Gọọmenti Anambra Ekpeerela Ndị Ogidi na Abatete Udo Banyere Oke Ala Ha Na-Azọ

Mar 7, 2022 - 13:42
 0
Gọọmenti Anambra Ekpeerela Ndị Ogidi na Abatete Udo Banyere Oke Ala Ha Na-Azọ

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ọ naghị adị mma nne nkịta ịnọ n'ụlọ, ụmụ ya ana-azọ ọkpụkpụ.

Ka ọ dị taa, ọchịchị steeti Anambra awụbatala ma kpezie okwu ahụ dị n'etiti obodo Ogidi na ndị Abatete, n'okpuruọchịchị ime obodo ‘Idemili North’, banyere ókè ala obodo abụọ ahụ na-azọ, bụkwa nke ha zọgoro ruo ahọ iri ise zuru èzù.

Ya bụ nsogbu ókè ala bụ nke dị kpọnkwem n'etiti ndị Ụmụezeobodo Ajịlịja Ogidi na ndị Ụmụdunu Agbaja Abatete, m bụrụkwa nke e kpeziri na nsonso a site n'aka ndị òtù na-ahụ maka ókè ala na steeti ahụ a maara dịka ‘Anambra State Boundary Commission’ dị n'okpuru ụlọọrụ osote aka na-achị steeti ahụ, bụ Dọkịta Nkem Okeke.

Ndị obodo abụọ ahụ jìkwàzịrị ọñụ nupụta n'ìgwè, wee merùbe mkpezi ahụ e kpeziiri ha nàkwà udo batagoro n'etiti ha. 

N'okwu ya na mmemme ahụ, bụkwa nke ndị òtù ‘Anambra State Boundary Commission’ sònyèrè na ya, osote aka na-achị steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkem Okeke katọ̀rọ̀ etu nsogbu banyere oke ala si arị ibe ya elu na mpaghra ebe dị icheiche n'ala Nigeria, ma bụrụkwa nke na-ebutekarị tigbuo, zọgbuo, nàkwà mbibi akụnụba. Ọ kpọpụtasịrị ụfọdụ ebe dị icheiche ndị òtù ahụ kpègoro ikpe maka ókè ala n'ime steeti ahụ, ma kelekwazie ụmụafọ obodo abụọ ahụ nà ndị ndu ha maka ịgbaso udo nà nkwekọrịta.

Dịka ọ na-enye nkọwa banyere etu ọnọdụ siri gbata kwụrụ na mkpezi ahụ ha kpeziri, ọ dụkwazịrị ndị ahụ ọdụ ka ha gbasò nkwekọrịta ahụ, ma zèkwara ihe ọbụla nwere ike ibulitekwa okwu ahụ n'ọdịnihu, iji mee ka udo ahụ batagoro bụrụ nke ga-adị ọkpụtọrọkpụ.

Na ntụnye nke ha n'otu n'otu, onyeisi ọchịchị obodo Ogidi, bụ Maazị Neson Onubogu, nà onyeisi ọchịchị obodo Abatete, bụ Maazị Agbaja Abatete bụ Maazị Law Okoye, nke onye nọchitere anya ya bụ Maazị Ernest Ekunie kèlèrè ndị òtù ahụ maka mkpezi ahụ, ma dọọ aka na ntị ka onye ọbụla gharakwa ire ala ndị ahụ, bụkwa nke nwere ike ibì ọnọdụ udo ahụ aka ọjọọ.

N'okwu nke ya, onyeisi òtù ọrụ hụrụ maka mkpezi ahụ ma bụrụkwa ezi nwaafọ Ogidi, bụ Maazị Sam Anyawutakụ kwupụtasịrị ihe dị icheiche ịzọ oke ala ahụ wègòrò obodo abụọ ahụ, ma kọwakwa na ya bụ nsogbu dọghàchiri aka elekere azụ nke ukwuu n'ihe gbasaara ọnọdụ mmepe obodo abụọ ahụ.

Maazị Anyawutakụ, onye ọ bụ ya màlitere nzọpụụkwụ njem ikpë udo ahụ, kwupụtazịkwa obi añụrị ya n njem ahụ mịtàrà ezi mkpụrụ, ọbụladị dịka ọ kọwara ihe ahụ o mere dịka ijere Chineke na mmadụ ozi, ma kelekwazie Chineke na ụmụafọ obodo ahụ, ndị mere ka ya bụ nsogbu bịa na njedobe.

A nọkwazịrị na mmemme ahụ kpee ekpere pụrụ iche maka udo na mmepe tọrọ àtọ n'etiti obodo abụọ ahụ, gbapee ókè ala ahụ, tinyesie ihe nhụba ama n'ebe kwesiri ekwesi, ma gbakwa egwu ọdịnala, nke mezịrị ka ya bụ mmemme dàá ụdà.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484