Ụlọọrụ NCAA Ènyela Nkwàdo Ka Ụgbọelu Boing 737-700 Na-Adà n'Ọdụ Ụgbọelu Anambra

Jan 27, 2022 - 22:40
 0
Ụlọọrụ NCAA Ènyela Nkwàdo Ka Ụgbọelu Boing 737-700 Na-Adà n'Ọdụ Ụgbọelu Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka njem ụgbọelu n'ala Nigeria a mààrà dịka 'Nigerian Civil Aviation Authority (NCAA n'aha mkpìrìsì) ènyéla ikike nà nkwàdo ka ụgbọelu ndị ahụ kacha buo ibù a maara dịka 'Boeing 737-700’ maọbụ ndị ọzọ dịkwa ka ya na-adàzị ma na-efelikwa n'ọdụ ụgbọelu mba ụwa ahụ a rụrụ ọhụrụ na steeti Anambra, bụ 'Anambra International Cargo and Passenger Airport' dị n'Umueri, n'okpuruọchịchị ime obodo 'Anambra East'.

Ụlọọrụ NCAA kwupụtara inye ikike na nkwàdo a site n'ozi ha ziteere aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ na nsonso a, bụkwa nke onyeisi ụlọọrụ ahụ, bụ Maazị Musa S. Nuhu binyere aka na ya.

Maazị Nuhu kọwàkwàrà na nkwàdo na ikike ahụ ha nyere bụ n'ihi na ha nwere afọojuju n'ihe ha hụrụ n'ọdụ ụgbọelu ahụ oge ndị òtù ọrụ ha bụ 'aerodrome safety inspectors' gara njem nleta n'ebe ahụ, iji nyochaa ma mara na ya bụ ọdụ ụgbọelu ò tozùrù òkè ma dịkwa njikere na nkwadobe maka mbulielu ahụ, bụ isi n'ogoogo Cat. 5 banye n'ogoogo Cat. 6

Ka o nwetechaara ya bụ ozi, Gọvanọ Obianọ nọrọ ụbọchị Wenezdee wee gaa njem nleta n'ọdụ ụgbọelu ahụ, iji hụ ka ihe si aga n'ebe ahụ, ma bụrụkwa ebe ọ nọrọ wee kwupụta obi añụrị ya banyere ikike na nkwàdo ahụ NCAA nyere ọhụrụ.

N'okwu ya n'ebe ahụ oge ọ gagharịchara hụ ka ọrụ si aga n'ebe ahụ, ma kelekwa ụmụafọ steeti Anambra na ndị ọzọ si n'ọdụ ụgbọelu ahụ eme njem kemgbe e siri gbapee ya.

O nyèkwàrà nkọwa banyere nkwàdo na ikike ahụ ụlọọrụ NCAA nyere na nsonso a isi n'ogoogo nke ise banye n'ogoogo nke isii, ma kọwaa na nke ahụ pụtazịrị na ya bụ ọdụ ụgbọelu ga na-anabàtanwuzị nnukwu ụgbọelu ga-ebunwu ọnụọgụgụ mmadụ nọ n'àgbàtà narị atọ, wee ruo narị atọ na iri ise. O kwupụtzịkwàrà olileanya o nwere na a ga-ebulikwu ọdụ ụgbọelu ahụ n'ogoogo nke iteghete, ma ọ bụrụ na e bulataruo ma tinye nnukwu igwe nsọyụọkụ ahụ ọchịchị ya goro na Germany.


Ọ dị ncheta na ọdụ ụgbọelu ahụ bụ nke a rụrụ n'ime ọnwa iri na ise site n'aka gọọmenti nọ ugbua na steeti Anambra, ka ọ gachaara ọtụtụ ahọ steeti ahụ jiri rọba nrọ inwe ọdụ ụgbọelu, bụkwazị nke mechaara wee pụta ìhè.

Ọ bụkwazị n'abalị iri atọ nke ọnwa Ọktoba ahọ gara aga ka a nọrọ wee mee mmemme ịgbape ọdụ ụgbọelu ahụ kpọnkwem, bụkwazị óké mmemme dọtara 'ụwa niile'; o wee malite ọrụ n'uju ụbọchị ahụ, nke na e nweelarị puku kwuru puku ndị mmadụ ndị sigoro na ya wee mee njem n'ime ọnwa olenaole e jiri gbapee ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484