Òtù Atọ Emerùbela Mmemme Ụbọchị Ọrịa Kansà n'Onitsha

Feb 9, 2022 - 21:00
 0
Òtù Atọ Emerùbela Mmemme Ụbọchị Ọrịa Kansà n'Onitsha

Izunna Okafor dere akụkọ a

Òtù nnọrọonwe atọ, bụ òtù ‘Justice Development and Peace Commission (JDPC)’ ngalaba Onitsha; òtù ‘Development Initiative for Technology and Empowerment (DITEm)’, nà òtù ‘Pink Health Foundation’ emeela ụmụnwaanyị ruru iri ise na anọ nnyòcha ahụike n'efù, dịka otu n'ime mmemme dị icheiche ha ji wee merùbe mmemme ụbọchị ọrịa kansa na mba ụwa (World Cancer Day), nke ahọ 2022.

Mmemme ahụ, nke isiokwu ya bụ ‘Mechie Ohere Nlekọta Ahụ’ (#CloseTheCareGap), bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọụka ‘St. Jude Parish, Fegge, Onitsha’ dị na steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dọtara ụmụnwaanyị karịrị otu narị na iri ise n'ọnụọgụgụ.

N'okwu ya na mmemme ahụ, otu onye n'ime ndị so wee kwàdó ma hazie ya bụ ọgbakọ ma bụrụkwa onye hibere òtù ‘Development Initiative for Technology and Empowerment (DITEm)’, bụ Dọkịta Ngozi Perpetua Osuchukwu kọwàrà na ebumnobi mmemme ahụ bụ iji gbasàá ozi ma kụziere ndị mmadụ ihe ha kwesiri ịma banyere ọrịa kansà, ya na usoro kacha mma a pụrụ isi gbochie ya.

Ka ọ na-ekèle ndị ha na ya jìkọrọ aka ọnụ wee hazie mmemme ahụ màkà ịhụta ezi mkpa ọ dị ime nke ahụ; Dọkịta Osuchukwu, onye bụkwa onye ọrụ oba akwụkwọ, kèlèkwàrà ndị sonyere nà mmemme ahụ (nke ọtụtụ n'ime ha bụcha ụmụnwaanyị) maka iwepụta oge ha wee sonye na ya bụ ọmarịcha ọgbakọ. O chetàkwàzịịrị ha mkpà ọ dị ka ha na-enyocha ahụ ha oge niile, n'ihi na ịchọpụta ọrịa n'oge na-enye aka ime ka mgbochi na ọgwụgwọ ya dị mfe.

Na mbụ oge ọ na-anabata ndị bịara mmemme ahụ, onyeisi òtù JDPC n'Onitsha, bụ ‘Rev. Fr. Dr.' Edwin Udoye nke ụlọụka ‘St. Jude Parish’ Fegge Onitsha, onye wepụtara ohere ebe a nọrọ wee mee ya bụ mmemme, kọwàrà ya bụ ọgbakọ̀ dịka nke magburu onwe ya, ma kwupụtakwazie olileanya o nwere na nke ahụ ga-amị̀ta ezi mkpụrụ n'ibelata ọrịa kansà.

N'okwu mmalite ya, onye ji ọkwa 'Program Officer' nke JDPC Onitsha, bụ Maazị Nwaekeagu Shadrach nyèrè nkọwa banyere ụbọchị ọrịa kansa, ma dụọ ndị niile bịara mmemme ahụ ọdụ ka ha jisie ike na-apụta apụta ma na-esònyesikwa ike n'ụdị ọmarịcha mmemme dị etu ahụ n'ihi ọtụtụ uru dị icheiche dị na ya, ọkachasị dịka o siri metụta ọnọdụ ahụike ha.

Na nkụzi ha n'otu n'otu, Dọkịta Ada Williams, Dọkịta Okoye Oluebube Alphonsus, na 'Pharm.' Umeh Ifeoma Blessing nke òtù ‘Pink Health Foundation’, nyèrè nkuzi doro anya banyere ụdị ọrịa kansa dịgasị icheiche, ihe e ji ama ha, etu e si achọpụta ha, nàkwà usoro kacha mma a pụrụ isi gbòchie ha. Ha dụkwàzịrị ụmụnwaanyị ahụ ọdụ ka ha na-enyòcha ahụ ha oge niile.

Na ntụnye nke ya, otu onye n'ime ndị sonyere na mmemme ahụ, bụ Oriakụ Cynthia Enwonwu-Arinze kèlèrè ndị chịkọbàrà ọmarịcha ọgbakọ ahụ maka ohere ọma ahụ, ma dụ̀kwazie ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ ọdụ ka ha gbaa mbọ tinye ihe niile a kụziiri ha ebe ahụ n'ọrụ ma na-emekwa ya oge niile, maka na mgbochi ọrịa ka ọgwụgwọ ya mma.

Inyòcha ụmụnwaanyị karịrị iri ise na atọ n'ọnụọgụgụ àhụ́ n'éfù maka ọrịa kansa, ajụjụ na azịzá, nàkwà mmadụ ịkọwapụta ihe ọ mà banyere ọrịa kansà sò n'ihe ndị mere ka mmemme ahụ dàá ụda ụbọchị ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484