Ndị Uweojii Egbochiela Mwakpo Ndị Omekoome n'Ukpo

Apr 23, 2021 - 17:30
 0
Ndị Uweojii Egbochiela Mwakpo Ndị Omekoome n'Ukpo

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụlaga sị na ọ bụrụ na ọ pịaghị ụtarị, ụmụaka anaghị ekwete na ọ bụ mmanwụ.

Ọ wee bụrụ etu ahụ ka ndị uweojii siri pịa ndị omekoome ụtarị mgbọ site n'igbochi ha ịwakpò isi ụlọọrụ uweojii mpaghara 'Zone 13' dị n'Ukpo, n'okpuru ọchịchị Dunukọfịa nke steeti Anambra.

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na mpaghara isi ụlọọrụ uweojii ahụ, bụ DSP Nwode Nkeiruka siri kọwaa, mwakpò ahụ bụ nke ndị ojiegbeezu mere n'ọnụ ụtụtụ ụbọchị Mọnde, ma bụrụkwazie nke mara afọ n'ala, n'ihi na ndị uweojii nọ na mpaghara ahụ mere ha 'onye ekwela ụzọ ga'.

O mere ka a mara na ndị omekoome ahụ bịara n'ụbá, wee na-agba égbè aghara aghara, iji chụsasịa ndị mmadụ, ka ha wee nwee ike ịbanye n'ime ogige ụlọọrụ ndị uweojii ahụ ga mee ihe ha jiri bịa. 

Kaosiladị, ndị uweojii nọ ebe ahụ kwèchììrì, wee jiri ịkwà mgbọ wee gbochie ha ịbata n'ime ụlọọrụ ahụ, maka na ọ na-abụ mmà megide ihe bàá ime ji, o mebìghị ya emebì, ọ waa ya awaa.

Oge ndị omekoome ahụ hụzịrị na ha enweghị ike ịbànyenwu n'ime ụlọọrụ ahụ n'ihi aka ọrụ ndị uweojii na ibu agha ha, ha sizịrị n'ezi wee tụọ ogbunigwè n'ebe a dọbara ụgbọala na gburugburu ime ogige ụlọọrụ ndị uweojii ahụ, bụzịkwa nke gbarikọrọ ụfọdụ ụgbọala n'ebe ahụ. 

DSP Nkeiruka mèkwara ka a mara na ndị uweojii mmadụ abụọ nwètàra mmerụahụ n'ihi mgbọ tụrụ ha oge ahụ ha na ndị omekoome ahụ na-akwàkọrịta mgbọ; mana ha nọzị n'ụlọọgwụ ugbua anara ọgwụgwọ. 

Ọ gakwara n'ihu kọwaa na ndị uweojii gbàgbùrù otu onye n'ime ndị omekoome ahụ oge ahụ ha na-akwà mgbọ, ebe ndị ọzọ bukwzịrị mmerụahụ nà àpà mgbọ wee rie mbọmbọ ọsọ.

Ihe dị iche iche ndị omekoome ahụ hapụrụ ebe ahụ wee gbaa ọsọ gụnyèrè ótù nnukwu égbè L7A2 a maara dịka 'General-Purpose Machine Gun (GPMG)', mgbọ egbe 7.62mm dị iri iteghete na abụọ, otu nsụnsụ égbè na anyike.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP Kuryas Monday, fsi, onye nọchitekwara anya onyeisi ndị uweojii na mpaghara ahụ kèlèrè ndị uweojii ahụ maka ịlụ ọgụ dịka nwoke, site n'igbochi ndị omekoome ahụ, wee mee ka ebumnobi ha na atụmatụ ha maa afọ n'ala.

Dịka ọ na-ekwe nkwà na ha ga-agbasi mbọ ike iji chọpụta ma nwụchikọọ ma kpụpụ ndị omekoome ahụ ụlọikpe, CP Monday nyekwazịrị ndị na-arụ n'ụlọọgwụ dị iche iche na steeti ahụ ndụmọdụ ka ha gharakwa inye onye ọbụla a na-enyo ènyò na o bù àpà mgbọ egbe ọgwụgwọ; kama ka ha mee ka ndị uweojii mara banyere nke ahụ. 

Ọ gwakwazịrị ụmụafọ steeti Anambra na ndị bi na steeti ahụ ka ha ghara ịtụ egwu ọbụla, kama ka ha jisie ike na-aga ọrụ na azụmahịa ha na ihe ndị ọzọ iwu kwàdòrò, ọbụladị dịka o kwere nkwà na ya na ndị ọrụ ya agaghị ada mba n'iwèta ezi ọnọdụ nchekwa bụ ịgba na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484