Mmemme Iri Ji Ọhụụ Dịka Omenala Igbo

Aug 15, 2020 - 06:49
Jan 24, 2021 - 06:51
 0
Mmemme Iri Ji Ọhụụ Dịka Omenala Igbo

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Iri ji ọhụụ abụghịzị okwu ọhụụ na ntị nwa ọbụla gbara ahọ n'ala Igbo. Ka ọ dị taa, ọtụtụ ndị na-enye ya nkwọwa dị iche-iche ma na-ahụtakwa ya dịka nke ma ọ bụ nke ọzọ.

Otu ọdị, Igbo sị na-abụ e gburìsie anụ enyi, o kwe obubu, maka na ọ bụrụ na ọkpụ aja akọwaghị ihe ọ kpụrụ, òfèkè nwere ike ịkpọ nwansu amụ dike; bụzị nke mere o jiri dị mkpa ịkọwa ihe Iri Ji Ọhụụ bụ n'ala Igbo, ọ kachasị dịka otu n'ime omenala e jiri mara ha.

Igbo sị na ihe suru, à gbaba ya, ọ bụghị egwu, ọ bụrụ ọsọ.

Iri ji ọhụụ bụ otu n'ime omenala dị iche iche e ji mara ndị Igbo n'ụwa gbaa gburu gburu. Ọ bụ mmemme omenahọ ma bụrụkwa nke ezi nwaafọ Igbo ọbụla na-esonyesi ike na ya.

Mmemme iri ji ọhụụ bụ oge e ji enye Chineke ekele n'ihi onyinye ji, ya na nchebe ya na ndụ o nyere anyị wee ruo n'oge owuwe ihe ubi maka na a kọọ, gwute, a sị na ahọ amagbuo onwe ya. Ọ bụkwa oge ndị Igbo ji akwanyere ji ugwu ruuru ya dịka eze nke ihe niile a kọrọ n'ubi, dịka akụkọ okike siri kọọ, bụkwa nke mere ka a mara na ọ bụ agbara bụ mmụọ nwe ji. Ọzọ bụ na mmemme iri ji ọhụụ bụ oge ndị Igbo ji ezu ike ma na-elekwa onwe ha ọrụ maka ọrụ ugbo ahọ ahụ.

N'obodo ala Igbo niile, ịkọ ọrụ ugbo bụ ihe ọtụtụ mmadụ jiri mere aka ọrụ; ọ bụghị naanị n'ihi nri ma ọ bụ ego si na ya apụta, kama n'ihi na ọ bụ ihe e jiri mara ndị Igbo, maka na ọ bụrụ na ịkpọ ngwèrè emeghị ihe o jiri bụrụ ịkpọ ngwèrè, ụmụaka ewere ya mee anụ ọkọchị na udummiri.

Mgbe ha kụnyesikwara mkpụrụ ọkụkụ dị iche iche dịka ji, ede, akpụ, ọka, ọnà, ụgụ, ọkwụrụ, ụgbọgụrụ na ihe ndị ọzọ n'ubi; ha na-atụ anya na ha ga-enweta nke karịrị nke ahụ n'ahọ ọzọ, maka na ala bụ ọ nara ọ zụọ.

Oge nke ahụ ruzịrị, ihe ndị a tochaa, ndị Igbo n'obodo ha dị iche iche na-akpọ oriri n'isi otu n'ime ha, nke bụ eze ha, tupu onye ọbụla n'obodo ahụ amalite ribe ya.

N'ụfọdụ obodo, dịka Enugwu-Ukwu nke dị n'okpuru ọchịchị Njikọka na steeti Anambra, ha na-ebu ụzọ mechaa otu omenala pụrụ iche a kpọrọ mmemme 'Ịkpọ Ji', bụ nke ha ga-emerịrị tupuu a malite ibubata ma ọ bụ ire ji n'ahịa obodo ahụ bụ nkwọ Enugwu-Ukwu. Ha mechazie nke ahụ, ha ewee mezie ṅmmemme iri ji ọhụụ kpọmkwem.

