Ashbishọpụ Efobi Agwala Ndị Na-egwu Okwe Ndọrọ Ndọrọ Ka Ha Kwụsị Ikwe Nkwa Okwu Ụgha

Sep 30, 2017 - 22:38
Jan 22, 2021 - 22:11
 0
Ashbishọpụ Efobi Agwala Ndị Na-egwu Okwe Ndọrọ Ndọrọ Ka Ha Kwụsị Ikwe Nkwa Okwu Ụgha

Izunna Okafor, Awka

Achịbishọọpụ ụka Anglịkan na mpaghara Naịja, ma bụrụkwa Bishọọpụ ụka Anglịkan na Dịọsisi Agụata bụ 'Most Reverend' Christian Efobi, agwala ndị na-egwu okwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị ka ha bụrụ ndị na-ekwe nkwa ha ga-emezunwu emezu ma zeere ikwe nkwa okwu ụgha. Ashịbishọọpụ Efobi kpọrọ oku a n'okwuchukwu ya nke o kwuru nso nso a n'ụlọ ụka St. Paul nke dị n'Ọraeri n'okpuru ọchịchị Agụata na steeti Anambra, ma kpọkuokwa ndị nọ n'ọkwa ọchịchị ka ha kwụsị iji ụmụ mmadụ eti epele.

O kwuputara mkpa ọ dị na ndị nọgasị n'ọkwa ọchịchị dị iche iche kwesiri iji ohere ọma ahụ wee rụpụtagasịa ezi ọrụ ga-emetụta ọnọdụ na ọdịmma nke ụmụ mmadụ. Ọ kpọkuru ndị na-atụ akwụkwọ n'Anambra ka ha jigidesie mpempe akwụkwọ ikike ha bụ 'voter's card' nke ọma, ma ghara ikwe ka mmadụ ọbụla rafuo ha, n'ihi na ọ bụ ya ka ha pụrụ iji wee họpụta ezi ndị ndu nwere egwu Chineke.

N'ihe gbasaara mmemme icheta ọgbụgba ahọ iri ise na asaa nke ala Naịjiria, Ashịbishọọpụ Efobi kọwara ya bụ mmemme dịka oge ntụgharị uche banyere ihe na-emegasị n'ala Naịjiria, ma kpọkuo gọọmenti etiti ka ọ ga n'ihu kewapụtakwuo ohere ọrụ maka ụmụ ntorobịa ala anyị.

O kwuputanworo mkpa ọ dị bụ ịgbaso ụkpụrụ 'nwa mmadụ emegbuna nwa mmụọ ma nwa mmụọ emegbuna nwa mmadụ' a kpọrọ 'Federal Character' n'inyegasị ọrụ dị iche iche a na-enye n'ala anyị iji wee belata ịkpọ ganị ganị dị iche iche na-ewere ọnọdụ na bụ ala. Ọ kpọkuzịkwara ụmụafọ Naịjiria ka ha were oge mmemme icheta ọgbụgba ahọ iri ise na asaa nke ala Naịjiri wee kpee ekpere maka ya bụ mba na ịdị n'otu ya.

N'okwu nke ya, onye Ashịdikin nke Igboukwu Ashịdikinri, bụ 'Venerable' Innocent Udechukwu' kpọkuru ndị otu Kraịst ka ha jisie ike na-ahapụ ihe gara aga ma legidesie anya n'ọdịnihu ha, iji wee nwe ezi ọganihu na ndụ ha, maka na nkwenye ezi onye otu Kraịst bụ na ọdịnihu ga-aka mma.

A nọrọ n'ofufe nru ahụ wee kpee usoro ekpere pụrụ iche maka ala Naịjiria na nhọpụta ahụ na-abịa n'ihu na steeti Anambra iji hụ na ọ gara siriri werere na otu o kwesiri. Ndị e ji okwu ha agba izu bịara ya bụ ofufe nru gụnyere maazị Robịnson Ezeilo, bụ otu onye gagoro ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra n'oge gara aga, tinyere ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.