Osote Gọvanọ Anambra, Ibezim Adụọla Ndị Ụlọọọrụ Ya Ka Ha Dị Uchu N'ọrụ

Mar 25, 2022 - 22:26
 0
Osote Gọvanọ Anambra, Ibezim Adụọla Ndị Ụlọọọrụ Ya Ka Ha Dị Uchu N'ọrụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Nwa amadi ahụ e duru n'iyi ọrụ ọhụrụ dịka osote aka na-achị steeti Anambra, bụ Dọkịta Onyekachi Ibezim akpọkuola ma dụọ ndị ọrụ nọ n'okpuru ụlọọrụ ya ọdụ ka ha dị uchu n'ọrụ ha, iji nye aka hụ na ọchịchị ahụ nọ ugbua na steeti ahụ rụzùpụ̀tàrà ebumnobi ya nye ndị Anambra.

Dọkịta Ibezim kwupụtara nke a oge ya na ndịisi ngalaba ụlọọrụ dị icheiche dị n'okpuru ụlọọrụ ya ahụ nwere ọgbakọ n'obi gọọmenti dị n'Awka, bụ isi obodo steeti ahụ.

Ọ kọwara na ọchịchị ahụ nọ ugbua na steeti ahụ, nke Ọkammụta Chukwuma Soludo nọ n'isi ya, bụ ọchịchị bu ọdịmma ụmụ mmadụ n'obi, bụkwa nke batagoro n'ọkwa imemìlà ihe dị icheiche na-echere ụmụ mmadụ aka mgba n'ụdị ọbụla na steeti ahụ. N'ihi nke ahụ, ọ gwakwazịrị ha na a gaghị anabata ihe ọbụla bụ ịdà mbà n'ọrụ, maka na nke ahụ ga-abụ ịdọghachi aka elekere azụ n'imezupụta ezi ebumnobi ahụ ọchịchị ahụ jiri bata n'ọgbọ.

Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha na-abịa ọrụ n'oge ma na-arụsi ọrụ ike; ọbụladị dịka o kwèrè ha nkwà na a ga-enwe ezi mmekọrịta na ezi njikọaka n'etiti  ha na ya, iji mee ka ya bụ ọmarịcha ebumnobi pụta ihè.

Na nzaghachi ya n'aha ndị òtù ya, onye ji ọkwa odeakwụkwọ ọkpụtọrọkpụ n'ụlọọrụ Osote Gọvanọ, bụ Oriakụ Ifeyinwa Uzoka kèlèrè ya bụ osote gọvanọ maka ọmarịcha òhère mkparịtaụka ahụ, ma kwe nkwa na ha ga-aga n'ihu ịrụsi ọrụ ike karịa ka ha si arụ na mbụ, ọbụladị dịka o kwekwara nkwa na ha na ya ga-ejikọ aka ọnụ ma rụkọkwa ọrụ ọnụ karịa ka a tụrụ anya, maka na ọ na-abụ e jikọọ aka wee buo ozu enyi, ọ dị mfe.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484