NSCDC na NICO Ejikọọla Aka Ịkụziri Ndị Ọrụ Ha Asụsụ Ọdịnala

Feb 10, 2022 - 10:34
 0
NSCDC na NICO Ejikọọla Aka Ịkụziri Ndị Ọrụ Ha Asụsụ Ọdịnala


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụlọọrụ ‘National Institute for Cultural Orientation (NICO)’ amalitela ịkụziri ndị ọrụ nchekwa ‘Nigeria Security and Civil Defence Corps (NSCDC)’ asụsụ Igbo na asụsụ ọdịnala ndị ọzọ dị icheiche dị n'ala Nigeria, nke gụnyere asụsụ Hausa na asụsụ Yoruba.

N'okwu ya oge ọ na-agbape atụmatụ nkuzi ahụ n'Abuja ụbọchị Tuzdee, onyeisi ụlọọrụ NSCDC n'ala Nigeria, bụ CG Ahmed Abubakar Audi, PhD, mni, kọwàrà nke ahụ dịka otu n'ime ụzọ isi kwàlite arụmọrụ ndị ọrụ nchekwa ahụ, ya na mmekọrịta ha na nkwukọrịtaokwu ha na ndị bi n'ime-ime obodo dị icheiche na mpaghara ebe ọbụla e zigara ha ịrụ ọrụ.

Ọ kọwàkwara nkụzi asụsụ ọdịnala ahụ dịka ihe dị oke mkpa ma bàkwa oke úrù n'ịkwàlite nnweta nà mgbasaozi n'etiti ndị ọrụ nchekwa ahụ na ndị obodo, iji rụọ nnukwu ọrụ ahụ chere ha n'ihu nke ọma.

O mere ka a mara na ozi nà inweta ozi kwesiri ékwesi n'ogè dị̀ mkpà nke ukwuu n'ọrụ nchekwa, ma mekwa ka a mara na oge ụfọdụ, aghọtaghị maọbụ amaghị asụsụ ọdịnala nà-àbụ ihe ogbochi maọbụ ihe ndọghachiazụ n'ebe ọrụ nchekwa dị, n'ihi na ọ bụghị mmadụ niile mà ka e si asụ maọbụ ede asụsụ bekee, ọkachasị dịka e si ahụta n'ụfọdụ ime-ime obodo dị icheiche.

Ọ kpọpụtasịkwàrà ụfọdụ ọrụ ndị ọzọ NSCDC na-arụ mà e wezùga nchekwa kpọnkwem, nke gụnyere inye ndị mmadụ maọbụ ụfọdụ ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ọzụzụ, ikpe udo n'ebe e nwere ọgbaaghara, tinyere ụfọdụ ọrụ ndị ọzọ, ma kọwaa na ihe ndị ahụ mere ka ọ dị mkpà na ndị ọrụ ahụ mara na-asụ, opakata mpe, asụsụ ọdịnala atọ kacha n'ala Nigeria, nke bụ Igbo, Hausa na Yoruba, maka na o nweghị onye ma ebe a ga-ezìga ya ọrụ echi.

Ọ kọwàrà na ọchịchị ya dịka onyeisi ụlọọrụ ahụ ga-aga n'ihu inye ndị ọrụ ya ọzụzụ na mgbe na mgbe, iji kwalite arụmọrụ ha n'ichekwa ndụ na akụnụba, ma gakwa n'ihu n'ịkwàlite omenala na akparamagwa ga-eme ka ha bụrụ ụlọọrụ nchekwa ejiamaatụ n'ogoogo mba ụwa.

N'okwu nke ya na mmemme ahụ, onyeisi ụlọọrụ NICO, bụ Maazị Ado Muhammed Yahuza gbàrà akaebe na asụsụ ọdịnala dị icheiche n'ala Nigeria na-anwụzị n'ike n'ike ugbua, ma kọwaa ya dịka ihe jọgburu onwe ya, n'ihi na nke ahụ bụ nnukwu ihe iche aka mgba, nke nwere ike ime ka asụsụ ọdịnala ndị ahụ fuo kpamkpam, ma ọ bụrụ na e meghị ihe e kwesiri ime n'oge.

O mere ka a mara na asụsụ ọdịnala bụ ezigbo ngwaọrụ ma sokwa n'ihe kacha enye aka n'ịkwàlite ezi mmekọrịta na ịdịnotu n'etiti mmadụ na ibe ya nà n'etiti agbụrụ dị icheiche, ọbụladị dịka o kwupụtakwazịrị olileanya o nwere na atụmatụ ahụ ha bàgidèrè na ya ọhụrụ ga-amị̀ta mkpụrụ a tụrụ anya ma nyekwa aka n'ime ka asụsụ ọdịnala obodo dị icheiche n'ala Nigeria guzosie ike.
 
O kwukwazịrị na ụlọọrụ ya, nke nwere ngalaba iri na atọ na mpaghara ebe dị icheiche n'ala Nigeria dị ezi njikere ịrụ ọrụ nkụzi ahụ nke ọma, ma dịkwa njikere ijikọ aka ọnụ, ha na ụlọọrụ dị icheiche nwere mmasị n'ihe ha na-eme, ọkachasị dịka o siri metụta ịkwàlite asụsụ ọdịnala na omenala obodo dị icheiche n'ala Nigeria.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484