Umeadi Ejirila Mmemme Mgbede Kpọkọba Ndị Nkà Na Ndị Enyi Ya n'Agụkwu Nri

Nov 26, 2020 - 16:23
Jan 30, 2021 - 16:23
 0
Umeadi Ejirila Mmemme Mgbede Kpọkọba Ndị Nkà Na Ndị Enyi Ya n'Agụkwu Nri

Izunna Okafor

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka ndị ọkwa nkà, ndị odee, nakwa ndị na-eti egwu zùkọrọ na ngwùrù be onye otu ha bụ Ọkammụta Peter Umeadị na nsonso a, wee nwee ọnọdụ ụwa mgbèdè, ma jirikwa nkà ha mee onwe ha obi ụtọ.

Mmemme ụwa mgbede ahụ bụ nke a chịkọbara site n'aka Ọkammụta Peter Umeadị, bụ ọkaikpe steeti Anambra n'oge mbụ, ma bụrụkwa nke were ọnọdụ na be ya dị n'Agụ Ukwu Nri, n'okpuru ọchịchị ime obodo Anaọcha.

Mmemme ahụ bụ ke a kpọrọ "Imirikiti Ndị Nwere Uche Nkà: Mgbede Nnọkọ Peter Umeadị Na Ndị Enyí Ya" ("A Plethora of Creative Minds: An Evening with Peter Umeadi and Friends), ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba ìzù, ndị nwere uche nkà na ndị nwere ọnatarachi dị iche iche sitere steeti Anambra na mpụga ya.

N'okwu mmalite ya na mmemme ahụ, onyeisioche na ya bụ ọgbakọ, bụ Oriakụ Loretta Aniagolu kọwàrà nkà dịka ihe dị oke mkpà n'obodo, ma kọwaa ndị na-eme nkà dịka ndị nwere ihe ọ ga-ewe iji kwàlite ọganihu mmepe obodo ọbụla.

O kelere ya bụ nwa amadi chịkọbara ọgbakọ ahụ, bụ Ọkammụta Umeadị, ma kwuo na ya bụ ọgbakọ bụ nke magburu onwe ya, n'ihi na ọ bụghị naanị na o nyèrè ndị na-eme nkà ohere izukọ na ịnọkọkwa ọnụ ọzọ, kama na ọ nyèkwàrà ha òhèrè ime onwe ha obi ụtọ, rikọọ ma ñụkọọ ọnụ dịka ndị nwere ihe jikọtara ha ọnụ.  O kwukwazịrị na ya bụ ọgbakọ ga-enye aka ịkwalite nkà, ma mee ka ọ na-agawanye n'ihu. 

N'ozi nnọọ ya, onye chịkọbàrà ọnọdụ ahụ, bụ Ọkammụta Umeadị mèrè ka a mara na obi na-atọ ya ụtọ oge ọbụla ya na ndị hụrụ nkà n'anya, ndị na-ede akwụkwọ, nakwa ndị ọzọ nwere ọnatarachi ime ihe nkà dị iche iche nọkọrọ, bụzị nke mere o ji chịkọba ya bụ ọgbakọ. O kwere nkwà na ọ ga-aga n'ihụ isonye na ịkwàlite ihe ọbụla gbasaara nkà, ma kpọkuokwa onye ọbụla ka o jigidesie nkà ya ike.

Ọkammụta Umeadị mechààrà wee gụọ "Abiku" bụ abụ (poem) si n'aka onye edemede J.P. Clark lagoro mmụọ, ya na "Song of Sorrow" nke si n'aka Awoonor-Williams.

N'ihe ọgụgụ nke ya na mmemme ahụ, otu nwa amadi na-ewu èwù n'ihe gbasaara ịkwa nkà, bụ Ọkammụta Krydz Ikwuemesi kọwara etu a ga-esi tute uli na iji ya eme ihe n'ala Igbo, site n'iji ya na-arụpụtasị ihe dị iche iche, dịka uwe, okpu na ihe ndị ọzọ.


Ndị ọzọ gụrụ ihe ọgụgụ na mmemme ahụ, gụnyere odeakwụkwọ izugbe steeti Anambra n'oge mbụ, bụ Oseloka Obaze, onye gụrụ abụ ya ọ kpọrọ "Come Home" na "Land of Lost Glory"; Emma Okocha, onye gụrụ "Babatunde our Father has Returned" ma gụkwa ụfọdụ ebe n'akwụkwọ ya, bụ "The Last Dance in the Niger"; Norbert Eze, onye gụrụ abụ abụọ "Broken Dreams" na "Change"; Maxim Uzoato, onye gụrụ abụ ya "Because of Biafra"; Philip Coates, onye ọcha gụrụ abụ ya "We are all Humankinds" na "Unkwown Soldier".

