Bianca Ojukwu Adọọna Nnamdị Kanụ Na Ndi IPOB Aka Na Ntị
By Izunna Okafor, Awka, Nigeria
Onye nnọchite anya ala anyị na mba ofesi n‘oge gara aga ma bụrụkwa nwunye Dim Chukwuemeka Ọdụmegwu Ojukwu lagoro mmụọ, bụ oriakụ Bianca Ojukwu adọọna onye ndu ndi IPOB bụ maazị Nnamdị Kanụ na ndi otu ahụ aka na ntị banyere nhọpụta ọkwa ọchịchị a ga-eme na steeti Anambra.

Ya bụ agụ nwaanyị kwuputara nke a n'Awka ụbọchị Tọọzdee na mmemme iguzobe otu 'Akpọkuodike Fan Club' ma dụọ ndị otu ahụ hoohaa ka ha wepu aka n‘oku ahụ ha na-akpọ banyere ịghasa ya bụ nhọpụta a ga-eme n'onwa Nọvemba.
O kwuru ka onye ọbụla na-akpọ ụdị oku ahụ ma na-atụkwa ụdị atụmatụ ahụ buru ụzọ malite ya na steeti nke ya, na ọ bụghị na Anambra.
What's Your Reaction?