Owerre -Ezukala Emee Emume Ọkụka-Oriri Ji Ọhụụ, Chie Obianọ Echichi

Sep 4, 2020 - 15:37
Jan 24, 2021 - 15:38
 0
Owerre -Ezukala Emee Emume Ọkụka-Oriri Ji Ọhụụ, Chie Obianọ Echichi

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Ịma mma nke ọnatarachi na omenala ndị Igbo pụtàrànnọọ ìhè ọzọ nso nso a, dịka ndị obodo Owerre-Ezukala dị n'okpuru ọchịchị Orumba South nas steeti Anambra merùbèrè emume Ọkụka-Oriri Ji Ọhụụ, bụ mmemme iri ji ọhụụ ya kpọmkwèm nke ahọ 2019.

Oke mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ogige Ishishi, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị ọrụ gọọmenti, ndị e ji okwu ha agba ìzù na steeti na imirikiti ụmụafọ obodo ahụ, ma ndị nọ n'ụlọ ma ndị nọ n'ụzọ ijè; a nọkwàrà na ya wee nyegasịa echichi dị iche iche nyegara ụfọdụ ndị obodo ahụ na ndị ọzọ mepụtagòrò ihe dara ụda na ngalaba dị iche iche.

N'okwu ya na mmemme ahụ, eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Thomas Ogbonnaya bunyere Chineke ụkpa ekele maka idebe ha ndụ ogologo ahọ ọrụ niile wee ruo oge owuwe ihe ubi, ma kwuo na mmemme iri ji ọhụụ kwèsiri ka a na-akwanyere ya ugwu nke ukwu ma na-eme ya ahọ ọbụla n'ihi na ọ bụ ụzọ pụrụ iche e si enye Chineke ekele maka ezi ọrụ ya n'ahọ. Ka ọ na-ekele ndị obodo ahụ maka otu ha siri jupùta n'igwè maka oke mmemme ahụ, o kpèrè ekpere ka Chineke gaa n'ihu ime ka ogologo ndụ, ahụike, ngozị na udo tọrọ àtọ gaa n'ihu ịdịnyere obodo ahụ na ụmụafọ ya niile n'ebe dị iche-iche ha nọ, na n'ihe ọbụla ha na-eme.

Ọ gakwàzịrị n'ihu kelee aka na-achị steeti Anambra, bụ gọvanọ Willie Obianọ maka ọtụtụ ihe ukwu dị iche iche ọchịchị ya meptagoro na ngalaba niile nke steeti ahụ, ọkachasị ezi agbam mbọ ya n'itute na ịkwàdò njirimara na omenal Igbo, bụ nke ọ sị na ọ bụ ihe niile ndị a mèrè ha jiri nye ya echichi ha nyèrè ya ụbọchị ahụ dịka 'Ọbata-Obie Nke Mbụ n'Owerre-Ezukala.'

N'okwu ya oge ọ na-anabata echichi ahụ, gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ onyeisi ọrụ oyibo na steeti ahụ, bụ Ọkaikpe Harry Ụdụ kelere ndị obodo ahụ maka echichi ahụ, bụ nke ọ kọwara dịka ihe mkpali mmụọ iji sị ya mere gaba, ma dụkwazie ha bụ ụmụafọ ka ha gaa n'ihu n'imesi omenala Igbo ike na ịkwàlite ya ka o weere ghara ịnwụ.

Na ntụnye nke ya, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwado Orumba South n'ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra, bụ Maazị Emmanuel Nwafọr kwuputara mkpa ọ dị na ndị ọbụla bụ ndị Igbo ga na-emesi omenala ha ike ma na-asụkwa asụsụ ha oge niile iji chekwaba ma nyefee ha n'aka ụmụ na-eto eto.

Ndị ọzọ e nyere onyinye nkwanye ùgwù na mmemme ahụ gụnyèrè onyeisi oche nchere oge n'okpuru ọchịchị Orumba South, bụ Maazị Raymond Onyegu; onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvaọ n'ihe gbasaara mmekọrịta obodo, bụ Maazị Ogechukwu Ndụche, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.