Njem Ụgbọelu Amalitela n'Ozuzuoke n'Ọdụ Ụgbọelu Anambra

Dec 8, 2021 - 19:54
 0
Njem Ụgbọelu Amalitela n'Ozuzuoke n'Ọdụ Ụgbọelu Anambra

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọrụ na njem ụgbọelu nọrọ ụbọchị Tuzdee wee malite n'uju n'ọdụ ụgbọelu steeti Anambra ahụ a rụrụ ọhụrụ n'Ụmụeri, n'okpuruọchịchị ime obodo 'Anambra East', bụ nke a malitere ime site n'ụgbọelu Air Peace, ma bụrụkwa nke ọtụtụ ndị mmadụ sonyere na ya.

Nke a bụ nke malitere ka ọ gachara mkpụrụ abalị olenaole ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka njem ụgbọelu n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ 'Nigerian Civil Aviation Authority (NCAA)' nyèchàrà steeti Anambra ikike na nkwàdo ịmalite ọrụ ibu ndị njem n'ọdụ ụgbọelu ahụ n'abalị asaa nke ọnwa Disemba a.

Ka ya bụ ụbọchị a kara aka ruzịrị, a hụrụ ndị mmadụ ka ha jupụtara n'ọdụ ụgbọelu ahụ, ma ndị na-arụ ọrụ n'ebe ahụ, ndị na-achọ ime njem, ndị bịara ịnabata ndị nke ha ga-esi Abuja na Lagos wee bàta ụbọchị ahụ, tinyere ndị ọzọ bịara iji anya ha gbaa ekeresimeesi.

Oge ọ kụrụ elekere iri na otu nke ụtụtụ kpọnkwem, a malitere ịnabata na inyocha ndị njem chọrọ ịga Abuja ụbọchị ahụ na ngalaba Tamịnal ọdụ ụgbọelu ahụ, nke ọtụtụ n'ime ha bụ ndị gbara akwụkwọ maka ime njem n'usoro ịntanet.

Ụfọdụ n'ime ndị bịara ime njem ụbọchị ahụ, nke gụnyere nwa amadi ahụ na-anọchịte ọgbọ nta nkwàdo Njikọka nke abụọ n'ụlọ omeiwu steeti Anambra, Maazị Pete Ibida; onyeisi mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu, bụ Ọkammụta Greg Nwakoby; onyeisi ọrụ oyibo steeti Anambra n'oge mbụ Chidi Ezeoke.

N'okwu ha n'otu n'otu, ụfọdụ n'ime ndị ahụ mere njem n'ọdụ ụgbọelu ahụ ụbọchị ahụ, Maazị Pete Ibida kọwara aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ dịka nwoke nwere ezi ọhụhụzọ na nwoke na-edebe okwu ya; ebe Ọkammụta Nwakoby kọwara ọdụ ụgbọelu ahụ dịka otu n'ime onyinye kachasị n'ime onyinye niile o nyere na ihe o meere ndị Anambra, ma kọwakwa na ọ bụ nnukwu ihe ịtụnanya na ọchịchị Obianọ rụrụ ya bụ agadaga ọdụ ụgbọelu dị etu ahụ n'ime ihe erughị ahọ abụọ.

Ha gosipụtakwara obiụtọ ha isò na ndị mbụ sigoro n'ọdụ ụgbọelu ahụ mee njem.

N'ajụjụọnụ a gbara ya, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ, bụ Marcel Ifejiofor nyere nkọwa banyere ya bụ ọdụ ụgbọelu, ma kọwapụtakwa ọtụtụ uru dị icheiche ya bụ ọdụ ụgbọelu ga-abara ndị Anambra, ndị Igbo na ala Nigeria n'izugbe, ọkachasị n'ịkwalite ọnọdụ akụnụba na ikewàpụta puku kwuru puku ohere ọrụ.

Na ntụnye nke ha, onyeisi ụlọọrụ 'Anambra State Road Maintenance Agency (ARMA), bụ Injinia Emeka Okoye, na nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ n'ihe gbasaara nchekwa, bụ Maazị Chiejine Obieze gosipụtara obiụtọ ha na ndị Anambra ga na-emezị njem ụgbọelu ugbua n'enweghị mgbakasịahụ ọbụla maọbụ gbaa ogologo ụzọ gaa Enugu maọbụ Asaba maka ịbà ụgbọelu, n'ihi na ha ga na-efelizị n'Anambra ugbua.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484