Ihe Mberede Okporoụzọ: Mmadụ Iri Na Asaa Aghọrịala Ọnwụ n'Anambra

Mar 26, 2021 - 22:59
 0
Ihe Mberede Okporoụzọ: Mmadụ Iri Na Asaa Aghọrịala Ọnwụ n'Anambra
Ihe Mberede Okporoụzọ: Mmadụ Iri Na Asaa Aghọrịala Ọnwụ n'Anambra
Ihe Mberede Okporoụzọ: Mmadụ Iri Na Asaa Aghọrịala Ọnwụ n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Opekatampe, mmadụ iri na asaa gbanahịrị ọnwụ ike na nsonso a, dịka ihe mberede okporoụzọ abụọ dapụtara na mpaghara ebe dị iche iche na n'ime steeti Anambra.

Otu n'ime ihe mberede okporoụzọ ahụ bụ nke dapụtara n'akụkụ ọdụ mmanụ ụgbọala 'Seahorse Lubricant Ltd' dị n'Ozubulu, n'okpuru ọchịchị ime obodo Ekwusigo, ma bụrụkwa nke dapụtara n'etiti ụgbọala 'Nissan Carvan Bus' (nwere ákàrà NSH517YG) e ji ebu ndị njem nke ụlọọrụ 'Goodness and Mercy Transport', ya na nnukwu ụgbọala gwongworo 'Mack Truck' (nwere akara GGU83XA).

Dịka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ụlọọrụ FRSC n'ime steeti Anambra, bụ SRC Florence Edor siri kọwaa, ya bụ ihe mberede okporoụzọ metụtara mmadụ asaa nọ n'ime ụgbọala abụọ ahụ oge ahụ, nke gụnyere ụmụnwoke atọ na ụmụnwaanyị anọ).

O kwuru na ihe mberede okporoụzọ ahụ dapụtara oge ụgbọala bọọsụ ahụ jiri ọsọ wee dànyere nnukwu ụgbọala gwongworo ahụ n'iké, oge ọ na-achọ ka ọ gbafere ya, nke ahụ wee wètazie nnukwu ihe mberede okporoụzọ chọrọ ịta isi mmadụ.

SRC Edor gara n'ihu mee ka a mara na mmadụ asaa niile ahụ nọ n'ime ụgbọala abụọ ahụ oge ahụ nwetachara ihe mmerụahụ okporoụzọ n'ogoogo dị iche iche, ma bụrụkwazie ndị e buuru gaa ụlọọgwụ Obijackson dị n'Okija na ụlọọgwụ 'Our Lady of Lourdes' dịkwa n'Ọkịja ahụ, maka inye ha ọgwụgwọ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ CC Andrew Kumapayi dọrọ ndị na-anya ụgbọala aka na ntị ka ha kwụsị isi n'usoro ekwesighị ekwesi wee na-agbafere ụgbọala ibe ha, maọbụkwanụ ime nke ahụ n'oge ekwesighị ekwesi. O kpekwazịrị ka ndị ahụ nwetara mmerụahụ gbakere ma nwere onwe ha oge adịghị anya.


N'akụkọ ọzọ dịkwa ka ibe ya, mmadụ iri nọkwara na nsonso a ghọrịa ọnwụ, dịka ihe mberede okporoụzọ dapụtara na mpaghara njikọ ụzọ Enugwu-Agịdị nke okporoụzọ ahụ siri Enugu gaa Ọnịtsha, n'ime steeti Anambra.

Ya bụ ọdachi bụ nke dapụtara oge ụgbọala Toyota Corolla (nwere akàrà FK 141 ODK) jiri ọsọ wee suo ihe a rụnyere n'okporo ụzọ a maara dịka 'Access Road Island', ma sukwa ụgbọala ọzọ bụ 'Toyota Highlander' oji (nwere ákàrà UMZ 253 MX) oge Highlander na-achọ iji ọsọ gbafere ya, nke mezịrị ka ha bụ ụgbọala nwezie ọtụtụ mmebi n'akụkụ ha dị iche iche.

N'okwu ha n'otu n'otu, ụfọdụ ndị ọnọmgbeomere, nke gụnyere Maazị Celestine Okafor, na Onyedịkachi Okoye kpọrọ òkù ka e lebà anya n'ebe ahụ ya bụ ihe mberede okporoụzọ dapụtara, bụ 'Access Road Island' n'ihi na ihe mberede okporoụzọ na-adapụtakarị na mpaghara ebe ahụ. 

Ndị na-anyà ụgbọala abụọ ahụ nwere ya bụ ihe mberede okporoụzọ, bụ Maazị Okezie Elibe na Maazị Emeka Nwachukwu kọwara na ọ bụ ihe ahụ a rụnyere ebe ahụ kpatara ya bụ ihe mberede jiri dapụta. Ka o sila dị, kelere Chineke na o nweghị onye ọbụla tụfuru ndụ ya n'ihe mberede ahụ.

N'ajụjụọnụ a gbara ya na Nawfia banyere ihe ahụ ha rụnyere n'okporoụzọ ahụ, otu onye sitere ngalaba ụlọọrụ ji ọrụ ngo okporoụzọ ahụ, mere ka a mara ihe mberede ahụ na ụdị ndị ọzọ yiri ya na-adpụtakarị ma ọ bụrụ na e tinyeghị akàrà dị iche iche kwesiri ekwesi n'okporoụzọ.

O mekwazịrị ka a mara na ọ bụ n'ihi etu ndị mmadụ si acha ha ọkụ mere ha jiri wee mepee ya bụ ụzọ ka ndị mmadụ wee malite ịgba na ya n'ebughị ụzọ rụchaa ya kpamkpam ma tinyesie ákàrà na ụfọdụ ihe ndị ọzọ e kwesiri itinye na ya tupu a ụgbọala amalite gbaba na ya .

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484