E Jidela Mmadụ Asatọ Maka Iwakpò Ndị Ọrụ ACTDA Na Nibo

Mar 12, 2021 - 12:13
 0
E Jidela Mmadụ Asatọ Maka Iwakpò Ndị Ọrụ ACTDA Na Nibo

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ụlaga sị na ọ bụrụ na ọ pịaghị ụtarị, ụmụaka anaghị ama na ọ bụ mmanwụ.

N'ịgbasò nke a, ndị ọrụ nchekwa nọrọ na nsonso a wee nwụchie mmadụ asatọ a na-enyo ènyò na ha soro wee wakpò ma tie ndị ọrụ ụlọọrụ 'Awka Capital Territory Development Authority' (ACTDA) ihe oge ha gara ọrụ na Nibo dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Awka South' nke steeti Anambra.

Mmadụ asatọ ahụ ka e kwuru na ha bụcha ụmụnwoke nọ n'agbata ahọ iri abụọ na ahọ iri atọ, ma bụrụ ndị nọrọ n'abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Febụwarị ahọ a wee wakpò ndị ọrụ ACTDA ahụ oge ha gara ime nnyocha na ileta ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ndị ahụ na-arụ ụlọ n'enweghị nkwàdo gọọmentị.

Nnyocha e mere na-egosi na ndị ahụ na onye na-arụ ụlọ ahụ gbara izu ma dị njikere, nke mezịrị na ngwangwa o nwetara ozi na ndị ọrụ gọọmentị na-abịa n'ogige ebe ahụ ọ na-arụ ụlọ, jiri ụgbọala wee buru ndị omekóòmè ahụ ozigbo wee wụchaa n'ebe ahụ, ha wee wakpò ndị ọrụ gọọmentị ahụ bụ ndị ACTDA, wee tie ha ihe ma merụsịa ha ahụ.

Ndị omekóòmè ahụ ka e kwuru na ha mebìkwara ụgbọala ndị ọrụ ACTDA ahụ, ma wekọrọsịa ụfọdụ ihe ha ji arụ ọrụ, were ha gbafuo.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ ACTDA, bụ Maazị Amaechi Okwuosa mere ka a mara na nke a abụghị nke mbụ maọbụ abụọ ha na-ahụta ụdị ihe ahụ, n'ihi na ndị ọrụ ha na-ezutekarị ọtụtụ ihe icheakamgba dị etu ahụ n'ihu ọrụ na mgbe na mgbe site n'aka ndị na-arụ ọrụ ụlọ, ma kwuo na ụlọọrụ ya agaghị ada mba n'ịrụ ọrụ ya etu o kwesiri, na ịnwụchikọ onye ọbụla kpara agwa dị etu ahụ jiri usoro iwu mee ya ihe kwesiri ya.

Dịka ọ na-akọwapụta na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ebe a ga-eji usoro iwu wee nye ha ọnọdụ ruru ha, iji wee kụziere ndị ọzọ na-ezube ime ihe dị etu ahụ na ha nwekwara ntaramahụhụ na-echere ha; Maazị Okwuosa chetaara Ndị Anambra na ndị bi na steeti ahụ na ụlọọrụ ahụ abịaghị imegide ha, kama na ọ bụ maka ọdịmma ha ka e jiri guzobe ya bụ ụlọọrụ, n'ihi ọtụtụ uru dị iche iche ọrụ ha bara.
 
Ọ kpọzịrị òkù ka e nwee ezi njikọaka n'etiti ụlọọrụ ahụ na Ndị Anambra, maka na ọ bụ site n'ụzọ dị etu ahụ ka ha pụrụ isi wee ghọta ma hụtaba ọrụ ha dịka nke magburu onwe ya ma dịkwa oke mkpa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484