Ndị obodo ndị ọzọ nwegasịrị ihe dị iche iche ha na-akpọ ya n'obodo ha, bụ nke dabarà n'usoro ya bụ mmemme. Iji ma atụ, e nwere Ìhèjiọkụ, Imo Ọka (Awka), Afịọlụ Nnewi, Afịọlụ Nnobi, Ịwa ji, Njọkụ, Ịgba Ọfala, Ilo Mmụọ n'Ogidi, tinyere ndị ọzọ.

Tupuu ụbọchị a ga-eri ji ọhụụ kpọmkwem, a na-aga n'ọba, tọsịa ma wepùsie ji ochie niile dị n'ọba ji, iji wee nabata ji ọhụ na iji kwanyere ya ùgwù dịka onye ọhụụ ọ bụ, maka na oke ji na abàlà adịghị azọ ihu ọba.

Ụbọchị ahụ a na-eri ji ọhụụ kpọmkwem na-abụ nnọọ oge igosipụta ịma mma nke ọnatarachi dị iche iche ndị Igbo nwere nakwa ihe ngosi ndị ọzọ Chukwu jiri gọzie ha. A na-agba ụdị egwu ọdịnala dị iche iche, dịka uhie, nke ndi chie na-agba, egwu mmọnwụ, ekpo, ọgbamgbada, egwù agụ, tinyere ihe ndị ọzọ dị iche iche na-ekpozịkwa elu iji wee ndị mmadụ obi ụtọ, ọ kachasị site n'ịchụ ha ọsọ, ịgba egwu ha na ihe ndị ọzọ. Ụfọdụ na-agbakwazị mgba ka ha mebe nke ha, bụ oge ụmụ okorobịa ji esì ọkụkpụ, ka a mara onye ka eriju afọ ma ọ bụ onye akwa kara si ike n'ukwu, maka na ọ na-abụ dike zùte dike ibe ya n'ụzọ, a mara akanwụ na ụtaba, nke na-akpọlite uzere.

Oge ụfọdụ, onye kacha bụrụ okenye n'obodo na-anọ na mmemme iri ji ọhụụ wee kọọrọ ndị obodo ahụ ọtụtụ akụkọ miri emi dịgasị añaa gbasara obodo ahụ, dịka akụkọ ntọala ma ọ bụ akụkọ okike (history) nke obodo ahụ, ebe ha siri bịa, nakwa ọtụtụ akụkọ ọdịnala ndị ọzọ.

Nke kacha nke bụ na mmemme iri ji ọhụụ na-abụkwazị oge oriri na ọñụñụ pụrụ iche maka na erimeri na-abụ atụrụ taraba; onye ọbụla na-añụkwa ọgwụ afọ ma ghebe afọ ya oghe tupuu o si n'ụlọ ya pụtaba.

Nkwụ, nke gụnyere mmanya ngwọ, nkwụ elu, mmanya karama, ji a hụrụ ahụ ma were ụtazị mara abụba, ose, ụkpaka, ogiri na mmanụ na-amụ mịrị mịrị bụgbadonọọ ihe ndị na-eme ka mmemme ahụ zaa aha a kpọrọ ya.

Ihe ndị a niile bụ ihe na-eweta obi añụrị na obi ụtọ na ya bụ mmemme omenahọ, ka a ga-asị oge ya agwụna agwụ.

Ụfọdụ obodo na-eme mmemme iri ji ọhụ n'ọnwa nke asatọ, ebe ụfọdụ na-eme nke ha n'ọnwa nke iteghete, maka na ọ bụ mgbe onye jiri teta, ọ bụrụ ụtụtụ ya.

N'ọtụtụ obodo, ụfọdụ ndị aka ji akụ na ndị selitere isi n'obodo na-eme mmemme ịwa ji ma ọ bụ iri ji na be ha dị iche-iche, bụkwa nke ọ na-akpọkù ndị enyi ya na ndị ọzọ metụtara ya ka ha sonye na ya.

