Oke Ọñụ Adaa Dịka Ndị Ụmụoji Mèrè Emume Ụzọiyi

Mar 25, 2020 - 22:01
Jan 22, 2021 - 21:49
 0
Oke Ọñụ Adaa Dịka Ndị Ụmụoji Mèrè Emume Ụzọiyi

Izunna Okafor, Awka

Ọ kpọtụrụ akpọtụ na nso nso a, dịka ndị obodo Ụmụoji, dị n'okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti Anambra merùbèrè emume otu emume na-ewu èwù e jiri mara obodo ahụ, bụ emume Ụzọiyi.

Oke mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ama egwuregwu 'Ụmụoji Sports Stadium' ma bụrụkwa nke dọtara Kọmishọna na-ahụ maka ihe e ji aka emepụta, ihe na-eme na mba ofesi, omenala na njèm nlegharị anya, bụ Oriakụ Sally Mbanefo; ògbò ya na-ahụ maka ahịa na azụmahịa n'ime steeti ahụ, bụ Maazị Uchenna Okafor; tinyere ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba ìzù.

Ka ọ na-ekwu okwu na mmemme ahụ, Oriakụ Mbanefo, nke ọ bụ odeakwụkwọ ọkpụtọrọkpụ na minịstịrị ahụ bụ Maazị Emmanuel Ume nọchitere anya, kọwàrà mkpa ọ dị obodo ọbụla ịkwàdo na ichekwaba omenala dị iche iche e jiri mara ha na ndị Igbo n'izugbe.

O kwupụtakwàrà ezi njikere gọọmenti steeti ahụ dị ijikọ aka ọnụ, ha na obodo dị iche iche, iji mezùpụta nke ahụ, n'ihi ọtụtụ uru ọ ga-eweta, nakwa etu nke ahụ pụrụ isi nye aka n'ịkwàlite ọnụ ego a na-enweta n'ime steeti ahụ.

Na mbụ n'okwu ya, onye nọgodi dịka eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Maazị Christopher Nnedu kọwara mmemme ahụ dịbara gboo, kwuo na ọ bụ nke ha si na ya na-ekele Chineke maka owuwe ihe ubi ahọ gara aga, na-arịọ ngọzị maka ahọ ọrụ na-abịa abịa, ọbụnadị dịka ha sikwa na ya akwàlite ịma mma nke ọnatarachi na omenala obodo ahụ na ndị Igbo n'izugbe.

Ọ mere ka a mara o nweghị ihe ikpere arụsị maọbụ ihe ọbụla rụrụ arụ dịị na ya bụ emume, ma kpọkukwazie onye ọbụla ka o tinye aka n'ịkwalite omenala e jiri mara ha, maka na omenala bụ ọbara na-ehù n'agbụrụ n'agbụrụ.

Onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Silas Ọnyịma kèlere aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ọrụ mmepe dị iche iche o ji n'aka n'ime steeti ahụ, nakwa ọrụ mmepe ya n'ime obodo dị iche iche, bụ nke ọbodo ahụ ritègòkwara ọtụtụ uru na ya, ma dụọ ya ka o jide ka o ji.

A nọrọ na mmemme ahụ nke ahọ a gbaa egwu ọdịnala dị iche iche, ma meekwa ọtụtụ ihe ngosi, ọ kachasị nke e mere site n'aka mmọnwụ dị iche iche na-emegasị ka anụmaanụ, sitere ógbè iri abụọ na atọ dị n'obodo, nke gụnyere mmọnwụ enyi a màrà dịka 'Enyi Abidi', Ùgò, na ndị ọzọ; tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị iche iche mere ka mmemme ahụ zaa aha akpọrọ ya.

Ọ bụkwa ihe dị mma nkwupụta na ndị obodo ahụ gbasòkwara ntụziaka gọọmenti nyere bànyere ibelata mgbasawanye ọrịa Nje Kòrónà (Covid-19) ogogo oge niile nke mmemme ahụ, dịka a hụrụ ndị ọrụ ahụ ike na gburugburu ebe ahụ niile, ka ha na-agbasa onye ọbụla bịara ya bụ mmemme ihe e ji akwọcha aka, bụ 'hand sanitizer' tupuu ọ baa n'ebe ahụ ya bụ mmemme wèèrè ọnọdụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.