Taa, Obianọ Anọọla Ahọ Asaa n'Ọkwa  Dịka Gọvanọ Anambra

Mar 17, 2021 - 11:32
 0
Taa, Obianọ Anọọla Ahọ Asaa n'Ọkwa  Dịka Gọvanọ Anambra

Izunna Okafor dere edemede a

Taa bụ Wenezdee ka ọ mere ahọ asaa kpọmkwem e jiri duo Dọkịta Willie Mmadụabụrọchukwu Obianọ n'iyi ọrụ dịka Gọvanọ steeti Anambra, ma dukwazie Dọkịta Nkem Okeke n'iyi ọrụ dịka osote ya site n'aka Ọkaikpe Peter Umeadi. Mmemme idu n'iyi ọrụ ahụ e mere n'abalị iri na asaa nke ọnwa Maachị ahọ 2014 bụ nke weere ọnọdụ n'ama egwuregwu 'Ekwueme Square' dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ. 

Ka ọ gachara ahọ anọ zuru ezu ha jiri banye n'ọkwa ọchịchị ahụ, Ndị Anambra gosiri na ọchịchị Gọvanọ Obianọ dị ha mma, nke mezịrị ha jiri wee sị ya chịrị gaba n'ihu, site n'ịtụnyekwara ya na osote ya ọzọ na nhọpụta ọkwa Gọvanọ steeti ahụ e mere n'abalị iri na asatọ nke ọnwa Nọvemba ahọ 2017. Ụdị nkwàdó ndị Anambra nyere Gọvanọ Obianọ na nhọpụta ọchịchị ahụ bụ nke dara ụda ma bụrụkwa nke a gaghị echefu echefù, n'ihi na o sitere na ya wee bụrụ gọvanọ mbụ n'ala Nigeria nwetara nturuugo n'ime okpuru ọchịchị niile e nwere na steeti ya.

Ka nke ahụ gachara, a nọkwara n'abalị iri na asaa nke ọnwa Maachị, ahọ 2018 wee duo Gọvanọ Obianọ na osote ya n'ọrụ ọzọ, ịchị àgbà nke abụọ. Ha wee nọsiekwa ike n'oche ha ma na-arụsikwa ọrụ ezi ọchịchị ha ike ruo taa.

Dịka Gọvanọ Obianọ na-emerùbe ọgbụgba ahọ asaa n'ọkwa ọchịchị dịka aka na-achị steeti Anambra, ọ dị mkpa ịkpọpụtasị ụfọdụ ihe olenaole e kwesiri ịma banyere ọchịchị ya na steeti ahụ kemgbe ahọ asaa gara aga.

Ka ọ batara n'ọkwa, Gọvanọ Obianọ weputara ọkpụrụkpụ ide anọ nke ọchịchị ya ga-agbakwasa ụkwụ. Ihe mbụ o mepụtara na steeti Anambra bụ iweta ezi nchekwa site n'ịchụ ndị ohi na ndị ntọrị mmadụ ọsọ ọkpa eru ala na steeti ahụ, iji nye ụmụafọ steeti ahụ na akụnụba ha ezi nchekwa ma mekwa ka ala steeti ahụ bụrụ ala dị larịị maka ndị ga-abịa iwunye akụnụba.

Ihe ọzọ pụrụ iche gọvanọ Obianọ mere bụ itute ngalaba dị iche iche na steeti ahụ. Ka o tutechaara ngalaba ọrụ ugbo na ngalaba ndị ọzọ, ọ dọtara ụlọọrụ 'Coscharis Farm' na steeti ahụ, ha wunye ihe ego dị ndè otu narị dọlà na iri ise ($150m) n'ọrụ ugbo n'Anakụ. Ọ dọtakwara ụlọọrụ 'NOVTEC Farms' Ltd. na steeti ahụ, ha wunye ego dị ndè dọla iri ise ($50m) n'ọrụ ugbo n'obodo Ndikelionwu. 

Ụfọdụ n'ime ọtụtụ ụlọọrụ ndị ọzọ ọ dọtara gụnyere ụlọọrụ 'Joseph Agro Ltd', bụ ndị wunyere ego dị ndè otu narị dọla na iri isii ($160m) n'ọrụ ugbo n'Ọmọr dị n'okpuru ọchịchị Ayamelụm; ụlọọrụ 'Eckel Tomato Farm Ltd.' bụ ndị wunyere ihe mwunye gburu ego ruru narị nde dọla abụọ na ụma iri abụọ ($220) n'ọrụ ugbo n'Ọmasị; tinyere ụlọọrụ 'Songhai/Del farms Ltd.' bụ ndị wunyere ego dị ndè dọla iri ise ($50m) n'ọrụ ugbo n'Ịgbarịam., tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

N'okpuru ndú Gọvanọ Willie Obianọ ka a malitere imepụta osikapa Anambra a na-akpọ 'Anambra Rice' n'asụsụ bekee; màlite ibupu ụgụ na akwụkwọ nri ndị ọzọ na mba ofesi. 

