Ebenator Ebuola Sinọọdụ Ahọ 2021 Nke Dayọsiisi Amichi

Jun 9, 2021 - 22:58
Jun 10, 2021 - 17:19
 0
Ebenator Ebuola Sinọọdụ Ahọ 2021 Nke Dayọsiisi Amichi

Izunna Okafor dere edemede a

Ọ dara ụda ma kpọtụọ akpọtụọ n'isi ịgwụcha izuụka gara aga, dịka dayọsiisi Amichi nke ụka Angịlịkan chịkọtara mmemme sinọọdụ ya nke ahọ 2021 n'ụdị pụrụ iche.

Ya bụ sinọọdụ bụ àgbà nke mbụ n'ime sinọọdụ nke ise nke dayọsiisi ahụ, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'ụlọụka 'St. Andrew's Anglican Church, Ebenator' dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Nnewi South' nke steeti Anambra, malite n'abalị abụọ nke ọnwa Juunu a wee ruo n'abalị isii, bụ ụbọchị ụka.

Sinọọdụ ahọ a, nke ọ bụ Ebenator Ashdikinri (Ebenator Archdeaconry) buru ya, dọtàrà ọtụtụ ndị bishọọpụ, ndị ọrụ ụka, ndị ọrụ gọọmentị na ndị ọzọ selitere isi na ngalaba dị iche iche, bụ ndị siri ebe dị iche iche na gburugburu ala Nigeria wee bịa.

N'ozi ya pụrụ iche ọ gụpụtara na sinọọdụ ahụ nke a kpọrọ 'Bishop's Charge', Bishọọpụ dayọsiisi Amichi, bụ 'Rt. Rev.' Ephraim Okechukwu Ikeakor kpọpụtasịrị ihe dị iche iche dayọsiisi ahụ mepụtàrà, ya na ihe dị iche iche megasịrị na dayọsiisi ahụ na n'ụka angịlịkan n'ala Nigeria n'ime ótù ahọ gara aga, ma kelee Chineke maka nnọnyere Ya.

Bishọọpụ Ikeakor katọrọ ma gbarụọ ihu banyere etu ihe si aga n'ala Nigeria ugbua, ọkachasị dịka o siri metụta mpụ, arụrụala, mkpamkpa ndị Fulani na-achị ehi, na ọnọdụ nchekwa obodo na etu e si egbusi ụmụ mmadụ ka ọkụkọ ma na-enwekwa ịkpọ ganị-ganị na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria ugbua, ma jirikwàzie ohere ahụ kpọkuo gọọmentị na ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu ka a mara ihe e mere banyere ọnọdụ ahụ, na ọnọdụ akụnụba ala Nigeria.

Dịka ọ na-ekpe ka Chineke were ọnọdụ n'ihe niile ahụ na-aga n'ala Nigeria ugbua; ya bụ Bishọọpụ kpọrọ òkù ka a hazigharịa ọnọdụ ala Nigeria na amụma iwu na-achị ala ahụ; ọbụldị dịka o kelèkwàzịrị aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, maka ezi ọrụ dị iche iche ọ rụgoro n'ime steeti ahụ, ọkachasị ọdụ ụgbọelu ahụ ọ rụrụ na steeti ahụ, ma kpọkuo ya ka ọ hụ na ya bụ ọdụ ụgbọelu malitere ọrụ n'uju n'oge adịghị anya, dịka e si atụ anya.

N'okwu nke ya na sinọọdụ ahụ, Ashbishọọpụ mpaghara Niger ma bụrụkwa Bishọọpụ ụka Angịlịkan na dayọsiisi Awka, bụ 'Most Reverend' Alexander Chibuzor Ibezim kwupụtara obi ụtọ ya banyere etu dayọsiisi ahụ si agawanye n'ihu kemgbe ahọ olenaole gara aga e jiri kewàpụta ya; ma kelee Bishọọpụ Ikeakor na nwunye ya bụ 'Dame' Nkem Ikeakor maka ezi ọrụ ha dịka ndị ndu dayọsiisi ahụ, kpee ka Chineke gaa n'ihu inye ha otite mmanụ na ibuli dayọsiisi ahụ elu.

N'okwu nke ya, Bishọọpụ ụka Angịlịkan na dayọsiisi Nnewi, bụ 'Rt. Rev. Ndubisi Obi bunyekwara Bishọọpụ Ikeakọ ụkpa ekele maka ọrụ Chineke ji ya arụ na dayọsiisi ahụ, ma kelekwa ya n'ụzọ pụrụ iche maka etu o siri wee kàgbuoro ma gbaghàrá ụlọụka dị iche iche ụgwọ ha ji na dayọsiisi ahụ, nye ndị ụkọchukwu ise otu nde naịra n'ótù n'ótù iji kwàdó ewumewu ụlọ ha, ma nyekwa ụmụ ndị ụkọchukwu ego maka ebe obibi ha n'ụlọakwụkwọ, tinyere ihe ndị ọzọ.

N'okwu ha n'ótù n'ótù, Ashịdikin nke Ebenator Ashdikinri, bụ Ụkọchukwu Godson Ugochukwu; onye lere ọbịa na sinọọdụ ahụ ma bụrụkwa nwaafọ Ebenator ọnụ na-eru n'okwu na ndọrọndọrọ ọchịchị, bụ Dọkịta Harry Oranezi; na onyeisioche otu hụrụ maka nhazi sinọọdụ ahụ, bụ Maazị Ifeanyi Anakor kèlèrè Chineke maka ime ka ihe niile gaa siriri-wèrèrè na sinọọdụ ahụ, kelee ọhaneze sonyere na ya bụ sinọọdụ nà ndị niile tụnyere ụtụ n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ iji hụ na ihe niile gara nke ọma, kpekwazie ka Chineke kwụghachi ha niile mmaji kwuru mmaji.

A nọkwazịrị na sinọọdụ ahụ wee kpáá ma kpéé maka ọdịmma dayọsiisi ahụ, kpéé usoro ekpere dị iche iche maka ọdịmma ala Nigeria, gbàá ọnya ego maka ịkwalite ọrụ mmepe na dayọsiisi ahụ, gaa kpọtụrụ eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Edwin Chinaewubeze Ezejiburu n'obí ya, ma gọzikwa obodo ahụ buru ya bụ sinọọdụ, bụ Ebenator Ozulogu, na ụmụafọ ya, tinyere ihe ndị ọzọ mere ka sinọọdụ zaa aha a kpọrọ ya n'eziokwu.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484