntụnye nke ya, onyeisi ndị uweojii na steeti Niger, bụ CP Monday Bala Kuryas dọ̀kwàzị̀rị̀ ndị na-eme ihe ọbụla uwu akwadòghị̀ ka ha chegharịa, sepụ aka na ya, maọbụ kwakọrọ ngwongwo ha pụọ na steeti ahụ, n'ihi na ya na ndị ọrụ ya agaghị ezu ike maọbụ sepụ aka n'agha ahụ ha na-ebu megide mpụ na arụrụala na steeti ahụ, ruo mgbe ha kpochàpụ̀rụ̀ ha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484