Otu Jikọtara Ndị Ọba Akwụkwọ Anambra Enweela Ọgbakọ Omenahọ

Dec 8, 2020 - 16:41
Jan 30, 2021 - 16:42
 0
Otu Jikọtara Ndị Ọba Akwụkwọ Anambra Enweela Ọgbakọ Omenahọ

Izunna Okafor

A kọwaala ọba akwụkwọ dịka ụlọọrụ dị mkpà n'ịkwàlite mmepe obodo, n'ihi ọrụ dị iche iche ọ na-arụ, dịka o siri metụta mmụta na mgbasaozi.

Ọkammụta Charles Obiorah Omekwu nke mahadum ala Nigeria dị na Nsukka bụ ya kwupụtàrà nke a na nnukwu ọgbakọ omenahọ nke otu jikọtara ndị ọrụ ọba akwụkwọ dị n'ala Nigeria, ngalaba nke steeti Anambra, bụ nke weere ọnọdụ n'ọba akwụkwọ Ọkammụta Kenneth Dike dị n'Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti Anambra.

Dịka o siri kwuo, ụwa na-emezị ntụgharị ugbua, ebe ihe niile na-agbanwèzịkwa agbanwè, bụ nke mezịrị o jiri dị mkpà ka a na-akwàlite ọba akwụkwọ, iji na-eto eto ma na-enyekwa ihe a chọrọ n'oge ọbụla.

Oge ọ na-enye nkuzi ya na mmemme ahụ, Ọkammụta Omekwu, onye bụkwa onye ọrụ ikpe ma nke ekwe na-akụ, mèrè ka a mara na obodo ọbụla enwéghị ọba akwụkwọ nọ ọdụ ka mmadụ enweghị mkpụrụ obi. O kwukwazịrị na ọ dị mkpà ka ndị ọrụ ọba akwụkwọ teta n'ụra ma tinye anya n'ime ihe gafèé ogigè ụlọọrụ ha, site n'imé ihe pụtara ìhè na gburugburu ha nakwà ịbà n'ime ime obodo dị iche iche, iji mee ka ndị mmadụ ghọta urù ọba kwụkwọ bara, ma sokwa rite urù n'ezi mmetụta ọba kwụkwọ nà ezi ọrụ dị iche iche ọ na-arụ.

N'okwu mmalite ya, onyeisioche mmemme ahụ, bụ Dọkịta Nelson Omenugha kọwàrà ya bụ nnukwu mmemme nà isiokwu ya dịka nke dabàrà adabà, ma e lekwakwàsị anya n'ọnọdụ ala Nigeria ugbua nà ọrụ chere ọba akwụkwọ n'ihu n'iwètà ezi mgbanwè na ọnọdụ mmepe a tụrụ anya.


Ọ kọwara na ọ bụ nchọcha na-akwàlite mmepe n'ụwà gbaa gburugburu ma mee ka a mara na a pụghị ime nchọcha ma ọ bụrụ na e nweghị ọba akwụkwọ n'ihi na ọ bụ n'ọba akwụkwọ ka a na-eme nchọcha, bụzị nke mere o jiri dị mkpá na gọọmenti, ndị mmadụ, ụlọọrụ na òtù dị iche iche ga-akwàdosi ọba akwụkwọ ike, ya na ihe niile ọ na-abàgide na ya.

Na mbụ n'ozi nnọọ ya, onyeisioche ndị otu NLA n'Anambra, ma bụrụkwa onyeisi ọba akwụkwọ Ọkammụta Kenneth Dike dị n'Ọka, bụ Dọkịta Nkechi Udeze kwùrù na mmemme ahụ bụ ọgbakọ na-enye ha òhèrè ịnọkọ ọnụ ma tụgharịkọta uchè n'ihe dị iche iche metụtara ha na ọrụ ha dịka ndị ọba akwụkwọ.

O mere ka a mara na e nwegasịrị ọtụtụ ọrụ na ọtụtụ ihe iche aka mgba na-echere ọba akwụkwọ, ma kpọzie òkù ka onye ọbụla ghọta mkpà ọba akwụkwọ dị ma tinye aka n'ịkwàdò na ịkwàlite ya iji merie ihe iche aka mgba ahụ ma rụzupụta ọrụ ndị ahụ chere ya n'ihu, iji kwalite ezi ọnọdụ mmepe n'ogoogo niile nke ụwa.

Na ntụnye nke ya oge ọ na-agbape mmemme ahụ n'aha aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, nnukwu onye enyemaka pụrụ ichè nyegárá Gọvanọ n'ihe gbasaara agụmakwụwkwọ sekọndịrị, bụ Dọkịta Paul Ifeanyi kọwarà ọba akwụkwọ dịka ihe bara oke urù na mmepe obodo, ma gbarụọ ihu banyere etu ndu si eleghara ngalaba mmụta anya ma na-eledàkwa ndị na-arụ na ngalaba ahụ anya.

O nyezịrị ndị ọrụ ọba akwụkwọ ndụmọdụ ka ha dị uchu n'ọrụ ma gbakwa mbọ tute omenala ịgụ akwụkwọ, bụ nke na-anwụzị anwụ ugbua, site n'ime ka ịgụ akwụkwọ na-amasị ma na-amịkwa ndị mmadụ akpịrị, ya site n'ime ka ndị mmadụ ghọta uru ịgụ akwụkwọ bara.

N'okwu ha n'otu n'otu, ụfọdụ ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ, nke gụnyere Ọkaiwu Ogugua Ochuba, Dọkịta Aniehobi Egbuna Sebastian, Dọkịta Olebunne, Dọkịta Ebele Anyaoku, Oriakụ Ngozi Perpetual Osuchukwu na Maazị Obiora Kingsley Udem kèlèrè ọba akwụkwọ dịgasị n'Anambra maka ọrụ mmepe dị iche iche ha na-arụpụta n'obodo, ma kpọkuo ha ka ha ghara ịdà mbà n'ime nke ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.