Nchekwa Obodo: Obiano Na Ndịisi Ọrụ Nchekwa Enweela Ọgbakọ Pụrụ Iche

Apr 22, 2021 - 13:20
 0
Nchekwa Obodo: Obiano Na Ndịisi Ọrụ Nchekwa Enweela Ọgbakọ Pụrụ Iche
Izunna Okafor dere akụkọ a Ọ na-abụ onye rahụọ ụra, e buru egbe ya. Ọ na-abụkwa ihe mekarịa n'ọhammadụ, e nweere ya nzukọ n'ọhammụọ; maka na ọ na-adị mma egwu dágharịa, e hogharịa ụkwụ egwu. Ka ọ dị taa, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obino enweela ọgbakọ pụrụ ichè, ya na ndịisi ngalaba ọrụ nchekwa dị iche iche na steeti ahụ, iji tụọ arò ma chọpụta ụzọ kacha mma a pụrụ isi wee gbochie ma memilaa ajọ ọdachi enweghị nchekwa a na-ahụtazị na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ ugbua, n'ihi akaọrụ ndị omekoome. Ya bụ ọgbakọ bụ nke weere ọnọdụ n'Agụleri dị n'okpuru ọchịchị Anambra 'East', ma bụrụkwa nke ndị òtùọrụ ahụ na-ahụ maka nsogbu ịchị ehi na steeti ahụ, (bụ 'Cattle Menace Committee'), ndị udu obodo dị iche iche, ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti ahụ, bụ Maazị Uchenna Okafor, na ụfọdụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ sonyèrè na ya. N'okwu ya n'ebe ahụ, Gọvanọ Obianọ gbarụrụ ihu banyere etu ndị omekoome si agbasi mbọ ike ịwụnyere ọchịchị ya aja na garị n'ezi ebumnobi ya inye ụmụafọ steeti ahụ ezi ọnọdụ nchekwa bụ ịgbá. Dịka otu ụzọ isi weta ya bụ ajọ ọdachi na atụmatụ ndị ọrụ nchekwa n'isi njedobe, ya bụ Gọvanọ nọkwazịrị n'ebe ahụ nye onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP Monday Kuryas ntụziaka ka o dekọta ma weta aha, obodo, nakwa ihe ndekọta na njirimara ndị ọzọ dị mkpa banyere onye ọbụla bụ onye na-achị ehi na steeti ahụ tupu otu izuụka. Dịka ọ na-akọwa na nke ahụ ga-enye aka n'ụzọ pụrụ iche n'ịkwàlite nchekwa obodo, ya bụ Gọvanọ chètàkwààrà ndị Anambra na mmachi ahụ a machiri ịchịgharị ehi n'ebe ghe oghe nà okporoụzọ dị iche iche na steeti ahụ ka dịkwa ìrè, n'ihi na onye ọbụla e jidere ka ọ na-eme nke ahụ maọbụ ka ọ chịrị ehi ya wee bàá n'ugbo mmadụ, gà-eji anya ya wee hụ ntị ya n'ejighị ènyò. O mere ka a mara na ịmàchi ịchịgharị ehi n'abalị ga-esokwa nye aka, ma nye ndị òtù ahụ ntụziaka ka ha chọpụta ọnụego a na-ere otu ehi ugbua nà ọnụego a na-ere ihe ugbo na mkpụrụ akụkụ dị iche iche ugbua, n'ihi na ihe ndị ahụ ga-esokwa nye aka n'ibèlata ya bụ nsogbu ahụ na-adapụtakarị site n'aka ndị Fulani na-achị ehi. Dịka ụfọdụ ndị ọzọ dị iche iche sonyere na mmemme ahụ kwuchaara okwu ma tụọ arò na mmemme ahụ, a nọrọ ebe ahụ wee kwekọrịta ma kpebie ka ndị ọ gbasaara kwụọ ụgwọ dị iche iche ha kwesiri ịkwụ n'ihi nsogbu ndị ahụ dapụtara n'oge gara aga n'etiti ndị Fulani na-achị ehi nà ndị ọrụ ugbo n'ime obodo dị iche iche na steeti ahụ. E kwekọrịtara na ndị na-achị ehi ga-akwụ ndị ọrụ ugbo ego dị nde naịra iri abụọ maka ihe ubí ha mebisiri n'ugbo ha n'oge ahụ ya bụ nsogbu dapụtara na mgbe gara aga; ebe ndị ọrụ ugbo ga-akwụ ndị na-achị ehi ego dị nde naịra isii maka ehi ha gburu oge ahụ; ma a ga-akwụzịkwa nde naịra atọ dịka ihe iti aka n'obi maka ndị e gburu egbu n'ihe ọdachi ahụ dapụtara. Ihe ndị a niile bụkwazị nke a ga-akwụcha n'otu izuụka. E wezuga ihe gbasaara ndị na-achị ehi, a nọrọ n'ọgbakọ ahụ tinyekwa ọnụ n'okwu banyere ịtọrọ mmadụ, mwakpò, otu nzuzo, na ihe ndị ọzọ na-ewèta ajọ ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ, ma nọrọkwa ebe ahụ tụọ arò banyere usoro kacha mma a ga-esi memilaa ha nke taa, nke echi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484