Obianọ Ekwela Nkwà Ịkwàlitekwu Usoro Mmụta Ọgbara Ọhụụ

Dec 12, 2019 - 02:30
Jan 24, 2021 - 03:30
 0
Obianọ Ekwela Nkwà Ịkwàlitekwu Usoro Mmụta Ọgbara Ọhụụ

Izunna Okafor, Awka

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwela nkwà ịkwàlitekwu usoro mmụta ọgbara ọhụụ n'ime steeti ahụ.
Aka na-achị achị bụ Obianọ kwuputara nke a n'okwu ya na mmemme icheta ọgbụgba ahọ iri isii nke ụlọakwụkwọ 'Bubendorff Memorial Grammar School Adazi-Nnukwu', bụkwa nke weere ọnọdụ n'ogige ụlọ mmụta ahụ, dị n'okpuru ọchịchị Anaọcha.

Ka ọ na-akpọpụtasị ịgbà dị iche iche ọchịchị ya tigoro na ngalaba mmụta na steeti ahụ, o kwùru na ya amalitelarị ịbanyè n'usoro mmụta ọgbara ọhụụ, makpọkuzie ụmụakwụkwọ steeti ahụ sonyesie ike na nke ahụ dịka ihe dị oke mkpà, n'ihi na mba ụwa dum na-abanyezị n'usoro dijitaalụ ugbua.

O kwuru na, n'ịkwàlite nke ahụ, na ọchịchị ya ka na-arụkwu ụlọakwụkwọ pụrụ iche, iji kwàlite ya bụ usoro mmụta ọgbara ọhụụ nakwa ime ka ụmụakwụkwọ steeti ahụ nweta mmụta na asambodo n'atụmatụ ọmụmụ ihe kọmputa dị iche iche, ọbụnadị dịka ọ kpọkùzịrị ụmụakwụkwọ ka ha sonyesie ike na nke ahụ, ma zeere ịba n'otu nzuzo na itinye aka n'ihe ndị ọzọ na-eweta ala adịghị mma.

Na ntụnye nke ya na mmemme ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ na steeti ahụ, bụ Ọkammụta Kate Omenụgha gbara àmà na ọchịchị ọchịchị steeti ahụ emeela nnọọ ọtụtụ ihe dara ụda n'ịkwàlite usoro mmụta na steeti ahụ, ma dụọ ya ka o jide ka o ji.

O mekwàzịrị ka a mara na ịkwalite agụmakwụkwọ abụghị ọrụ dịịrị naanị gọọmenti, kama na ndị nnọrọ onwe, ndị òtù na ụlọ ọrụ dị iche iche nwegbàdòrò ntụnye nke ha na ọrụ dịịrị ha ịrụ iji kwalite agụmakwụkwọ, ọbụnadị ọ dụkwàrà ndị ahụ ka ha gbaa mbọ tụnye ụtụ nke ha n'ezi mbọ ahụ a na-agba inwògharị ngalaba mmụta steeti ahụ, site na n'ijikọ aka ọnụ, ha na gọọmenti.

Na mbụ na nkenke okwuchukwu ya, Bishọọpụ ụka Katọliiki na dayọsiisi Awka, bụ Bishọọpụ Paulinus Ezeokafor kpọkùrù ọhaneze bịara mmemme ahụ ka onye ọbụla chègharịa, hụ mmadụ ibe ya n'anya, ma hụkwa Eke kere ụwa n'anya n'ụdị ịdị nkwadobe maka ọbịbịa nke ugboro abụọ nke Ọkpara Ya.

O kwuru na gọọmenti steeti ahụ emeela nke ọma n'ịkwàlite usoro agụmakwụkwọ na ngalaba ndị ọzọ, ma kpọzie òkù ka gọọmenti n'ogoogo dị iche iche tinye anya n'iguzobesi usoro mmụta pụrụ iche n'ihi na nke ahụ ga-enye aka n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche ịkwalite mmepe na ígbò nsogbu enweghị ọrụ.

Ndị ọzọ dị iche iche sonyere na mmemme ahụ gụnyèrè ọka okwu ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti ahụ, bụ Maazị Uchenna Okafor; ode akwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelụ; ode akwụkwọ ukwu nyegara Gọvanọ, bụ Maazị Willie Nwokoye; onyeisi ọrụ oyibo na steeti ahụ, bụ Ọkammụta Harry Uduh; nwa amadi ahụ na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Anambra etiti n'ụlọ omebe iwu sineeti n'oge gara aga, bụ Maazị Victor Umeh, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù n'ọchịchị steeti ahụ, ndị selitere isi na ngalaba mmụta, ndị gụbụrụ akwụkwọ n'ebe ahụ, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.