Ihe Mberede Okporoụzọ: Ọbara na Ozu Mmadụ Ejupụtela n'Okporoụzọ Ihiala

Nov 29, 2021 - 22:25
Dec 1, 2021 - 22:21
 0
Ihe Mberede Okporoụzọ: Ọbara na Ozu Mmadụ Ejupụtela n'Okporoụzọ Ihiala

Izunna Okafor dere akụkọ a

Opekatampe, mmadụ anọ nwụrụ ọnwụ ike, ebe mmadụ ruru iri na abụọ n'ọnụọgụgụ nwetara mmerụahụ n'ogoogo dị icheiche n'ihe mberede okporoụzọ dapụtara nsonso a na steeti Anambra.

Ihe mberede okporoụzọ ahụ dị egwu bụ nke dapụtara n'akụkụ ogige ụlọọrụ ndị uweojii dị na mpaghara ụzọ awara awara ahụ siri Ihiala gaa Onitsha, n'okpuruọchịchị Ihiala nke steeti ahụ.

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka onyeisi ụlọọrụ 'Federal Road Safety Commission (FRSC)' ngalaba nke steeti Anambra, bụ Maazị Adeoye Irelewuyi siri kọwaa, ihe mberede okporoụzọ ahụ metụtara ụgbọala atọ, nke gụnyere bọọsụ Nissan caravan (nwere ákàrà AAH-836-ZV), bọọsụ Nissan caravan ọzọ (nwere akàrà AWK-278-YD) na nnukwu gwongworo (enweghị akara efere)

O mere ka a mara na ọ bụ ịgba oke ọsọ na ngharịpụ nke breeki nnukwu ụgbọala gwongworo (Mark Trailer) ahụ.

Dịka Maazị Irelewuyi siri kwuo, ndị ọnọmgbeomere kọwara na ọ onye na-anyà nnukwu gwongworo ahụ hụrụ ndị uweojii n'ihu ebe ha na-akwụsị ma na-enyocha ụgbọala ndị mmadụ, o wee chọọ ka ọ kwụsị ụgbọala ya n'ike ozigbo. Mana breeki ya gharịpụrụ ya, eleghịanya, ọ bụrụ maka na ọ nọ n'oke ọsọ, dịka ha siri kwuo. 

Nke a mezịrị na ya bụ gwongworo jiri ọsọ wee gbakwuru ụgbọala ndị ọzọ ahụ kwụ n'ihu ebe ndị uweojii kwụsịrị ha ma na-enyocha ha; gwongworo ahụ wee sigwosie ụgbọala abụọ ahụ na ndị ịọgasị n'ime ya.

Mmadụ anọ n'ime ndị nọ n'ụgbọala ahụ nwụrụ ozigbo ahụ ya bụ ihe mberede okporoụzọ mere, ebe ọtụtụ ndị ọzọ nwetekwara mmerụahụ n'ụdị dị icheiche. A dọnyekwara ozu ndị ahụ nwụrụ anwụ n'ime ụlọ nchekwa ozu dị n'ụlọọgwụ 'Our Lady of Lourdes Hospital, Ihiala', ebe ndị ọzọ nwetere mmerụahụ nọkwazị n'ụlọọgwụ ahụ anara ọgwụgwọ.

Maazị Irelewuyi kpekwazịrị ka mkpụrụobi ndị ahụ nwụrụ anwụ zuo ike na ndokwa, ma kpekwa ka ndị nwetara mmerụahụ gbakere n'oge adịghị anya.

Ndị ọrụ FRSC, ndị uweojii na ndị ọrụ agha nyèkwàzịrị aka wee bupùsie ihe ndị dịchisiri ụzọ, iji mee ka a ghara ime agbakata akwụrụ n'okporoụzọ.

Ka ọ dị taa, a mabeghị ma ọnụọgụgụ ndị nwụrụ ọgafeela etu ọ dị mbụ, n'ihi ụdị ọnọdụ mmerụahụ ụfọdụ ndị nwetara ihe mberede ahụ nọ na ya ụbọchị ahụ, ka ọ kà bụkwa naanị anọ.

