Obianọ Etoola Ndị Anambra Maka Ịza Òkù 'Akụ Ruo Ụlọ'

Jan 27, 2022 - 22:49
 0
Obianọ Etoola Ndị Anambra Maka Ịza Òkù 'Akụ Ruo Ụlọ'

Izunna Okafor

Ọ na-abụ akụ ruo ụlọ, a mara onye kpara ya.

N'ihi nke a, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ etoola ndị Anambra zara oku 'Akụ Ruo Ụlọ' ahụ ọchịchị ya na-akpọ wee welataruo akụnụba ha ụlọ, site n'ịbịa rụọ ụlọọrụ, ụlọahịa, ụlọ mmepụta ngwahịa, na na ihe mwunye ndị ọzọ dị icheiche n'ime steeti ahụ.

Gọvanọ Obianọ kwupụtàrà nke a oge ya na ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba izu n'ime steei ahụ gara njem nleta n'ụfọdụ ebe dị icheiche a rụrụ ụlọahịa na ụlọ mmepụta ngwaahịa ọhụrụ n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ, nke gụnyere ụlọahịa 'Everyday Supermarket', 'Stanel World' na 'Radopin Supermarket'.

Njem nleta ahụ bụ nke a nọrọ na ya wee duru Gọvanọ Obianọ na ndị ya na ya so wee gagharịa na gburugburu na ime ụlọahịa ahụ, ka o wee jiri anya ya hụ ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ.

N'okwu ya oge ọ gagharịchara n'ebe ndị ahụ ma zụrụkwa ụfọdụ ihe, ya bụ Gọvanọ kwupụtàrà afọojuju ya nà ọñụ o nwere na steeti ahụ nọ n'ezi ọnọdụ mmepe dị elu ugbua karịa ka ọ dị oge ọ batara n'ọkwa ọchịchị.
 
O kelekwara ndị nwegasị ụlọahịa na ụlọọrụ ahụ maka ịza oku 'Akụ Ruo Ụlọ' ahụ, ma kwekwa ha nkwàdo na gọọmenti ga-aga n'ihu inye ha na ụlọọrụ ha ezi ọnọdụ dị larịị maka azụmahịa ha, ọkachasị dịka o siri metụta ezi ọnọdụ nchekwa na ụlọọrụ na ezi ọnọdụ ndị ọzọ ga-enye aka ime ka azụmahịa na arụmọrụ ha na-agawanye n'ihu n'enweghị ihe mkpọbịụkwụ ọbụla.

Ka ọ na-ekwe nkwà na ọchịchị na-abàta ọhụrụ na steeti ahụ ga-amalitekwa ebe ya onwe ya kwụsịrị ma gakwa n'ihu n'inye ha nkwàdo zuru òkè; Gọvanọ Obianọ kpọkukwazịrị Ndị Anambra ndị ọzọ bigasị ebe dị icheiche n'ala Nigeria nà ná mba ofesi ka ha sokwa na ndị zara òkù ahụ site n'iwèlata akụnụba ha ụlọ, maka na nke ahụ ga-enyekwa aka n'ịkwalitekwu ọnọdụ mmepe steeti ahụ n'ogoogo kacha elu, tinyere ọtụtụ úrù ndị ọzọ nke ahụ ga-ewèta.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484