Anya Ndị NECO Ka Dị na Mmiri Maka Asambodo Adigboroja Ndị Ọrụ Ha

Dec 17, 2019 - 10:40
Jan 24, 2021 - 03:19
 0
Anya Ndị NECO Ka Dị na Mmiri Maka Asambodo Adigboroja Ndị Ọrụ Ha

Ibe Kelechukwu, Ibadan

Ụlọọrụ na-ahụ maka ule, NECO, site na otu kọmitii nhazi dị n'aka, ka tinyere anya ha na mmiri ugbua inyochapụta ndị ọrụ ji asambodo adigboroja arụ n'ụlọ ahụ. Onye isi NECO na-ahụ maka Mgbasa Ozi na Mmekọrịta Ọhaneze, Azeez Sani, kwupụtara nkea na mkparịta ụka ya na ndị nta akụkọ ụbọchị Sọndee, maka nchịkọta nnyocha ha mere nke ga-apụta ìhè nso nso a.

Anyị ga-echeta n'ụbọchị iri na ise nke ọnwa Nọvemba, ụlọọrụ ahụ chụrụ ndị ọrụ dị iri asaa maka asambodo adigboroja n'ọrụ.

Ndị isi ụlọọrụ NECO bụ ndị binyere aka n'ọchụchụ ahụ, dịka ha nwetachara ụsa sitere na kọmitii nhazi mere nnyocha maka asambodo na ha ji asambodo adigboroja were bata n'ọrụ ahụ.

Nkea ka ha mere site n'ịgba ndị ọrụ niile nkea metụtara ajụjụ ọnụ. Kọmitii ahụ gakwara n'ihu were degaara mahadum ndị ahụ siri nweta asambodo ahụ, iji were chọpụta ma ha agara ụlọ akwụkwọ ahụ n'ezie. Ọ bụ nkea chịpụtara ọtụtụ ndị ọrụ ahụ a chụrụla ụkwụ n'iru mere kporokpoto jiri were gbaa n'ihu ehi.

Onye okwu okwu ụlọọrụ ahụ gaziri n'ihu were kwuo na nnyocha ahụ ka na a ga-n'iru dịka ọ dị n'okwu ya, "Amụma nnyocha a ka na-aga n'ihu. Oge kọmitii ahụ ga-enye ụsa ha site na nchọpụta ha, a ga-eme ka nkea pụta ìhè dịka o si dị na agba nke mbụ. Amaghị m ihe na-eme ndị ọrụ iri asaa ahụ a chụrụ achụ mana e kwenyere m n'ọchụchụ ahụ bụ ezigbo ntaramahụhụ."

"N'ịga n'ihu, nchọpụta nke agba ndị ọzọ maka nnyocha ahụ ga-apụta ìhè mana agaghị m ekwu oge ọ ga-abụ."

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.