Obianọ Ekwenwòó Nkwà Ịkwụ Ụgwọ Ọnwa Opekata Mpe Ọhụụ

Dec 19, 2019 - 01:06
Jan 24, 2021 - 03:03
 0
Obianọ Ekwenwòó Nkwà Ịkwụ Ụgwọ Ọnwa Opekata Mpe Ọhụụ

Izunna Okafor, Awka

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwenwòóla nkwà ịkwụ ndị ọrụ oyibo steeti ahụ ụgwọ ọnwa opekata mpe ọhụụ, ma kwuo na ọchịchị ya wàtàrà ọgọdọ ime nke ahụ.

Aka na-achị achị bụ Obianọ kwupụtara nke a na mmemme ụbọchị ndị ọrụ oyibo nke ahọ 2019, bụ nke e merùbèrè ụbọchị Tuzdee ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'ogige isi ụlọ ọrụ oyibo steeti ahụ dị n'Awka.

Ka ọ na-echètara ha bụ ndị ọrụ oyibo na ọchịchị ya makwàsàrà ego n'ụgwọ ọnwa a na-akwụ ha n'ahọ 2015 na-enweghị onye ọbụla gwara ya mèé nke ahụ; Gọvanọ Obianọ kwùrù na ya ga-etinyekwu ego n'ụgwọ ọnwa ha ọzọ ngwangwa ọnụ ego a na-enweta n'ime steeti ahụ gbàgòtèrè. N'ịdụ ha ọdụ ka ha sepu aka na mpụ na arụrụ ala, ọ kpọkùzịrị ha ka ha na-arụsi ọrụ ike, bèlata oke mmefù ego, ma nyekwara gọọmenti aka site n'ịfàchìsì ụzọ dị iche iche ego gọọmenti sì epiopùsi na steeti ahụ, ya na site n'inye mkpesa bànyere onye ọbụla na-ezuru maọbụ na-edekọrọ ego gọọmenti.

N'okwu nke ya, onyeisi ọrụ oyibo na steeti ahụ, bụ Ọkaiwu Harry Uduh kọwàra ndị ọrụ oyibo dịka a hụghị ebule ma sị elinà atụrụ n'ihe gbasaara ịkwàlite ọnọdụ mmepe na nkwụdosi ike akụnụba obodo ọbụla, ọbụnadị dịka o kwère nkwà na ha ga-aga n'ihu ịdị na-akwụghàchi onye ọrụ oyibo ọbụla na steeti ahụ dịka ọrụ ya siri dị.

Maazị Uduh kèlèrè Gọvanọ Obianọ maka ezi ọrụ ya na mmasị ya n'ịkwàlitè ọnọdụ obibi ndụ ndị ọrụ na steeti ahụ, site n'ịkwụ ha ihe niile kwesiri na a ga-akwụ ha mgbe na otu o kwèsiri, tinyere akpa osikapa ọ na-ebunye ha kwà ekeresimeesi ahọ ọbụla; ma kwekwazie ya nkwà na ndị ọrụ oyibo steeti ahụ ga-aga n'ihu inye ọchịchị ya nkwàdo, na ịkwụghàchi ya site n'ịrụpụta ihe a hụrụ anya.

Na mbụ n'ozi nnọọ ya, onyeisi oche mmemme ahụ, bụ Maazị Pius Udoh kọwàrà ụbọchị ahụ dịka nke dị óké mkpà n'ihi na ọ bụ ụbọchị e ji emerùbe ndị ọrụ oyibo na mba ụwa, ma gbaakwa akaebe na ndị ọrụ oyibo steeti ahụ na-agbasi nnọọ mbọ ike ma na-enyekwa aka n'imezùpụta atụmatụ ọrụ dị iche iche gọọmenti na-abàgide.

A nọrọ na mmemme ahụ wee nye onyinye nkwanye ùgwù nyegara ụfọdụ ndị ọrụ oyibo dị iche iche nke ahụ kwèsììrì, ma nọrọkwa na ya nye (site n'aka gọọmenti steeti ahụ) otu nwata nwaanyị òhèrè agụmakwụkwọ n'éfù ruo ogoogo mahadum, bụ nwatakịrị ọkụ ọgbụgba tàrà isi nne na nna ya tinyere mmadụ ise ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.