Ndị Uweojii Anambra Anwụchiela Mmadụ Isii Maka Ohi

Apr 8, 2021 - 11:54
 0
Ndị Uweojii Anambra Anwụchiela Mmadụ Isii Maka Ohi

Izunna Okafor dere akụkọ a

N'iwelitekwu aka n'agha ahụ a na-ebu megide ndị omekoome nà ọnọdụ enweghị nchekwa ahụ a na-ahụtazị na mpaghara ebe dị iche iche ugbua, ndị uweojii n'ime steeti Anambra anwụchikọọla mmadụ isii a na-enyo ènyò na ha bụ ndị ohi n'ime steeti ahụ.

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ DSP Ikenga Toochukwu mere ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ na steeti ahụ.

O mere ka a mara na ndị ahụ bụ ndị a nwụchikọrọ site na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ, ma bụrụkwa ndị a na-enyo enyo na ha na-etinyekwa aka n'òtù nzuzo ma nwekwa égbè na ụfọdụ ngwaọgụ ndị ọzọ n'ụzọ iwu akwadòghị.

Ọ gara n'ihu kọwaa na ọ bụ n'abalị anọ nke ọnwa Epure a ka ndị uweojii nọ na mpaghara Ihiala nọrọ wee nwụchikọọ Maazị Chike Obi (gbara ahọ iri abụọ na asatọ, ma bụrụkwa onye obodo Umudubiri Uzoakwa, dị n'Ihiala), ya na Maazị Okosis Udeagu (gbara ahọ iri abụọ na atọ, ma bụrụkwa onye Uhuobo Okija.). O mere ka a mara na e nwetara otu égbè na mgbọ égbè abụọ n'aka ndị ahụ, ma kwukwa na mmadụ abụọ ahụ ejirila ọnụ ha sàá asịsà na ha bụ ndị òtu nzuzo dị oke égwù.

N'akụkọ dịkwa ka ibe ya, oge ndị uweojii nwetechara mkpesa banyere 'Lexus 330 SUV' e zuuru n'ebe a na-asa ụgbọala, ya na etu onye na-asa ụgbọala ebe ahụ siri rie mbọmbọ; ha malitere mebe nnyòcha ozigbo banyere nke ahụ. N'ime nnyocha ahụ, ha bụ ndị uweojii nwụchikọrọ mmadụ abụọ a na-enyo ènyò na aka ha dị n'ụgbọala ahụ e zuru ezu, nke gụnyere Maazị Pius Aidam (bụ onye bi n'Omogba phase 2 dị n'Ọnịtsha), na Maazị Effiong Udeme Elder (nkè Uyo dị na steeti Akwa Ibom. 
Ha nwetakwara ụgbọala ahụ n'aka ndị ahụ, ma gbakwa ha ajụjụọnụ, bụ nke ha sitere na ya wee jiri ọnụ ha sàá asịsà na ọ bụ ha zuru ụgbọala ahụ n'eziokwu ma buru ya gaa Akwa Ibom.

N'aka nke ọzọ, dịka e nwetekarịara mkpesa banyere etu ọgbatumtum Keke Napep ndị mmadụ si efù n'ebe a na-adọba ha na mpaghara Boromeo dị n'Ọnịtsha, ndị uweojii nwụchikọrọ Isienyi Joshua (gbara ahọ iri abụọ na abụọ), na Chinemere Emenike (gbara ahọ iri na iteghete) ma nwetekwa Keke abụọ e zuru ezu n'aka ha. Mmadụ abụọ ahụ jikwara ọnụ ha kwuo na ha bụ ndị òtù ohi pụrụ iche na-ezu Keke Napep na mpaghara Ọnịtsha na gburugburu ya.

DSP Toochukwu gakwazịrị n'ihu kọwaa na ha ka na-agbasikwa mbọ ike iji nwụchikọọ ndị òtù ohi ahụ ndị nke nọ n'ọsọ ugbua ma napụtasịkwa ha ihe dị iche iche ha ji akpa ike; ọbụladị dịka o kwukwazịrị na a ga-akpụpụ ndị ahụ niile e jidere ụlọikpe ma ọ bụrụ na e mechaa nnyòcha.

Onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP Monday Kuryas kwere Ndị Anambra nkwà na ụlọọrụ ya ga-aga n'ihu inye ha ezi ọnọdụ nchekwa bụ ịgba; ọbụladị dịka ọ rịọkwazịrị ha ka ha gaa n'ihu inye ndị uweojii nkwàdo zuru òkè iji rụọ ọrụ ha nke ọma na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484