Ọkụ Agbarikọọla Ahịa Akụrụngwa E Ji Arụ Ụlọ n'Ogidi

Mar 11, 2020 - 23:36
Jan 22, 2021 - 21:56
 0
Ọkụ Agbarikọọla Ahịa Akụrụngwa E Ji Arụ Ụlọ n'Ogidi

Izunna Okafor, Awka

Anyammiri gbara nnọọ ka iju mmiri n'ụtụtụ ụbọchị Wenezịdee dịka ọkụ ọnụ ụtụtụ dabìdòrò ma gbarikọọ ahịa ahụ na-ewu èwù a na-ere akụrụngwa e ji arụ ụlọ na ya dị n'Ogidi dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Idemili North nke steeti Anambra.

Ya bụ ajọ ọkụ ọgbụgba, dịka onyeisi ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ na steeti ahụ, bụ Maazị Martin Agbili siri kọwaa, bụ nke malitere n'elekere anọ nke ọnụ ụtụtụ, dịka ozi ha nwetara siri kọwaa, nke mezịrị o jiri duru ndị òtù ọrụ ya wee gaba n'ebe ahụ ozigbo ozigbo.

Ọ sị na a na-atụ anya na ya bụ ọkụ sitere n'ótù nnukwu ụgbọala a kwụbàrà n'ime ọdụ ahịa ahụ, ma bụrụkwa nke ndị otu ọrụ ya nọ n'Ọnịtsha na ndị nọ n'Awka jikọrọ aka ọnụ wee buso agha n'ụtụtụ ahụ.

O mere ka a mara na ha amabèghị maọbụ chọpụta ihe a dọnyesiri n'ime nnukwu ụgbọala ahụ e ji ebu ibu nke ọ bụ ya dọrọ ọkụ ahụ.

Dịka ọ na-akwa arịrị na ya bụ ọkụ gbarikọrọ ngwaahịa gburu nde kwuru nde Naịra, Maazị Agbili kelèkwàzịrị Chineke na o nweghị onye tụfùrù ndụ ya maọbụ nweta mmerụ ahụ site na ya bụ ajọ ọkụ.

Na ntụnye nke ya n'aha onyeisi ha bụ Maazị David Bille, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze nà ụlọọrụ 'Nigeria Security and Civil Defence Corps (NSCDC)' bụ Maazị Edwin Ọkadigbo kwùru na ha nàtàra òkù mberede bànyere ya bụ ọkụ ọgbụgba n'ụtụtụ ahụ.

Nke a, dịka o siri kwuo, mezịrị ka onye òtù ọrụ ha na-elekọta mpaghara Idemili North, bụ Stella Ọnwụakagba kpọọ ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ, kọwatara ha maka nke ahụ, ma durukwazie ndị òtù ọrụ nke ya gaba ebe ahụ ozigbo.

Ọ gbara akaebe na ya bụ ọkụ mère mkpamkpa ebe ahụ, ma kpọzie òkù ka e mee nnyocha zuru òkè banyere ya bụ ọkụ, iji chọpụta ihe kpatara ya n'ezie nakwa ka o siri mebidobe ihe.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.