E Jidela Otu Onye Aka Ya Dị n'Ogbugbu Onyeisi Obodo Nimo

E Jidela Otu Onye Aka Ya Dị n'Ogbugbu Onyeisi Obodo Nimo

May 1, 2020 - 17:02
Jan 19, 2021 - 17:02
 0
E Jidela Otu Onye Aka Ya Dị n'Ogbugbu Onyeisi Obodo Nimo

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Dịka e kwuru sị na ihe ọ sọrọ nchì ya zogharịba n'ahịhịa, anya ga-ahụrịrị ya otu ụbọchị; aka ndị uwe ojii na steeti Anambra akpàrálá otu onye n'ime ndị ahụ a na-enyo ènyò na aka ya dị na mgbagbu ahụ a gbàgbùrù onyeisi ọchịchị obodo Nimo dị n'okpuru ọchịchị Njikọka, bụ maazị Frank Anthony Igboka.

Onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ maazị Mustapha Danduara mere ka a mara nke a n'isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii dị n'Amawbịa, oge ọ na-akpụgharị ya bụ nwa amadi, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ a nwụchikọrọ maka itinye aka n'arụrụala dị iche iche, dịka otu nzuzo, izu ohi na ịtọrọ mmadụ.

Nwata nwoke ahụ aha ya bụ Chigbo Aniegbu, onye a maara dịka "Transformer" gbàrà ahọ iri abụọ na asaa ma bụrụkwa onye e kwuru na o bụ onye Nimo, bụkwa obodo ya bụ nwa amadi e gburu egbu.

Dịka maazị Danduara siri kwuo, kemgbe ụbọchị ahụ e jiri gbuo maazị Igboka, bụ n'abalị iri na isii nke ọnwa Epure n'ahịa Oye Nimo, ndị uwe ojii steeti ahụ bagidere n'ịchụ nta ịnwụchikọọ ndị ahụ kpara ya bụ arụ, bụzị nke e siri na ya wee nwụchikọọ onye nke ahụ e jidegoro ugbua, o wee fọzie mmadụ atọ ndị ọzọ, bụ ndị e kwuru na ha nọ n'ọsọ ugbua. Mmadụ atọ ahụ ka ọ kpọpụtasịrị aha ha dịka: 'Smart'; Chukwunọnso (onye a maara dịka Nwa Samị), na Obinna Okafor, ma kwukwazie na, dịka aka na-achị steeti ahụ bụ gọvanọ Willie Obianọ siri kwuo, onye ga-agba àmà ga-enye aka n'ịnwụchikọ mmadụ atọ ahụ fọrọ afọ ka a ga-ebunye ogbe ego nde Naịra iri na ise (N15m), nke pụtara nde Naịra ise n'isi mmadụ ọbụla e jidere n'ime ha atọ.

Dịka ọ na-akọwapụta na ndị ọrụ uwe ojii na steeti ahụ nwụchikọrọ ndị ọzọ a na-enyo ènyò na ha bụ ndị ohi, ndị otu nzuzo, ndị ntọrọ mmadụ na ndị omekoome ndị ọzọ, nke ọnụ ọgụgụ ha dị narị abụọ na iri isii na anọ (264) naanị n'ime ọnwa Epùrè; maazị Danduara kpụgharịkwara ụfọdụ n'ime ndị ahụ bụ ndị a nwchikọrọ nso nso a, nke gụnyere maazị Ikechukwu Emelie, onye a na-enyo ènyò na ọ bụ ya tọọrọ ma gbuo (n'ahọ 2014) maazị Iloanyụsị bụ nna onye òtù egwu bọọlụ 'Super Eagle' n'oge mbụ bụ maazị Chikelụ Iloanyụsị. Ya bụ nwa amadi ka e kwukwara na o siri n'ụlọ elu nwere òkpùkpù atọ wee wụtuo, ma buru ịgà n'aka rie mbọmbọ n'ahọ 2014.

Ndị ọzọ gụnyere: Ugochukwu Nweke na Chijioke Okeh bụ ndị oji egbe ezú napụrụ ụkọchukwu Chukwunọnso Anọsike igwe omecha ncha, bụ lapụtọọpụ ya, na ọtụtụ ekwentị na Nnewi; Maazị Chidubem Umealụ gbara ahọ iri abụọ na asaa, ma bụrụkwa onye otu nzuzo ndị uwe ojii chọgharịbara kemgbe dịka onye a na-enyo na aka ya dị n'ụfọdụ ogbugbu e gbugoro ọtụtụ ndị mmadụ, site n'aka ndị otu nzuzo; tinyere ọtụtụ ndị btorobịa ndị ọzọ e jidere maka ihe dị iche iche.

Na nzaghachi, maazị Chigbo Anịegbu kwetara na ya sonyeere ndị ahụ gbagburu maazị Igboka n'ụgbọala, ma gọọ agụgọ na ya esoghị gbagbuo ya, n'ihi na ya amaghị na ọ bụ ihe ha na-aga eme, wee sònyere ha n'ụgbọala.

N'aka nke ya, Ikechukwu Emelie kwuru na ya bụ nwadibịa, ma kwuo na ọ bụghị ya tọọrọ ma ọ bụ gbagbuo maazị Iloanyụsị, kama na ọ bụ naanị ọgwụ ka ọ na-agwọrọ ndị mmadụ. O kwukwara na ọ bụ ụjọ maka igbu ya mere ya jiri si n'ụlọ elu ahụ wee wụpụ, ma were ọkpà zọọ onwe ya, n'ihi na ya ababeghị n'ogige ndị uwe ojii mbụ.

Ihe ndị e nwekọtara n'aka ndị ahụ e jidere gụnyere nsụnsụ egbe, ogologo egbe, mgbọ, mmà, anyike, ekwentị, igwe omecha ncha bụ lapụtọọpụ, akpa igbó, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.