Ndị ọzọ gụnyèrè: Eddy Chukwurah, onye gụrụ abụ si n'aka W.B. Yeats ọ kpọrọ "The Second Coming"; James Eze, onye gụrụ abụ atọ: "Girls on the Lions Mane", "Crosstoads", tínyéré "Ọzubulu" (bụ nke a gụpụtara site n'ọnụ Bob-Manuel Udokwu bụ onye na-eme ejije á mà àmá); Greg Mbajiorgu, onye gụkwara abụ atọ: "Rythms from #ENDSARS Movement", "Adventure in a Submarine" na "Littering All the Way"; Chubby Eneh, onye gụrụ abụ ya "Belụ Ọnwụ n'aka Anyị" na "Ka Anyị Nabazie"; Greg Odiakosa, onye gụrụ abụ ya abụọ: "After Sixty Years", "The Towering Giant from Nri Soars Higher"; Florence Orabueze, onye gụkwara abụ abụọ: "Okigbo Still Hears the Bang of the Mortar Shells” na “The Revenge of the Leftovers”, tinyéré Odili Ujubuonu, onye gụpụtara ụfọdụ ebe n'akwụkwọ ya ọ ka na-achọ ibipụta ebipụta bụ nke ọ kpọrọ "Crows on the Yellow Stream".

Otu nwa amadi na-ewu ewù n'iti egwu, bụ Bongos Ikwue nọkwara na mmemme ahụ wee jiri egwu ya, bụ "Mustapha and Christopher” na “Man and Man" wee huchatụọ ụmụ mmadụ aka n'ụbụrụ; ebe DJ Ugochukwu jikwara ụfọdụ egwu dị ụtọ wee kpọfèé ndị bịara mmemme ahụ.

A nọkwara na mmemme ahụ wee maa mbèm site n'aka Izunna Okafor, ma mekwa ihe ngosi nkenke ejìjé “Money Man’s Diary” nke si n'aka Akpos Adesi, bụ nke e mere site n'aka Chimaobi Okolo na Ugochukwu Ugwu, nke ọ bụkwa Ugochukwu Ugwu hàzìrì ya.

Ndị ọzọ dị iche iche sonyere na mmemme ahụ gụnyèrè Kọmishọna steeti Anambra na-ahụ maka mgbasaozi na ịkụziri ohaneze ihe ha kwesiri ịma, bụ Maazị C-Don Adinuba; ode akwụkwọ ukwu nyegara Gọvanọ Obianọ, bụ Maazị Willie Nwokoye; onye ome ejije na-ewu èwu, bụ Maazị Bob-Manuel Udokwu; Oriakụ Ify Aronu Okafor, nke ụlọ mgbasa ozi 'Anambra Broadcasting Service', tinyéré ọtụtụ ndị ọzọ selitere isi n'ihe gbasaara nkà, nà ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị iche iche.

Iji zaa aha a kpọrọ ya n'ezie, memme ahụ bụ nke a nọrọ na ya wee kụọ nkazị n'eze, táá, lóó, ma ñụsàá ụmụ ihe a haziri nke ọma, maka na ụwa mgbede bụ ya ka mma n'ezie, dịka ndị tiri egwu siri kọwaa.

Ọkammụta Umeadị mechaziere wee jiri abụ si n'aka Leigh Hunt bụ "Abou Ben Adhem" wee kpụchaa ọnụ, ma sịkwazie ndị bịara mmemme ahụ ladị mma, n'okpuru nkusa ume nke ọmarịcha egwu ụwa mgbede si n'aka DJ Ugochukwu wee na-asụpụta, bụkwa nke ndị mmadụ ji nwayọ na-ayọcharị ma na-edecharịkwa wee ruo mgbe ha gafèrè ọnụ ụzọ ama ngwùrù be Umeadị; o wee bụrụ ụla, maka na mmọnwụ ụlaga sị na ọ na-abụ ọ lachaa nke o jere eje, o wee nwekwa ike pụta echi, ma a kachie kpọkwa ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.