Anya mmiri Agbaa, Dị Ọkụ Gbapị̀àrà Ọdụ Ahịa Iri N'Ogoja

Jul 3, 2021 - 21:01
Jul 3, 2021 - 22:11
 0
Anya mmiri Agbaa, Dị Ọkụ Gbapị̀àrà Ọdụ Ahịa Iri N'Ogoja

Izunna Okafor dere akụkọ a

Oke ihe mberede na ihe anyammiri dakwàsịrị ụfọdụ ndị nwere ọdụ ahịa na mpaghara Ogoja dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ogoja nke steeti Cross River, dịka ajọ ọkụ ọgbụgba dakwàsịrị ma gbapịa ya ọdụ ahịa ruru iri n'ọnụọgụgụ n'ebe ahụ.

Ya bụ ajọ ọkụ ọgbụgba mere n'abalị na mpaghara 'No. 29 Mission Road, Igoli-Ogoja' ka e kwuru na ọ gbarikọrọ ihe niile dị n'ọdụ ahịa ahụ kpamkpam, nkè na o nweghị onye ọbụla n'ime ndị nwe ọdụ ahịa ahụ wepụtanwuru ọbụladị otu ihe n'ime ya.

Ndị ọnọmgbeomere na-akọwa na ọ bụ igwe na-enye ọkụ, bụ jeneretọ ka ọkụ ahụ siri na ya wee malite n'abalị ahụ, ma gakwa n'ihu kọwaa na otu onye n'ime ndị nwere ọdụ ahịa ebe ahụ koropùrù ma dàá ozigbo ọ nụrụ banyere ọkụ ọgbụgba ahụ,  ke mezịrị ka e buru ya gaa ụlọọgwụ maka inye ya ọgwụgwọ.

Na nkọwa nke ya, onye na-ere ahịa ihe e ji arụ ọkọ latiriiki, ma bụrụkwa otu onye n'ime ndị ọkụ ahụ gbarikọrọ ọdụ ahịa ha, bụ Maazị Felix Orim kwuru na ya nwètàrà òkù ekwentị n'ime abalị na ọkụ na-agba n'ọdụ ahịa ya; mana o nweghịzị ike ịpụnwù gaba ebe ahụ n'ime abalị ahụ, n'ihi etu ọnọdụ siri dịrị ya. Kaosiladị, ọ gakwazịrị n'ihu kọwaa na mgbe ọ bịaruru ebe ahụ n'ụtụtụ echi ya, ọ bụrụ na ihe niile o nwere n'ọdụ ahịa ahụ aghọọla ntụ, n'ihi na ọkụ gbara ha pịàtàà.

Dịka ọ na-eme ka a mara na a gwara ya na ọ bụ site n'igwè ọkụ otu onye ọzọ nwere ọdụ ahịa ebe ahụ ka ya bụ ọkụ siri wee malite, Maazị Orim kwàrà arịrị na ọ kwàjuru ngwaahịa n'ọdụ ahịa ya ahụ ọhụrụ, ma kwaa arịrị na ihe niile o jiri biri agbaala ọkụ, nke na ahịa ya adaala kpamkpam.

Ọ rịọkwazịrị gọọmenti na ndị ọzọ nwere obi ebere ka ha biko gbatara ha ọsọ enyemaka, site n'iji ego ole ọbụla ha ga-enyenwu wee tie ya na ndị òtù ya aka n'obi, maka na ha nwechàrà ezinụlọ ha na-akpanye nri na ụmụ ha na-azụ n'akwụkwọ.

N'okwu nke ya banyere ajọ ọdachi ahụ, onyeisioche okpuru ọchịchị ime obodo Ogoja, bụ Maazị Emmanuel Ishabor gbàrà akaebe na ihe ọdachi ahụ`dapụtara n'eziokwu, ma kwuo na ya onwe ya ejirila ụkwụ ya wee gaa jiri anya ya hụ ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ.

Ọ kọwara ọkụ ọgbụgba ahụ dịka nnukwu ihe ọdachi ma metere ndị ahụ ebere banyere ihe mgbu ahụ dakwàsịrị ha. O kwere nkwà na ya na ụfọdụ ụlọọrụ ndị ọzọ ga-ejikọ aka ọnụ ma tụkọọ arò ọnụ iji mara ihe ha ga-emere ndị ahụ nwe ọdụ ahịa ahụ, n'ụdị iji kwàdo ma nyere ha aka. O kwukwazịrị na ha ka na-eme nnyòcha banyere ya bụ ọkụ ọgbụgba, iji chọpụta n'ezie ihe kpatara ya na ọnụọgụgụ ihe ya bụ ọkụ bibìrì.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484