Ndị Ebube Igbo Emeela Ụbọchị Omenala Igbo Nke Ahọ 2019

Dec 18, 2019 - 23:24
Jan 24, 2021 - 03:06
 0
Ndị Ebube Igbo Emeela Ụbọchị Omenala Igbo Nke Ahọ 2019

Izunna Okafor, Awka

Ịma mma nke ọnatarachi na omenala ndị Igbo pụtàrà nnọọ ìhè nso-nso a n'Abagana dị n'okpuru ọchịchị Njikọka nke steeti Anambra, dịka òtù a mààra dịka 'Ebube Igbo Association of Nigeria' chịkọbàra ma merùbe mmemme ụbọchị omenala Igbo nke ahọ 2019.

Ka ọ na-akọwàpụta ihe bànyere mmemme ahụ, onye chọpụtàrà ma bụrụkwa onyeisi òtù Ebube Igbo, bụ Maazị Chistopher Mbanụ mere ka a mara na ha na-esite na ya bụ ihe mmemme wee na-atụnye ụtụ nke ha n'ịkwàlite omenala Igbo.

Ọ kwàrà arịrị na omenala Ndị Igbo, ọ kachasị asụsụ ha na-anwụnyụzị anya ugbu a, nke mezịrị o jiri dị mkpa na onye ọbụla bụ ezi nwa afọ Igbo ga-atụnya ụtụ ma tinye aka n'ọrụ, iji zọpụta ma hụ na ya bụ asụsụ efùghị dịka òtù mba ụwa United Nations Educational Scientific, and Cultural Organization (UNESCO) bùrù n'amụma n'ahọ 2012.

Na mbụ oge ọ na-anabata ọhaneze bịara emume ahụ, onyeisi oche na ya bụ mmemme, bụ Maazị Innocent Ọkpalajiakụ kọwàra asụsụ na omenala dịka ótù n'ime ihe kachara dị mkpa na ndụ mmadụ na àgbụrụ ọbụla, ma rịọkwazie ndị nne na nna ka ha jisie ike na-akụziri ụmụ ha asụsụ na omenala Igbo oge ọbụla, na-agbanyèghị mbà maọbụ obodo ha bì.

Ọ rịọkwazịrị ndị òtu Igbo dị iche iche, ma ndị nọ n'ala Nigeria maọbụ mba ofesi ka ha na-echeta ebe ha sì, ma na-atụnyekwa ụtụ nke ha na mgbe na mgbe n'ịkwàlìtè asụsụ na omenala nna ha, n'ihi na ọ ga-abụ ihe jọgburu onwe ya ma e tete ụra otu ụbọchị o wee bụrụ na asụsụ Igbo adịghịzị, maọbụ na ọ nwụọla kpamkpam dịka ụfọdụ asụsụ ọdịnala ndị ọzọ dị iche iche siri laa mmụọ.

A nọrọ na mmemme ebube Igbo nke ahọ wee mee ọtụtụ ihe ngosi ma gbakwa egwu ọdịnala dị iche iche. A nọkwàrà na ya wee tụọ ndụ mmanụ site n'iri ụdị nri ndị Igbo dị iche iche, tinye mmanya ngwọ na nkwụ elu jụrụ oyi e jiri wee gbanyere ya ụgbọ nwamkpi.

Òtù Ebube Igbo bụ òtù nnọrọ onwe ndị Igbo e guzòbèrè maka ijikọta ndị Igbo ọnụ, ịkwàlite asụsụ, omenala, njirimara, ejiji nakwa ọnatarachi ndị Igbo, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ya bụ òtù na-achụsò.

Ndị ngalaba òtù ahụ sitere n'okpuru ọchịchị iri abụọ na otu e nwere na steeti Anambra sònyèrè na mmemme ahụ nke ahọ a, tinyere ndị nnọchi anya òtù ahụ n'ime steeti dị iche iche na-asụ asụsụ Igbo na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.