Na Kano, A Kpụpụla Nwoke Ahụ Gburu Nwa Ahọ Ise Ụlọikpe

Jan 28, 2022 - 21:45
 0
Na Kano, A Kpụpụla Nwoke Ahụ Gburu Nwa Ahọ Ise Ụlọikpe

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọkụkọ ntị ike na-anụ ihe n'itè ofé. Ọ na-abụkwa agadi nwaanyị kachie ntị wụ̀ọ́ aja, e bute ozu ya n'ófète nke ọzọ.

N'ịgbaso nke a, a kpụpụ̀la ma kpụgharịa Maazị Abdulmalik Tanko, nà ndị òtù ya mmadụ abụọ, bụ Hashimu Issyaku na Fatima Musa n'ụlọikpe Majie dị na steeti Kano, maka ịtọ̀rọ̀ na igbu otu nwata akwụkwọ nwaanyị gbara naanị ahọ ise, bụ obere nwaada Hanifa Abubakar.

Ya bụ nwoke obi kpọrọ nkụ, bụ Maazị Tanko bụ̀ ya nwe ma bụrụkwa onyeisi ụlọakwụkwọ 'Noble Kids School' dị n'obodo Kwanar Dakata, na mpaghara okpuruọchịchị ime obodo Nasarawa nke steeti Kano, bụ ebe nwatakịrị nwaanyị ahụ nà-agụ́ akwụkwọ, tupu ya na ndị òtù ya wee tọ̀rọ́ ma jiri nsi (poison) gbuo ya ka ọ gachara izuụka olenaole.

Ọ bụkwazị ụbọchị Mọnde izuụka a ka a kpụgharịrị mmadụ atọ ahụ n'ụlọikpe majie 'Kano State Magistrate Court 12' dị na mpaghara Gidan Murtala.

N'okwu ya oge ọ na-ekpe ndị ahụ n'aka ụlọikpe ahụ, onye jiri ikpe ahụ wee bịa, ma bụrụkwa ọnụ na-ekpechitere steeti Kano, bụ 'Kano State Attorney General', Ọkaiwu Musa Lawan kwupụtara na ihe ndị ahụ mere a ga-elekwàsị anya wee kpee ha ikpe gụnyèrè ịgba izu ọjọọ, ịtọ̀ mmadụ, izochi onye a tọ̀rọ̀ àtọ, na igbu ọchụ, bụkwa nke megidere mpagara 97, 274, 277 na 221 nke akwụkwọ iwu 'Penal Code'.

Ọ rịọkwazịrị ọkaikpe majie na-ekpe ikpe ahụ ka o nyetụ ya na ndị òtù ọrụ ya obere ogè (ihe dịka abalị asaa) iji hàzie akwụkwọ ikpe ahụ n'ozuzuoke; ma rịọkwazie ya ka a tụkpuo mmadụ atọ ahụ n'ụlọ mkpọrọ ozigbo, ka ha ka nọrọgodi ebe ahụ na-ata ahụhụ ụwa ha, wee ruo mgbe a hazichara ọnọdụ maka ikpe ha.
 
Na nzaghachi ya, Ọkaikpe Majie ikpe ahụ dị n'aka, bụ Majie Muhammad Jibril mezùùrù Ọkaiwu ahụ ihe ọ rịọrọ, site n'inye ntụziaka ka a tụnye mmadụ atọ ahụ n'ụlọ mkpọrọ ozigbo. O bùgharịzịrị ikpe ahụ ka ọ dị n'abalị abụọ nke ọnwa Febụwarị ahọ a, ka ndị ahụ wee nwee ike ịhazìcha akwụkwọ na ihe ndị ọzọ dị mkpà banyere ya bụ ikpe dịka ha siri rịọ. 

Ọ dị ncheta na Maazị Tanko nọrọ n'abalị anọ nke ọnwa Desimba ahọ gara aga, wee tọ̀rọ́ nwatakịrị nwaanyị ahụ, bụ nwaada Hanifa oge ọ na-ala akwụkwọ.

Kaosiladị, o mechaziere jiri nsi gbuo nwata nwaanyị ahụ oge ọ (Maazị Tanko) gwachara nne na nna nwata ahụ ka ha kwụnyere ya nde naịra isii (₦6m) ka o wee tọhapụ nwa ha, bụkwazị nke ha bidogoro ime site n'ịkwụnyere ya ụfọdụ ego ha bitèrè ma na-agbagharịzị, na-achọ ebe ha ga-ebìtekwu maọbụ rịọtakwuo ego ka ha wee kwụtọpụ nke fọrọ afọ, tupu ha nwete ozi na e gbuola nwa ha.

Ọ bụkwa nwata nwaanyị ahụ bụ naanị otu nwa nna na nna ya bụ Maazị na Oriakụ Abubakar Abdulsalam mụtara, n'ihi na nwa na-esiri ha ike, tupu ha megide wee mụ́ta ótù ahụ.

Onyeisi ala Nigeria, bụ Muhammadu Buhari, na ọchịchị steeti Kano sòkwà na ndị tinyegoro ọnụ n'okwu ahụ, ma kwe nkwa ịhụ na e nwetara ikpe nkwụmọtọ n'isi nwata ahụ. 

Gọọmenti steeti Kano jikwàzịrị iwe maka arụrụala ahụ Tanko rụrụ, wee napụsịa ụlọakwụkwọ nnọrọonwe niile dịgasị na steeti ahụ akwụkwọ ikike ha, ma nyekwa ha ntụziaka ịbịa debàgharịa aha maka inweta akwụkwọ ikike ọhụrụ, bụkwazị nke a ga-akpachàpụ anya ma gbasòkwa usoro pụrụ iche wee na-enyezị ugbua.

Aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Abdullahi Ganduje nọkwàrà  na nsonso a, oge ya na ụfọdụ ndịisi ọchịchị steeti ahụ gara ileta nne na nwata ahụ, wee kwuo na ọ bụrụ na ụlọikpe mechaa má ndị arụrụala atọ ahụ maọbụ onye ọbụla n'ime ha ikpe ọnwụ, na ya onwe agaghị egbu oge ibinyè aka n'akwụkwọ maka igbu onye ahụ, dịka iwu siri kwàdó, maka na ihe ahụ ha mere bụ arụ ka arụ. 

O kwekwazịrị ezinụlọ ahụ nkwà na ha ga-enweta ikpe nkwụmọtọ; ọbụladị dịka o kpekwazịrị ka mkpụrụobi nwatakịrị ahụ aka ya dị ọcha zuo ike na ndokwa.

Ka ọ dị ugbua, a kà na-echezị abalị abụọ nke ọnwa Febụwarị, iji mara nkabi ụlọikpe ga-enye banyere ya bụ okwu.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484