N'Ogun, Ndị Uweojii Ejidela Mmadụ Anọ Maka Ịtọrọ Nwata Ahọ Iri Na Atọ

May 13, 2021 - 21:29
 0
N'Ogun, Ndị Uweojii Ejidela Mmadụ Anọ Maka Ịtọrọ Nwata Ahọ Iri Na Atọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka ndị uweojii na steeti Ogun akpàrálá ụmụokorobịa anọ maka ịtọrọ otu nwatkịrị nwaanyị gbara ahọ iri na atọ na steeti ahụ, ma gwa ndị be ha wèta narị puku naịra ise (N500,000), maọbụ ha agbagbuo ya.

Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n'aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ DSP Abimbola, John Nelson, bụ onye kọwara na ihe ahụ mèrè na mpaghara Onipanu, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Odo/Ota nke steeti ahụ.

O nyèrè aha mmadụ anọ ahụ dịka Abimbola, John Nelson (gbara ahọ iri abụọ na otu), Adeleke Ayotunde (gbara ahọ iri abụọ na iteghete), Adekunle Basit (gbara ahọ iri abụọ), na Abey Fagbemi (gbara ahọ iri abụọ); ma kwuo na ha nwụchikọrọ ndị ahụ oge e wètàchààrà ha mkpesa site n'aka Adejunwon Odunowo, bànyere nwa ya nwaanyị (gbara ahọ iri na atọ), onye o kwuru na o dunyere ozi oge o jiri ọkara gata elekere isii nke mgbede ụbọchị Tọọzdee izuụka gara aga, mana ọ batàghịzị.

Dịka o siri kọwaa, onye ahụ wetara mkpesa ahụ kwùrù na ka ọ gachara obere oge ha jiri màlite ịchọ nwata ahụ, na ha nwètàrà òkù ekwentị site n'aka ndị a maghị ndị ha bụ; ha wee na-ekwu ka e wètara ha ego dị narị puku naịra ise (N500,000) ka ha wee tọhàpụ nwata nwaanyị ahụ, ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịhụ nwa ha, n'ihi na ọ bụ ha tọọrọ nwata ahụ.

Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii ahụ siri kọwaa, mgbe ha wètàchàrà mkpesa ahụ, onyeisi ndị uweojii na mpaghara ahụ, bụ CSP Bamidele Job zipuru ndị ọrụ ya ozigbo, ha wee malite ime nnyòcha, iji chọpụta ma nwụchikọọ ndị omekoome ahụ. 

Ka ha na-emezị nnyòcha ahụ, ndị uweojii ahụ chọpụtazịrị ma nwụchikọọ otu onye n'ime ndị ntọ ahụ na mpaghara Cele, dị n'Ota, na steeti ahụ. Site na nnyòcha ndị ọzọ e mere ka nke ahụ gachara, a chọpụtakwara na ndị ahụ tọọrọ nwata nwaanyị ahụ ma ga zoo ya n'ime ụlọ otu nwoke a maara dịka Maazị Adekunle Basit.

Ha bàkwàzịrị n'ebe ahụ e zoro ya bụ nwatakịrị, wee zọpụta ya n'enweghị mmerụahụ ọbụla. Ka e jidechara ndị òtù ya, ndị uweojii ahụ nwụchikọkwara onyeisi ndị òtù ntọ ahụ n'ụtụtụ ụbọchị Mọnde, dịka ọ na-achọ iri mbọmbọ ọsọ, oge ọ nụrụ maka njide ahụ e jidere ndị òtù ya ndị ọzọ aka ha dị n'arụrụala ahụ. O wee bụrụ etu ahụ ka ndị uweojii ahụ siri nwụchikọọ ndị arụrụala anọ ahụ. Ha akpọnyekwala ndị ezinụlọ nwata ahụ nwa ha n'udo na ọñụ.

Onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP Edward Awolowo Ajogun kwupụtàrà afọ ojuju ya banyere ezi ọrụ ahụ ndị ọrụ ya rụrụ n'ịnwụchikọ ndị ntọ ahụ na ịzọpụta nwata ahụ na ndụ, ma nakwazie ndị uweojii ahụ aka maka nke ahụ.

O nyekwazịrị ntụziaka ka e wèré okwu ahụ nyefèé n'aka ngalaba pụrụ iche na-ahụ maka ihe metụtara ntọrị mmadụ, ka ha wee mee nnyòcha miri èmì banyere nke ahụ ma nyekwazie ndị ahụ ntaramahụhụ kwesiri ha.

Ọ gwakwazịrị ọhaneze ka ha gbaa mbọ na-aña ntị ma na-erube isi nye ntụziaka dị iche iche ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa dị iche na-enye, iji gbanahị ịdaba n'aka ndị ọjọọ, maọbụ kwaa 'ngarammara' n'ikpeazụ, ọkachasị oge ugbua ọnọdụ nchekwa ala Nigeria debere imi na ọnụ ka ntọọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484