Gọọmenti Anambra Akasiela Ụlọakwụkwọ Patterson Grammar School Obì

Jan 12, 2020 - 04:36
Jan 24, 2021 - 02:58
 0
Gọọmenti Anambra Akasiela Ụlọakwụkwọ Patterson Grammar School Obì

Izunna Okafor

N'ihi ajọ ọdachi ọkụ ọgbụgba ahụ dabìdòrò ụlọakwụkwọ 'Patterson Grammar School, Awada' ụbọchị ụka gara aga ma taa isi otu nwata akwụkwọ gbara ahọ iri na otu; gọọmenti Anambra akasiela ndị nlekọta nakwa ụmụakwụkwọ ụlọakwụkwọ ahụ obì.

Nke a bụ nke e kwupùtàrà oge aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ garùrù n'ebe ahụ ya bụ njinji nọrọ wee jie, bụkwa ebe ọ nọrọ wee kwaa arịrị ka banyere mkpamkpa ajọ ọkụ ahụ kpàrà ebe ahụ, ma keleekwa Chukwu na imirikiti ụmụakwụkwọ ahụ nọ n'ezi ekpe ekpere oge ihe ahụ mèrè.

Gọvanọ Obianọ nke ọ bụ ode akwụkwọ ukwu steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelụ nọchitere anya ya kasìrì ụlọakwụkwọ ahụ, ndị ụka Anglịkan nakwa ndị ezinaụlọ nwata ahụ nwụrụ anwụ obì, ma kpee ka Chineke nara mkpụrụ obi ya na ndokwa, nyekwa ha obì iji wee dìé ya bụ ihe.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọchịchị steeti ahụ ga-etinye amụmà pụrụ iche n'ọrụ iji hụ na e gbòchìrì ụdị ihe ahụ ịdabido ụlọakwụkwọ ọbụla ọzọ n'ọdịnihu, ma kwekwazie nkwà na gọọmenti ga-enyere ha aka n'ịrụzigharịsị ihe ọkụ ahụ gbarìkọrọ.

Na ntụnye nke ya, onyeisi ụlọ ọrụ nsọnyụ ọkụ na steeti ahụ, bụ Maazị Martin Agbili kwuru na ọ bụ ọkụ latiriiki kpatàrà ya bụ ọkụ ọgbụgba, ma kwuzie na ụlọ ọrụ ya ga-abàgide n'amụmà ịkụziri ụlọ ọrụ, ezinaụlọ nakwa ụlọ akwụkwọ dị iche iche nanwa ọhanaeze ihe ha kwesiri ịma banyere ọnọdụ nchekwa, dịka o siri metụta usoro isi zèéré ọkụ ọgbụgba. Ọ kpọkùzịkwàrà ọhaneze ka ha gbaa mbọ hụ na ha na-agbanyụsị ihe dị iche iche ha kwụnyere n'ọkụ tupuu ha apụba, iji gbochie ọkụ ọgbụgba.

Na mbụ oge ọ na-anabàta Gọvanọ, Bishọọpụ ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Niger, bụ Bishọọpụ Owen Nwokolo kèlèrè ya bụ aka na-achị achị maka mmetụta ya nakwa ịbịa kpọtụrụ ụlọakwụkwọ ahụ maka ihe ọdachi ahụ, ma rịọzie ya ka gọọmenti gbatara ndị isi ụlọakwụkwọ na ndị nne na nna ọsọ enyemaka n'iwuzigharị ụlọ akwụkwọ ahụ ka ọ dịkwa otu ọ dị na mbụ.

Ọ dị ncheta na ajọ ọkụ ọgbụgba dị egwù dabìdòrò ụlọakwụkwọ Patterson Grammar School, dị n'Awada, na mpaghara okporo ụzọ awara-awara ahụ siri Ọnịtsha gaa Owerri, malite n'elekere iri nke abalị, ụbọchị ụka gara aga, bụ ụbọchị ụmụakwụkwọ siri n'oge ezumike laghachi, iji malite akwụkwọ.

Ya bụ ọkụ, nke gbara ogologo oge, ka e kwuru na ọ gbagwòrò ebe obibo ụmụakwụkwọ, gbakwa ngwongwo dị iche iche n'ụlọakwụkwọ ahụ pịataa, ma gbagbuokwa otu nwata nwoke aha ya bụ Chigozie Dimanyichie (gbara ahọ iri na otu) bụ onye esoghị ibè ya nọrọ n'ezi ebe ha na-ekpe ekpere tupuu ọkụ ahụ wee màlite.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.