Ọhaneze Ndị Igbo Akagbuona Mmemme Ụbọchị Ndị Igbo Na Bayeesa

Sep 30, 2017 - 22:34
Jan 22, 2021 - 22:19
 0
Ọhaneze Ndị Igbo Akagbuona Mmemme Ụbọchị Ndị Igbo Na Bayeesa

Izunna Okafor, Awka

Otu Ọhaneze Ndị Igbo enyena iwu ka a kagbuo mmemme ụbọchị ndị Igbo nke ahọ 2017 na steeti Bayeesa. Otu ahụ kọwapụtara mkpa ọ dị iji oge mmemme ahụ wee chee ala Naịjiria n'aka Chineke nna maka uto na ọganihu ya. Ndị otu ahụ kwuru na ihe kpataara nke ahụ bụ maka iru n'ihi ndị Igbo na ndị otu IPOB e gbusiri n'Aba nke steeti Abịa iji wee kwanyere ha ugwu Onyeisi otu ahụ na steeti Bayeesa bụ maazị Maurice Amakụ

Otu Ọhaneze Ndị Igbo enyena iwu ka a kagbuo mmemme ụbọchị ndị Igbo nke ahọ 2017 na steeti Bayeesa. Otu ahụ kọwapụtara mkpa ọ dị iji oge mmemme ahụ wee chee ala Naịjiria n'aka Chineke nna maka uto na ọganihu ya.

Ndị otu ahụ kwuru na ihe kpataara nke ahụ bụ maka iru n'ihi ndị Igbo na ndị otu IPOB e gbusiri n'Aba nke steeti Abịa iji wee kwanyere ha ugwu Onyeisi otu ahụ na steeti Bayeesa bụ maazị Maurice Amakụ mere ka ndị nta akụkọ mara nke a, ma sịkwa na ọ bụ ndị ndu Igbo na steeti ahụ kwekọrịtara banyere nke ahụ.

Ọ rịọzịrị ụmụafọ Igbo na steeti ahụ ka ha were oge ahụ wee kpee ekpere maka ala anyị Naịjiria na ala Igbo niile.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.