Òtù Nnọrọonwe Ebunyela Ụlọ Ahụike Mahadum COOU Akụrụngwa Ahụike

Oct 18, 2020 - 00:28
Jan 25, 2021 - 00:29
 0
Òtù Nnọrọonwe Ebunyela Ụlọ Ahụike Mahadum COOU Akụrụngwa Ahụike

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Òtù nnọrọonwe sitere mba ofesi nọrọ na nsonso a wee jiri akụrụngwa ahụike dị iche iche kwàdo ụlọ ahụike nkuzi mahadum Chukwuemeka Ọdụmegwu Ojukwu dị n'Awka, na steeti Anambra.

Akụrụngwa dị iche iche ndị òtù ahụ bunyere ụlọ ahụike mahadum ahụ gụnyere karama mmanụ nkwọchasị aka bụ sanịtaịza, karama bliichi (bleach), nkùkù a na-akwụba akwụba (standing fan), oche, tebulu, na ihe ndị ọzọ.

Oge ọ na-enyefè ihe ndị ahụ n'aka ụlọ ahụike mahadum ahụ, onye duru ndị òtù ahụ wee bịa njem ahụ, bụ Maazị Chibuzor Chibuoke kọwara na ha butere ihe ndị ahụ iji kwàdo ụlọ ahụike ahụ n'ọrụ ya inye ụmụ mmadụ ezi ọnọdụ ahụike bụ ịgbà. O mere ka a mara na ihe ndị ahụ ha butere ga-enyere ụlọọgwụ ahụ aka n'ilekọta ụdị ọrịa ntụmadụ na ọrịa mberede dị iche iche, dịka ọrịa nje korona na ọrịa obiri n'aja ọcha ma nyekwa ndị ọrụ ahụike ezi ọnọdụ nchekwa zuru òkè, gbochikwa ha ibute ajọ ọrịa na-efe èfè oge ha nọ n'ihu ọrụ.

O kelere ndị ọrụ ike nọ n'ụlọọgwụ ahụ maka ịdị uchu n'ọrụ nakwa etu ha si eji obi ọma na obi umeala arụ ọrụ ha nke ọma ilekọta ndị ọrịa, ọbụladị n'ime oge ọrịa nje korona na-ewù ma na-eyikwa ụwà egwù. Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha jisie ike n'ọrụ, ma kọwaa mkpà ọ dị na ha na-arụ ọrụ n'ezi ọnọdụ gburugburu bụ ịgbà, bụzị nke mere ha jiri bute akụrụngwa ahụ, iji kwàdo ha.

Na nzaghachi ya oge ọ na-anabata ihe ndị ahụ, onyeisi nlekọta ụlọ ahụike ahụ, bụ Dọkịta Basil Nwankwọ kelere òtù ahụ maka nkwàdo ahụ ha nyere, bụ nke ọ kọwara dịka nke bịara n'oge kwesiri ekwesi na mgbe a kachara chọọ ya. Ọ gara n'ihu mee ka a mara na ụlọọgwụ ahụ na-agawanye n'ihu, ma n'etu ọrụ ha si aga ma n'ihe ndị ọzọ a na-ahụ anya, site na nkwàdo pụrụ iche gọọmenti steeti ahụ na-enye ya na mgbe na mgbe. O kwezịrị nkwà na ya bụ ụlọọgwụ agaghị ada mbà n'ọrụ ha, ma mee ka a mara na ha ga-eji ihe ndị ahụ wee rụọ ọrụ nke ọma na etu o siri kwesi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.