N'Anambra, Mmadụ Atọ Anwụọla n'Ihe Mberede Okporoụzọ

Feb 8, 2022 - 20:04
 0
N'Anambra, Mmadụ Atọ Anwụọla n'Ihe Mberede Okporoụzọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ozi si n'aka ụlọọrụ na-ahụ maka njem awele okporoụzọ n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC)', ngalaba steeti Anambra na-akọwa na mmadụ atọ anwụọla, ebe mmadụ atọ ndị ọzọ nwetara mmerụahụ n'ihe mberede okporoụzọ dapụtara na steeti ahụ na nsonso a.

Onye jigodi ọkwa ugbua dịka onye na-ahụ maka mgbasaozi nà ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma n'ụlọọrụ FRSC n'ime steeti ahụ, bụ DRC Margaret B. Onabe bụ ya mere ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụ̀ụ̀rụ̀ ndị ntaakụkọ na nsonso a n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Dịka o siri kọwaa, ya bụ ihe mberede okporoụzọ dapụtàrà na ncherịtaihu ugbo ‘Austin Farm’ dị na mpaghara okporoụzọ awara-awara ahụ siri Ayamelum gaa Onitsha.

O kwuru na ihe mberede ahụ metụtàrà mmadụ isii (bụcha ụmụnwoke), otu ụgbọala ‘Toyota Sienna’ ọcha (nwere ákàrà ABN504SZ) na otu ọgbatumtum.

O kwukwàrà nà ndị ọnọmgbeomere kọwàrà na ihe mberede ahụ mèrè n'oge ehihie, ma bụrụkwa nke dapụtàrà n'ihi ịgba oke ọsọ nke onye ọkwọ ụgbọala ahụ.

Ọ kọwàrà na ọkwọ ụgbọala Sienna ahụ nọ n'óké ọsọ, ma mgbe ọ hụrụ ọgbatumtum na-abịa n'ihu, o ji ọsọ ahụ chọọ ka o zèéré ya, o wee jirikwazie ọsọ ahụ suo ọgbatumtum nke ọzọ nọ n'azụ ya, wee jiri ọsọ makpuo ime ọhịa.

O kwùkwàrà na ụmụnwoke atọ nwụrụ ozigbo ahụ ihe ahụ mèrè, ebe mmadụ atọ ndị ọzọ (bụcha ụmụnwoke) nwetere mmerụahụ, ma bụrụkwa ndị e bùùrù gaa ụlọ ahụike sị nso n'ebe ahụ, bụ ebe dọkịta nọ n'ọrụ nọ̀rọ̀ wee gbaa akaebe na mmadụ atọ ndị ọzọ ahụ anwụọla. O kwùrù na a donyezị̀kwàrà ozu mmadụ atọ ahụ n'ụlọ nchekwa ozu dị n'ụlọọgwụ ahụ. 

N'okwu nke ya, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ CC Adeoye Irelewuyi dụrụ ndị na-anya ụgbọala maọbụ ihe ọbụla a na-anya ànyaà n'okporoụzọ ọdụ, ka ha akpachapụ anya, zèéré ịgba oke ọsọ. Ọ dụkwara ha ka ha na-erube isi nye iwu na-achị okporoụzọ.

Ọ kasiri ezinụlọ ezinụlọ ndị nke ha nwụrụ n'ihe mbere okporoụzọ ahụ obi, kpee ka mkpụrụobi ha zuo ike na ndokwa, ma kpekwazie ka ndị nke nwetara mmerụahụ gbakere ma nweta ọgwụgwọ n'oge adịghị anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484