N'Anambra, Mmadụ 2 Anwụọla, Mmadụ 14 Merụọ Ahụ n'Ihe Mberede Okporoụzọ

Jan 25, 2022 - 22:30
 0
N'Anambra, Mmadụ 2 Anwụọla, Mmadụ 14 Merụọ Ahụ n'Ihe Mberede Okporoụzọ

.

¶Onye Ọkwọ Ụgbọala Rie Mbọmbọ Ọsọ 

.
Izunna Okafor dere akụkọ a

Ozi si n'aka ụlọọrụ na-ahụ maka njem awele okporoụzọ n'ala Nigeria, bụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC)', ngalaba steeti Anambra na-akọwa na mmadụ abụọ anwụọla, ebe mmadụ iri na anọ ndị ọzọ nwetara mmerụahụ n'ihe mberede okporoụzọ dapụtara na steeti ahụ na nsonso a.

Onye jigodi ọkwa ugbua dịka onye na-ahụ maka ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma n'ụlọọrụ FRSC n'ime steeti ahụ, bụ DRC Margaret B. Onabe bụ ya mere ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ na nsonso a n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Dịka o siri kọwaa, ya bụ ihe mberede okporoụzọ dapụtàrà na mpaghara ‘Asaba Park’ dị n'Upper Iweka, n'ogologo okporoụzọ awara-awara ahụ siri Awka gaa Onitsha.

O kwuru na ihe mberede ahụ metụtàrà ụgbọala ise, nke gụnyere ụgbọala 'Daf Truck' (nwere ákàrà XC 416 PK), ụgbọala ‘Daf Truck’ ọzọ (nwere ákàrà DTF 249 XA), ụgbọala ‘Toyota Hiace Bus’ (nwere ákàrà FGG 929 ZD); ụgbọala‘Toyota Hiace Bus’ ọzọ (nwere ákàrà XB 994 GBK); na ụgbọala ‘Lincolin Jeep’ (nwere ákàrà RSH 450 BM).

O kwukwàrà nà ndị ọnọmgbeomere kọwàrà na ihe mberede ahụ dapụtàrà n'oge ehihie, ma bụrụkwa nke dapụtàrà n'ihi ngharị̀pụ breeki ụgbọala.

Ọ kọwàrà na ụgbọala gwongworo ahụ (nwéré ákàrà XC 416 PK) pụ̀nàhị̀rị̀ n'aka onye na-anya ya, wee jiri ọsọ sukara ụgbọala ndị ọzọ dịgasị n'ihu ya, jirikwa ọsọ dakpuo n'ọ̀wà mmiri dị nso n'ebe ahụ. Ngwangwa nke ahụ mere, onye na-anyà ụgbọala ahụ mapụ̀tàrà ozigbo, rie mbọmbọ ọsọ.

Ọ sị na mmadụ iri abụọ na abụọ (nke gụnyere ụmụnwoke iri na atọ, ụmụnwaanyị asaa, na ụmụaka abụọ) nọ n'ime ụgbọala ise ahụ oge ahụ ya bụ ihe mberede okporoụzọ mere.

O kwukwàrà na ụmụnwoke abụọ nwụrụ ozigbo ahụ ihe ahụ mèrè, ebe mmadụ iri na anọ (nke gụnyere ụmụnwoke asaa na ụmụnwaanyị asaa) nwetere mmerụahụ, ma bụrụkwa ndị e bùùrù gaa ụlọ ahụike 'Toronto Hospital Borromeo' dị n'Onitsha ahụ, bụkwa ebe dọkịta nọ n'ọrụ nọ̀rọ̀ wee gbaa akaebe na mmadụ abụọ ndị ọzọ ahụ anwụọla.

Ọ kwùrù na a donyezị̀kwàrà ozu mmadụ abụọ ahụ n'ụlọ nchekwa ozu dị n'ụlọọgwụ ahụ. 

N'okwu nke ya, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ CC Adeoye Irelewuyi dụrụ ndị na-anya ụgbọala maọbụ ihe ọbụla a na-anya anya n'okporoụzọ ọdụ, ka ha na-eleru ya anya nke ọma ma gbakwa mbọ hụ na ọ kwụ n'egwú tupu ha eburu ya pụta n'okporoụzọ, maka adịghị ama ama.

Ọ kasiri ezinụlọ nne na nwa ahụ nwụrụ n'ihe mbere okporoụzọ ahụ obi, kpee ka mkpụrụobi ha zuo ike na ndokwa, ma kpekwazie ka ndị nke nwetara mmerụahụ gbakere ma nweta ọgwụgwọ n'oge adịghị anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484