Ụwandịigbo Enweela Ọgbakọ Ahọ 2020, Kpọọ Òkù Nkwàlite Asụsụ Igbo

Dec 8, 2020 - 16:32
Jan 30, 2021 - 16:34
 0

Izunna Okafor dere akụkọ a

Buusu sị na ọ bụ mmekọrịta ahụ bụ ụtọ nwanne, ebe ndị Igbo kwùrù na ọ na-abụ a gbakọọ aka ọnụ wee buo ozu enyi, ọ dị mfe.

N'ịgbaso nke a, ndị Igbo asụsụ na omenala Igbo na-amasị nọrọ na nsonso a wee nwee nnukwu ọgbakọ izugbe pụrụ iche iji tụgharịkọta uche ọnụ banyere ọnọdụ asụsụ na omenala Igbo, ma tụkwa arò etu a pụrụ isi kwàlite ma mee ka ha dị ọkpụtọrọkpụ.

Ọmarịcha ọgbakọ ahụ a kpọrọ 'Ụwandịigbo 2020' bụ nke a chịkọbara site n'aka òtù Ụwandịigbo (bụ òtù pụrụ iche na-akwàlite asụsụ na omenala Igbo) ma bụrụkwa ọgbakọ ndị Igbo ihe gbasaara asụsụ na omenala Igbo na-amasị sonyèrè na ya site na mpaghara ebe dị iche iche n'ụwa gbaa gburugburu.

Ya bụ nnukwu mmemme e mere site n'usoro nzikọrịtaozi zuumu (zoom) bụ nke mbụnambụ ya, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya nye nkuzi ma tinye ọnụ n'isiokwu dị iche iche gbasaara asụsụ na omenala Igbo.

N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ bànyere nke ahụ, onyenhiwe na onyeisioche 'Ụwandịigbo Academy Inc.' bụ Dọkịta Ejike Eze (onye e ji Omenka wee mara) mèrè ka a mara na ebumnobi Ụwandịigbo bụ ịkwalite asụsụ, agụmagụ na omenala Igbo.

Eze - Okwu Mmalite si nʻAka Omenka Ejike Eze (Onyenhiwe na Onyeisioche, Ụwandịigbo)

Dịka o siri kwuo, ụzọ ha si eme nke a bara ụba, nke ótù nʻime ha bụ ime nchọcha ma hazie etu okwu ọhụrụ, tụmadị nke gbasara nkanaụzụ, si abata nʻasụsụ Igbo ma mee ka ọhanaeze mara maka ya. 

Ọ sịkwa na ụzọ ọzọ ha si eme nke ahụ bụ ịhụ na ndị na-emepụta igwe na nkanaụzụ ọhụrụ dịka Google, Microsoft na ndị ọzọ, chetara asụsụ Igbo mgbe ha na-etinye asụsụ ndị ọzọ. Nke a pụtàrà na ha na-alụrụ asụsụ Igbo ọgụ ka a ghara ichefu ya. O mekwàrà ka a mara na onye ọbụla chọrọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ ha na-eme nwere ike ije na: https://uwandiigbo.org/

Na nkọwa ya banyere isiokwu dị iche iche e nyèrè nkụzị na ha na mmemme ahụ, Dọkịta Eze mere ka a mara na niile, bụ nke ndị odee na ọkammụta si mahadum dị iche iche tinyere ọnụ, machara mma, ebe ọtụtụ nchọcha miri emi nakwa ọrụ gbara ọkpụrụkpụ pụtára ihè nʻedemede ndị a gụpụtasịrị na ya bụ ọgbakọ. 

O kelere ma tòkwa ndị niile sonyere n'ọgbakọ ahụ, ma ndị nyere nkuzi ma ndị gere ègè, kwuo na ha gbọrọ ihe ewu na-eri, ma dụkwazie ha ka ha nọgidesie ike n'ịkwálite asụsụ na omenala Igbo.

N'ajụjụ a jụrụ ya bànyere etu ya bụ mmemme siri gaa, ọ sị "Enwere m nnukwu afọojuju etu ihe niile siri gaa. Nke a bụ izizi a na-eme ụdịrị ọgbakọ a ebe ihe ngụpụta niile nakwa mkparịtaụka niile bụ naanị nʻasụsụ Igbo. Ọ bụ ihe obiụtọ ihụ na ọ gara nke ọma. Nke ga-abịa nʻọdịnihu ga-ebu ibu ma banwanyekwa karịa nke afọ a. 

"Ka m werekwa ohere a kelee ndịnchịkọba nyere aka ịhụ na anyị mere ya nke ọma. Ụfọdụ nʻime ha bụ: MOE Ene (Egbedaa), Iwu Ikwubuzo, Ike Anyanike (Iroko)

Amalinze JJ Azi (Onyeọma Amalinze), Nnamdị Ahamnonu (Omeninyo), Chiji Akoma, Emma Asonye, Emma Okoli (Obuadazie)

Nnamdị Achuko, Ngozi Nwarunta, Yvonne Chioma Mbanefo, Munachiso Eze, Zinachidi Mbanefo, Chidi Igwe, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ."

Gbasaara onye ụta dịịrị n'ọnọdụ asụsụ na omenala Igbo taa, ọ sị "Ndị ụta dịịrị banyere ọnọdụ asụsụ Igbo bụ ndịigbo nʻonwe ha. Ihe na-eme Igbo si Igbo nʻaka. O nweghi onye na-akwalitere mmadụ asụsụ ya. Ọ bụ ndị nwe asụsụ ga-akwalite asụsụ ha. Ndịigbo hapụrụ asụsụ anyị, nke mara mma, makụrụ asụsụ ndị ọzọ were ya na-eme ngala. Ọ bụ nke a kpatara asụsụ Igbo jiri dị ka ọ na-alaghachi azụ."

N'okwu ndụmọdụ ya nye ndị Igbo (ma ndị nọ na Naịjiria ma ndị nọ na mba ofesi) dịka o siri metụta ịkwàlìtè asụsụ na omenala Igbo taa, Dọkịta Eze sị "Ndụmọdụ m bụ ka onye ọbụla tinye aka ka anyị bulite asụsụ na omenala Igbo maka na onye kpọọ ọba ya mkpọkọrọ, agbataobi ewere ya kpoo ahịhịa. 

"Ọ bụ ajọ ihe na Igbo erughi ebe asụsụ mba ụwa ndị ọzọ dị ka ya ruru. Nke a pụtara na ndị anyị buru ụzọ gawa ije na-asịzị anyị gasiwe ike. Ọ bụ anyị ka ọ dịịrị ịkwụsị nke a. Mmiri dọrọ nʻeju dọọrọ nwankịta."

O mekwazịrị ka a mara na a ga-ahụ ndị niile gụpụtara ihe nʻọgbakọ ahụ na isiokwu ihe ha gụpụtara n'Usoro Emume nke dị ebe a: https://uwandiigbo.org/uwandiigbo-2020/;   ebe e nwèkwàrà ike ilele ihe a gụpụtàrà n'ọgbakọ ahụ n'ebe a:https://m.youtube.com/watch?v=TsQWrTyUJ9o.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.