Igbu na Ịtọrọ Mmadụ N'Ime Ọnwa Anọ nke Afọ a

Igbu na Ịtọrọ Mmadụ N'Ime Ọnwa Anọ nke Afọ a

May 1, 2020 - 16:57
Jan 19, 2021 - 16:57
 0
Igbu na Ịtọrọ Mmadụ N'Ime Ọnwa Anọ nke Afọ a

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Onyeisi ndị Uweojii n'ala anyị, Alhaji Mohammed Adamu, ekwuola na mmadụ dị otu puku na iri asaa na otu abụrụla ndị tufuru ndụ ha site na mkpa mkpa ndị omekome kpara n'ọnwa anọ mbụ nke afọ puku abụọ na iri na iteghete.

O mere ka amata nke a n'ọgbakọ ndị isi omenala na mgbago ugwu ala mere na Tuzdee na Kaduna.

Adamu, n'okwu ya kwuru n'ọnụ ọgụgụ nke arụ ndị omekome kpara site na Jenụwarị were ruo Eprel, opekampe mmadụ narị isii na iri asatọ na ise bụ ndị a tọrọ n'ala anyị niile, ebe e gburu mmadụ iri asaa na iri isii na asaa site na mgbago ugwu ala anyị.

Ka ọ na-akọwa ihe ndị butere ọnwụ ndị a, Adamu kwuru na ọ bụ na ọdịda anyanwụ mgbago ugwu ka ndị mmadụ kacha nwụ ebe mmadụ dị narị anọ na iri atọ na isii bụ ndị nwụrụ na ógbè ahụ; n'etiti mgbago ugwu, mmadụ narị abụọ na iri ise nwụrụ; ebe na mgbada ugwu ala anyị ka narị otu na iri atọ nwụrụ n'oge a.

O tinyere na Steeti Zamfara bụzi ebe ndị a lara ndụ ndị mmadụ dị narị abụọ na atọ n'iyi; na Kaduna ka mmadụ otu narị na iri na abụọ nwụrụ, ebe mmadụ iri iteghete bụ ndị e gburu na Steeti Benue.

Dịka o kwuru, ọtụtụ n'ime ọnwụ ahụ dị na mgbago ugwu bụ site na mmekpa ahụ na ọgụ obodo na ibe ya na-alụ.

N'ebe o metụtara mmekpa ahụ, mmadụ otu narị na iri asaa na ise nwụrụ site na Jenụwarị were ruo Eprel nke afọ a ebe ọ bụ na Zamfara ka nke a kacha were mee site n'ọnwụ dị otu narị na anọ, Katsina Steeti na-eso ha site na mmadụ iri abụọ na otu ebe Steeti Sokoto bụ mmadụ iri na iteghete.

N'ebe ndị ntọrị mmadụ nọ, Onyeisi ndị Uweojii kwuru na mmadụ narị ise na iri anọ na isii ma ọ bụ pacenti iri asaa na iteghete n'ala anyị niile na mgbago ugwu ala anyị.

O kwuru na ebe a kacha kpaa arụ a bụ na ọdịda anyanwụ mgbago ugwu ebe mmadụ dị narị atọ na iri isii na ise bụ ndị a tọrọ n'oge a.

N'etiti mgbago ugwu, mmadụ dị otu narị na iri anọ na ise ka a tọrọ.

Ọ dị mkpa ka ekwuo na Steeti Zamfara bụ ebe a kacha were tọrọ mmadụ ebe mmadụ narị abụọ na iri asatọ na otu sit n'aka ọrụ ndị omekome na steeti ahụ.

Na steeti Kogi, a tọrọ mmadụ dị iri isii na ise ebe mmadụ dị iri ise na otu ka a tọrọ na Steeti Naija.

N'ebe ndị oji egbe ezu nọ, Adamu kwuru na ezuru ohi ugboro narị abụọ na iri na abụọ gburugburu ala anyị n'ime oge a a na-atụle.

Ọ gakwara n'ihu were kọwa na ohi ndị a bụ nke kachasị na mgbago ugwu site na ịdị otu narị na iri atọ ma ọ bụ pacenti dị iri ise na iteghete.

"N'etiti mgbago ugwu, izu ohi dị iri asatọ na otu ka ahụrụ ebe ọ bụ na ebe ahụ ka a kacha zuu ohi. Steeti Naija, Isi Obodo Alaanyị na Steeti Zamfara ka ohi ezuru ebe ahụ dị iri atọ na abụọ, iri abụọ na atọ na iri na asatọ dịka ha siri kwụrụ ma bụrụ zie ebe ndị ohi wuru ụlọ ha biri.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.