O guzobekwara ụlọọrụ dị iche iche iji kwalite mmepe steeti ahụ, nke gụnyere ụlọọrụ 'Anambra State Business Agency' (ASBA); ụlọọrụ 'Anambra State Investment Protection and Promotion Agency' (ANSIPPA) maka ichekwabe ndị na-abịa ewunye akụnụba ha na steeti ahụ; ụlọọrụ 'Awka Capital Territory Development Authority' (ACTDA) maka iji mee ka Awka bụ isi obodo steeti Anambra magbuo onwe ya. 

Ọ rụkwara nnukwu àkwà atọ n'Awka, bụ ebe ụgbọala na-agba n'elu, n'agba n'ala dịka ọ dị taa; la tinyesiekwa ọkụ n'okporo ụzọ dị iche iche.

Obianọ bụ gọvanọ mbụ nyere obodo niile dị na steeti ya ego n'otu n'otu ka ha wee họrọ ma rụọ ihe masịrị ha. Ọ rụọla ma dozie okporoụzọ karịrị narị abụọ n'ọnụọgụgụ. O mere ka ngalaba mmụta bụrụ ịgbà na steeti Anambra, nke mezịrị ka ụmụakwụkwọ steeti ahụ na-eturu ugo n'ule na asọmpi dị iche iche a na-eme n'ala Nigeria na mba ofesi.

O nwògharịrị ma mee ka ngalaba ahụike na steeti Anambra bụrụ eji ama atụ. N'ebe ndị ọrụ oyibo nọ, o buliri ụgwọ ọnwa ndị ọrụ ha site n'ịtụkwasara ha pasenti iri na ise; na-akwụ ha ụgwọ ọnwa n'oge, ma na-ebunyekwa ha àkpà osikapa iji gbaa ekeresimeesi kwà ọnwa Disemba ọbụla. Ọ bụ etu o si akwụ ndị ọyibo ụgwọ ọnwa n'oge mere ha jiri nye ya aha ọhụrụ dịka 'Alert Gọvanọ'.

Obianọ bụ gọvanọ kwụchapụrụ ụgwọ niile e ji ha ndị niile lara ezumike nka n'ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ National Light na n'ụlọ mgbasa ozi Anambra Broadcasting Service, kwàlite ma nwogharịa ụlọọrụ abụọ ahụ ka ha dị n'ogoogo mba ụwa.

Ọ kwalitela ọnụ ego a na-enweta n'ime steeti Anambra. Ọ zụọla ndị ntorobịa karịrị puku abụọ n'ọrụ aka ma nye ha ego nkwàdo. Ọ bụ gọvanọ mbụ mere ka ọkànọnụọgụgụ ndị ọrụ ya bụrụ ndị ntorobịa n'ala Nigeria; ma bụrụ gọvanọ mbụ kachara nye ndị ọrụsị na ụmụnwaanyị ohere ọrụ dị oke elu n'ọchịchị ya. O tutela ngalaba njem nlegharị anya na steeti Anambra, tinyeziere ọtụtụ ihe ndị ọzọ niile o mere. 

K ọ dị taa, Gọvanọ Obianọ na-arụ ọdụ ụgbọelu na steeti Anambra, na-arụ ụlọ ezumeezu mba ụwa na steeti ahụ, tinyere ọtụtụ nnukwu ọrụ ngo ndị ọzọ o ji n'aka na mpaghara ebe dị iche iche n'ime steeti ahụ.

Ihe kachasị pụta ìhè n'ihe ndị a bụ na Obianọ bụ Gọvanọ mbụ rụrụ n'obodo niile dị na steeti; nke bụ na ikuku ezi ọchịchị ya ekusala ma onye ukwu, ma onye ntà; Ndị Anambra wee na-agbazị akaebe ma na-egorikwa taa, dịka steeti ahụ na-amụkezịkwa ka ọnwa.

Ọ bụ olileanya ndị Anambra na Gọvanọ Obianọ ga-aga n'ihu n'ezi ọrụ ahụ o ji n'aka na steeti ma rụruo ya n'isi, tupu ọchịchị ya akụrụ ọnụ. Ọ bụkwazị olileanya na ekpere ndị Anambra na Chineke ga-eji aka ya wee họpụta ezi onye nnọchianya site na nhọpụta ahụ a ga-eme n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a, ka Anambra wee na-agawanye n'ihu, ma na-amụke dịka ihe nke ala Nigeria ọ bụ, ọbụladị ma mgbe oge ọkwa ọchịchị nọ ugbua kụụrụ ọnụ n'ụbọchị dịka taa n'ahọ na-abịa abịa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484