Mana tupu nke ahụ, obodo ga-ebugodi ụzọ richaa ji ọhụụ dịka obodo, maka na ọ bụ ọbagwò na-efé ọdụ, ọbụghị ọdụ na-efé ọbagwò. Otu ọ dị, ihe ndị a niile bụ ihe obi ụtọ na ihe oriri na ọñụñụ.

Na-agbanyeghị ihe ndị a niile, n'elu uwa ugbu a, ọtụtụ ndị mmadụ na-ahụtazị iri ji ọhụụ dịka ikpere arụsị, ebe ndị obodo ụfọdụ mechigoro ya kpamkpam n'ihi na ha na-ahụta ndị na-eme ya dịka ndị nọ n'isì.

Ọtụtụ ndị nne na nna adịghịzịkwa ekwe ka ụmụ ha sonye na mmemme iri ji ọhụụ n'obodo ha, ma ọ bụ rie ihe ọbụla e siri ebe ahụ, n'ihi na ha na-ahụta ya dịka ihe a gọọrọ arụsị, ma ọ bụ ihe ndị ngọ mmụọ. Ha wee chezọọ na nke ahụ so n'otu ụzọ pụtakarịchara ihe e si akwalite njirimara na omenala ndị Igbo, bụrụ oge ndị obodo ji anọkọ ọnụ dịka ụmụnne wee kpaa maka ọdịmma na uto nke obodo ha, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ ọ na-eweta.

Ihe kacha egbu njirimara na omenala ndị Igbo bụ ịgbakụta ha azụ site n'aka ụfọdụ ụmụafọ Igbo bụ ndị na-eche na ha hụrụ ụzọ ma ọ bụ na ha na-ahụzị Chineke anya kwa ụbọchị, na n'ihi ya, na ihe niile gbasaara ndị Igbo na omenala ha bụzị ihe ọchịchịrị, ihe nzuzu na ihe ndị ọgọ mmụọ. Nke ahụ wee bụrụ nnọọ echiche onye nzuzu sị na ya dara n'elu, na amụghị ya amụ. Ụkpala na-ere ọkụ ọ sị na ọ na-aha mmanụ. Ihe ndị bụ nke anyị wee na-efunahịzị anyị maka na anyị bụ ndị nwere ogiri amaghịzị uru ogiri bara n'ofe, dịka ofeke na-amaghị uru akpa agwụ baara eze dibịa.

Otu ọ dị, ide mmiri sị ndị na-akpara ala nna ya, ha jisie ike, na nsogbu adịghị, kama na mgbe nwanne ya nwaanyị bụ udummiri bàtàrà ebe ọ gara, o were aka ya kọwaa ebe oke dị.

Ndị be anyị, ka anyị chigharịanụ ghọta na nke anyị bụ nke anyị bụ nke, na ọ bụkwa ebe onye bi ka ọ na-awachi, wee kpọọ ihe anyị ihe. Ka anyị jisie ike n'ịkwalite na n'isonye n'omenala dị iche iche e jiri mara ndị Igbo maka na nkwụ daa n'ala, nwaanyị eñe ya uhie, rịa ya elu. A sịkwa na onye kpọọ ọba ya ọkpọkọrọ, agbataobi ewere ya kpoo ahịha, ma sịkwa na-abụ onye sọnyụọ ọkụ ya, ọ nọrọ n'isi.

Onye ọbụla tinye aka ma gbasie mbọ ike otu o nwèrè ike n'ụdị nke ya ịkwàlite iri ji ọhụụ n'ala Igbo, nakwa omenala ndị ọzọ e jiri mara Igbo.

Ọ bụkwanụ otu onye siri pna akụ ya ka ọ ga-esi debe ọnụ.

Tigbuo mmụọ, tigbuo mmadụ, udele ka ga-ejupùtakwa n'eluigwe.

Omenala Igbo ga-adịrịrị.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.