Nchịkọ Akụkọ: Oriakụ Obianọ Enyena Ndị Ụwa na-atụ n'ọnụ Karịrị Nrị Anọ Ihe Onyinye

Sep 30, 2017 - 22:36
Jan 22, 2021 - 22:17
 0
Nchịkọ Akụkọ: Oriakụ Obianọ Enyena Ndị Ụwa na-atụ n'ọnụ Karịrị Nrị Anọ Ihe Onyinye

Izunna Okafor, Awka

Nwunye aka na-achị steeti Anambra bụ oriakụ Eberechukwu Obianọ enyena mmadụ karịrị narị anọ n'ọnụ ọgụgụ, bụ ndị ụwa na-atụ n'ọnụ, ihe onyinye na enyemaka dị iche iche. Oriakụ Obianọ nyere ihe onyinye ndị a oge ọ gara mgbaru n'okpuru ọchịchị 'Anambra West' dịka otu n'ime ngagharị ya nke ọ malitere iji gazuo okpuru ọchịchị iri na otu e nwere na steeti ahụ.

Nwunye aka na-achị steeti Anambra bụ oriakụ Eberechukwu Obianọ enyena mmadụ karịrị narị anọ n'ọnụ ọgụgụ, bụ ndị ụwa na-atụ n'ọnụ, ihe onyinye na enyemaka dị iche iche.

Oriakụ Obianọ nyere ihe onyinye ndị a oge ọ gara mgbaru n'okpuru ọchịchị 'Anambra West' dịka otu n'ime ngagharị ya nke ọ malitere iji gazuo okpuru ọchịchị iri na otu e nwere na steeti ahụ. O kelere ha maka nkwado ha nyere ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ ma rịọkwazie ha ka ha ghara ikwe ka onye ọbụla duhie ma ọ bụ rafuo ha, ọ kachasị n'oge nhọpụta a na-akpụdobe nso na steeti ahụ.

Ọ dụzịkwara ndi nne ka ha na-gbasi mbọ ike iji bụrụ ndị na-akwụrụ onwe ha n'ihe ụfọdụ, na-abụghị ndị ba-adabere ma ọ bụ chekwube na di ha n'ihe ọbụla ha chọrọ iji ego ime.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.