Opekatampe, mmadụ anọ nwụrụ ọnwụ ike, ebe mmadụ ruru iri na abụọ n'ọnụọgụgụ nwetara mmerụahụ n'ogoogo dị icheiche n'ihe mberede okporoụzọ dapụtara nsonso a na steeti Anambra.

Ihe mberede okporoụzọ ahụ dị egwu bụ nke dapụtara n'akụkụ ogige ụlọọrụ ndị uweojii dị na mpaghara ụzọ awara awara ahụ siri Ihiala gaa Onitsha, n'okpuruọchịchị Ihiala nke steeti ahụ.

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka onyeisi ụlọọrụ 'Federal Road Safety Commission (FRSC)' ngalaba nke steeti Anambra, bụ Maazị Adeoye Irelewuyi siri kọwaa, ihe mberede okporoụzọ ahụ metụtara ụgbọala atọ, nke gụnyere bọọsụ Nissan caravan (nwere ákàrà AAH-836-ZV), bọọsụ Nissan caravan ọzọ (nwere akàrà AWK-278-YD) na nnukwu gwongworo (enweghị akara efere)

O mere ka a mara na ọ bụ ịgba oke ọsọ na ngharịpụ nke breeki nnukwu ụgbọala gwongworo (Mark Trailer) ahụ kpatara ya bụ ihe mberede okporoụzọ.

Dịka Maazị Irelewuyi siri kwuo, ndị ọnọmgbeomere kọwara na ọ onye na-anyà nnukwu gwongworo ahụ hụrụ ndị uweojii n'ihu ebe ha na-akwụsị ma na-enyocha ụgbọala ndị mmadụ, o wee chọọ ka ọ kwụsị ụgbọala ya n'ike ozigbo. Mana breeki ya gharịpụrụ ya, eleghịanya, ọ bụrụ maka na ọ nọ n'oke ọsọ, dịka ha siri kwuo. 

Nke a mezịrị na ya bụ gwongworo jiri ọsọ wee gbakwuru ụgbọala ndị ọzọ ahụ kwụ n'ihu ebe ndị uweojii kwụsịrị ha ma na-enyocha ha; gwongworo ahụ wee sigwosie ụgbọala abụọ ahụ na ndị ịọgasị n'ime ya.

Mmadụ anọ n'ime ndị nọ n'ụgbọala ahụ nwụrụ ozigbo ahụ ya bụ ihe mberede okporoụzọ mere, ebe ọtụtụ ndị ọzọ nwetekwara mmerụahụ n'ụdị dị icheiche. A dọnyekwara ozu ndị ahụ nwụrụ anwụ n'ụlọ nchekwa ozu dị n'ụlọọgwụ 'Our Lady of Lourdes Hospital, Ihiala', ebe ndị ọzọ nwetere mmerụahụ nọkwazị n'ụlọọgwụ ahụ anara ọgwụgwọ.

Maazị Irelewuyi kpekwazịrị ka mkpụrụobi ndị ahụ nwụrụ anwụ zuo ike na ndokwa, ma kpekwa ka ndị nwetara mmerụahụ gbakere n'oge adịghị anya.

Ndị ọrụ FRSC, ndị uweojii na ndị ọrụ agha nyèkwàzịrị aka wee bupùsie ihe ndị dịchisiri ụzọ, iji mee ka a ghara inwe agbakata akwụrụ n'okporoụzọ ahụ.

Ka ọ dị taa, a mabeghị mà ọnụọgụgụ ndị nwụrụ ọgafeela etu ọ dị mbụ, n'ihi ụdị ọnọdụ mmerụahụ ụfọdụ ndị nwetara ihe mberede ahụ nọ na ya ụbọchị ahụ, ka ọ kà bụkwa naanị anọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484