Ịgụ Akwụkwọ N'efu nke PTDF

Ịgụ Akwụkwọ N'efu nke PTDF

Apr 29, 2020 - 16:42
Jan 19, 2021 - 16:43
 0
Ịgụ Akwụkwọ N'efu nke PTDF

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria 

Mmadụ dị puku iri na iteghete, narị atọ na iri abụọ na atọ tinyere akwụkwọ maka ịgụ akwụkwọ n'efu na mba ofesi nke afọ puku abụọ na iri na iteghete na puku abụọ na iri abụọ nke ụlọọrụ PTDF na-achịkọba.

N'ọnwa Novemba afọ gara aga, PTDF kpọrọ òkù ka ụmụ Naijiria tozuru tinye akwụkwọ maka ịgụ akwụkwọ n'efu a nke ha na ndị mahadum dị na Britain, Germany na France ha na ụlọọrụ PTDF nwere ezi nkwekọrịta.

Oge itinye akwụkwọ bụ izu isii mere ka ụlọọrụ PTDF nweta akwụkwọ site n'aka mmadụ puku iri na iteghete, narị atọ na iri atọ.

Ụlọọrụ ahụ kwuru n'Abuja na mmadụ puku iri na ise, narị asatọ na iri abụọ na abụọ tinyere akwụkwọ maka ịgụ M. Sc., ebe mmadụ puku atọ, narị ise na otu tinyere akwụkwọ maka PhD na mba ofesi.

E kwuru na nwale nke ajụjụ ọnụ maka ndị a họpụtara n'otu abụọ ndị a ga-adị site n'ụbọchị iri abụọ na iteghete nke Eprel were ruo ụbọchị iri nke ọnwa Mee, afọ puku abụọ na iri na iteghete n'ebe ndị ahụ ewepụtagasịrị n'ala anyị.

Ihe gọọmenti etiti jiri were guzobe otu a bụ maka ọjụjụ ndị na-egwupụta mmanụ na mba ụwa jụrụ ịkụziri ụmụ Naijiria ihe ha ma gbasara otu na akarọngwa eji egwupụta mmanụ ọtụtụ afọ ka Naijiria chọpụtachara mmanụ.

Ebumnobi bụzi ka azụpụta ụmụ afọ Naijiria ga-ewere ọnọdụ odudu ma chịa isi n'ụlọ ọrụ a bụ nke ndị ọcha nọ n'isi ya, nke ga-eme ka ndị nọrọ n'ịhazi na idozi ụlọọrụ ahụ.

Nguzobe otu a n'afọ otu puku, narị iteghete na iri asaa na atọ, nke bidoro ọrụ n'uju n'afọ puku abụọ, bụ ụkwụ mbụ gọọmenti etiti zọpụrụ itinye ihe ndị ahụ ga-ebute mmepe ụlọọrụ mmanụ ala anyị.

Ịgụ akwụkwọ n'efu nke ụlọọrụ a nọrọ n'afọ gara aga zụọ ma wepụta ndị mara nke ekwe na-akụ n'ụlọ ọrụ mmanụ ala anyị.

Ụzọ ebe ndị a na-enye ndị a ọzụzụ gụnyere ịrụ ìgwè, igwu ihe, ọnọdụ okirikiri, nkà na ụzọ, ịchekwa, iwu, ịgụ ego, mgbasa ozi na ihe ndị ọzọ metụtara ụlọọrụ a.

Ụlọọrụ PTDF kwuziri na mmadụ puku anọ, narị iteghete na iri na isii bụ ndị rigoro erere ịgụ akwụkwọ n'efu a. Ha kwuru na mmadụ dị otu puku, narị anọ na iri anọ na iteghete bụ ndị gụrụ PhD, ebe mmadụ dị puku atọ, narị atọ na iri isii na asaa gụrụ M. Sc.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.