E Jidela Nwa Ahọ Iri Na Atọ Na-Ezu Ohi n'Awka

Feb 27, 2019 - 22:43
Jan 21, 2021 - 22:44
 0
E Jidela Nwa Ahọ Iri Na Atọ Na-Ezu Ohi n'Awka

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Dịka a sị na ọ na-abụ e kwòghị ìrùrò na gboo, ọ ghọọ ajọ ọhịa, a nwụchikọọla otu nwata nwoke gbara ahọ iri na atọ na-ezu ohi n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra. Nwata nwoke ahụ, onye aha ya bụ Ekene Chukwuchebe bụ onye e jidere na ncherịta iru ụlọ ụka Winners Chapel dị na mpaghara okporo ụzọ Ọby Okoli n'Ọkpụnọ.

Dịka akụkọ siri kọọ, ya bụ nwata ka e kwuru na ya na ndị òtù ya ji igwe na akụrụngwa dị iche iche wee na-akpàkasị otu ọnụ ụlọ ahịa dị na ncherịta ihu ụlọ ụka ahụ, wee ruo mgbe ndị ọrụ nchekwa na-eche ya bụ ụlọ ụka pụtara wee nwụchikọọ ya, ebe ndị ọzọ ya na ha riri mbọ mbọ ọsọ.

N'ajụjụ ọnụ a gbara ya, nwa amadi ahụ, bụ onye kwuru na ọ nọ n'ogo nke atọ nke kọleeji ya n'ụlọ akwụkwọ 'Capital City Secondary School' kwètara na ya na ndị òtù ya kụrụ ya bụ akụmakụ n'ezie, ma kwuo na ọ bụ ezie na ha ebughị ụzọ gwa ya na ọ bụ ohi ka ha na-abịa n'ebe ahụ. O mere ka amara ọ bụ nwanne ya nwoke, bụ maazị Eze Chukwuchebe na ndị ọzọ ya na ha sòrò wee bịa ya bụ 'ọrụ' dubàrà ya n'ọnọdụ ahụ, bụ nke o kwuru na ya adanyebeghị na ya kemgbe o jiri bụrụ mmadụ.

N'okwu nke ya, onye nwe ọnụ ụlọ ahịa ebe a bịara ya bụ ohi, bụ maazị Samuel Ọdụmegwu kwuru na o teele mgbe e jiri zube ya ohi n'ebe ahụ, ma kọọ akụkọ bànyere ihe dị iche iche ọ gabigarala n'aka ndị omekome ahụ kemgbe o jiri malite rebe ahịa ebe ahụ.

Ya bụ nwoke, bụ onye na-ere ọgwụ, ihe nwa, mmanya, ude, ihe oriri nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka, sịrị na o teela ya jiri kpebe ekpere ka a nwụchikọọ ndị ahụ, bụ ndị o kwuru na ha na-abịa akpakasị ọnụ ụlọ ahịa ya oge ọbụla, wee ruo ugbu aka kpaara ya bụ ezeku udele.

Na ntụnye nke ya, otu nwa amadi nọ ebe e jidere ya bụ nwata, bụ maazị Ikechukwu Ọffọr kwuru na o teela ya na ndị òtù ya siri zube ohi, ma nọrọkwa ebe gbaa n'anwụ onyonyoo dị iche iche na-egosi ebe ụfọdụ e jidegoro ya bụ nwata na ndị otu ya n'ohi n'oge gara aga, bụ ebe e setere ha na ihe dị iche iche ha zutere n'ohi.

Otu ọ dị, a hafeela nwata ahụ n'aka ndị uwe ojii steeti ahụ iji wee mee nnyocha miri emi, nwụchikọọ ndị ọzọ, ma kpụpụkwa ha ụlọ ikpe.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.