Mmadụ Abụọ Anwụọla n'Ajọ Ihe Mberede Okporoụzọ Mere n'Anambra

Dec 9, 2021 - 22:22
 0
Mmadụ Abụọ Anwụọla n'Ajọ Ihe Mberede Okporoụzọ Mere n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ka ọ gachara ihe dịka otu izuụka mmadụ anọ jiri nwụọ n'ihe mberede okporoụzọ mere n'Ihiala dị na steeti Anambra, nnukwu ihe ịgba anyammiri ọzọ emeela, dịka oke ihe mberede okporoụzọ dapụtara ma taa isi mmadụ abụọ ọzọ na steeti ahụ.

Dịka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps, FRSC (ngalaba steeti Anambra), bụ DRC Margaret B.  Onabe siri kọwaa n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ ụbọchị Tuzdee, ya bụ oke ihe mberede okporoụzọ dapụtara n'akụkụ ebe ahụ a na-egbu anụ n'Ogbunike, na mpaghara n'ogologo ụzọ awara-awara ahụ siri Enugu gaa Onitsha n'elekere asaa nke ụtụtụ ụbọchị Tuzdee ahụ.

O mere ka a mara na ihe mberede okporoụzọ ahụ metụtara ụgbọala abụọ, nke gụnyere Tipa (enweghị akàrà) na Toyota Corolla (nwere akara HTE 365 CU); ma metụkwa mmadụ anọ, ndị bụcha naanị ụmụnwoke.

Ọ kọwara na ọ bụ ịgba oke ọsọ na ịnọchi okporoụzọ kpatara ya bụ ihe mberede okporoụzọ. O mere ka a mara na ndị ọnọmgbeomere kwuru na ụgbọala Tipa ahụ gbagidere n'okporoụzọ wee nwee nsogbu, kwụsị n'etiti ụzọ, nke mezịrị ka ụgbọala Toyota Corolla jiri ọsọ wee gbakwuru ya ma kpọkasịa onwe ya.

Mmadụ abụọ n'ime ụmụnwoke anọ ahụ nọ n'ụgbọala abụọ ahụ nwụrụ ozigbo ya bụ ihe mberede ahụ mere, ebe mmadụ abụọ ndị ọzọ pụtara n'enweghị mmerụahụ ọbụla. Ndị ọrụ FRSC wụchara n'ebe ahụ mgbe ya bụ ihe mere, wee malite ọrụ, iji hụ na e nweghị agbakata akwụrụ n'okporoụzọ ahụ.

Ụfọdụ ndị ntorobịa iwe juru obi malitekwara kpọba ganị-ganị ma na-achọkwa ka ha gbaa ụgbọala Tipa ahụ ọkụ; mana ndị nọ nso n'ebe ahụ tinyere ọnụ wee kpọtuo mmụọ ha.

N'okwu nke ya, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ CC Adeoye Irelewuyi dụrụ ndị na-anyà ụgbọala maọbụ ihe ọbụla a na-anya anya n'okporoụzọ ọdụ, ka ha na-eleru ya anya nke ọma ma gbakwa mbọ hụ na ọ kwụ n'egwú tupu ha eburu ya pụta n'okporoụzọ, maka adịghị ama ama. Ọ dụkwara ha ọdụ ka ha kwụsị ịgba oke ọsọ, maka na ojinwayọ anaghị emerụ ahụ.

Ọ kasiri ezinụlọ ndị ahụ nwụrụ n'ihe mbere okporoụzọ ahụ obi, kpee ka mkpụrụobi ha zuo ike na ndokwa, ma kpekwazie ka ndị nke nwetara mmerụahụ gbakere ma nweta ọgwụgwọ n'oge adịghị anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484